Etu aka si kpara nwoke ji nkwa ọlụlụ gwuo ụmụnwaanyị isii chamdum nnukwu ego

Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela nwoke ji nkwa alụmdinanwuye anapụ ụmụwanyi ego ha .

A nwuchiri Wisdom Mmaduka gbara afo 30 ụbọchị Satọde maka ebubo iji nkwa alụm di na nwanyi were zụo umunwaayi isii(6) ohi n’Imo steeti.

Ana- enyo Mmaduka maka ebubo na ọ napụrụ otu nwaanyi dabara n' aka ya ego ruru otu nde na ụma narị anọ(N1.4 m) .

Mmaduka nwere ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ bụ ndị o ji eme nne na nna ya na Mbaise, Imo steeti bụ ebe ọ na-akpọ ụmụnwwanyị aga nke mere ụmụnwaanyị ndị o kwere nkwa na-ekwenye na nkwa ya n'ezie.

Nwa amadi ahụ sara asịsa sị na nke ahụ bụ usoro o ji a napụta ụmụnwaanyị ọkpụrụkpụ ego.

Ọ na-akpọ ụmụwaanyi aga, na ụdị ị kpọro ha ruo ụlọ nna ya ma gosi ha 'nne na nna ya'.

Oge na-adighị anya, ihe ọzọ ọ ga-eme bụ ị napụ ha ATM Kaadị, were ego nile dị'akpaego ha n'ụlọakụ.

Ndị uweojii Imo steeti kwuru na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.

Mgbe BBC Igbo kpọrọ Ọnụ na-kwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye, ọ kwuru na akụkọ ahụ.

Okoye gbara ama na oge ndị uweojii nwụchirị nwa amadi ahụ na ụmụwanyị isii pụtara gbaa akaebe na ha danyere n' aka Mmadụka dịka o ji alụmdi napụha nnukwu ego.

Ndị uweojii napụtara ya otu ụgbọala 'Highlander SUV eboro na ọ napụrụ otu nwaanyi dabara na aka ya bụ Rose Mgbe,onye Krọs Rivas steeti.

Ha chọpụtakwara na Wisdom Mmaduka nwere nnukwu ụlọ ọ lụrụ na Naze Owere nke a siri na o ji ego o zutere n’ohi ruo.

Ọ gara n'ihu kwuo si,"A kpụpụla ya ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Owere dịka e jichiri ya n'ogige ndị uweojii."