Nick Imudia: Ihe ị maghị maka nwamadị a nwebu ụlọọrụ Konga a sị gburu onwe ya

Nick Imudia bụbu onyeisi ụlọọrụ azụmaahịa n'ịntanetị bụ Konga

Ebe foto si, Nick Imudia/LinkedIn

Ndị uweojii Lagos Steeti ekwuola na ọ bụ eziokwu na Nick Imudia bụ onye oji ego achụntaego a ma ama anwụọla.

Nwamadị a bụ onye a ma ama site mgbe ọ bụ onyeisi ụlọorụ Konga Group, ụlọ azụmaahịa n’ịtanetị na Naịjirịa.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Lagos bụ Benjamin Hundeyin mere ka BBC mata nke a site n’ozi o ziteere n’ekwentị n’ụbọchị Tọzde kwuo “ọ bụ eziokwu, anyị nwetere ozi banyere ya.”

Ihe banyere etu o si nwụọ edochabeghi anya maka na ezinaụlọ ekwubeghi ihe ọbụla banyere ya, ebe ndị uweojii ekwughi etu o si nwụọ.

Mana akụkọ kwuru na nwamadị a nwụrụ site n’ihe mberede mere n’ụlọ ya dị na Lekki n’ụbọchị Tuzde 25 Juun, 2024.

Onye bụ Nick Imudia?

Nick Imudia nwụrụ n'ụlọ ya dị na Lekki, Legọs

Ebe foto si, NICK IMUDIA/LINKEDIN

N’ozi si n’akara LinkedIn ya, Nick Imudia kọwara onwe ya dịka “onye achụntaego na-agbasi mbọ ike n’inwete ọganihu n’azụmaahịa”.

Ọ gụrụ akwụkwọ na na ngalaba Injinịa, ihe banyere mmanụ agbidi na mmanụ gaasị, ma nweekwa ọzụzụ na nchịkọta azụmaahịa.

Ọ rụrụ ọrụ n’ụlọorụ Nokia afọ iri na asaa (17years) ma rigoo n’ọkwa Onyeisi na mpaghara West na Central Afrịka.

Imudia arụọla ọrụ dịka onyeisi TCL/Alcatel ụlọorụ na-arụpụta ekwentị na mpaghara West na Central Afrịka. Ọrụ o ji tupu ọnwụ ya bụ onyeisi ụlọọrụ D.light, ụlọọrụ na-ahụ maka mgbanwerịta ikike (energy).

Nick na ụmụnne ya gụnyere Martins na Anthony hiwere ụlọọrụ enyemaka n’aha nna ha nwụrụ n’afọ 2011. Ụlọọrụ a na-enyere ụmụ ogbenye aka n’obodo ya bụ Ika South dị na Delta Steeti n’okwu ahụike nakwa agụmaakwụkwọ.

Akụkọ kwuru na Nick Imudia nwere otu nwa nwaanyị bụ nke onye bụbu nwunye ya mụụrụ ya tupu ha agbasaa.

N’agbanyeghi na ozi banyere ihe gburu ya kpọmkwem apụtabeghi ihe mana ọnwụ ya ebutela ọtụtụ okwu banyere obi ịdamba nke na-egbukaarị ndị bara ụba.

Etu ị ga-esi chọọ enyemaka mgbe i nwere obi ịda mba

Ụlọorụ na-ahụ maka ahụike n’ụwa bụ World Health Organisation ekwuola na otu onye na-egbu onwe ya n’ụwa n’ime nkeji 40 ọbụla ebe mmadụ puku narị asatọ (800,000) na-egbu onwe ha n’ụwa kwa afọ.

Ọnụọgụgụ a buru ibu mana ọrịa obi ịda mba bụ ọrịa ọtụtụ mmadụ na-anaghị ekwusi okwu ike banyere ya. Ọ na-emetụta nwata, okenye, nne na nna, ndị enyi nakwa ndị ọrụ.

Ọrịa obi ịda mba na-emekaarị mgbe mmadụ na-edopụ onwe ya iche mana i nwereike iwepu uche ahụ ma ọ bụrụ na ịkọwaara mmadụ.

E nweghi ụzọ dị mma maọbụ dị njọ e si ekwu okwu banyere mmadụ ịkwụ ụdọ - dịka otu onye ọkachamara bụ Emma Carrington si kwuo.

O kwuru na ihe dị mkpa mmadụ ga-eme iji gbanahụ obi ịda mba bụ na onye ahụ bịa kọsara gị etu ọ dị ya, biko ṅaa ya ntị ma ghara ịta ya ụta maọbụ maa ya ikpe.

Nyocha e wepụtara na mba Afrịka n’afọ 2018 kwuru na n’ime otu onye ọbụla gburu onwe ya n’ihi ọrịa obi ịda mba, na ọ na-emetụta mmadụ karịrị otu narị ọzọ.