Gọọmentị Etiti Naịjiria akwaala ASUU nku

Gọọmentị Etiti Naịjiria kwara otu jikọtara ndị nkuzi mahadum a kpọrọ Academic Staff Union of Universities (ASUU) nku n'ụbọchị Tuzde, Ọktoba 4, 2022.

Ha mere nke a site n'ihibe otu ọhụrụ abụọ ọzọ maka ndị nkuzi mahadum na Naịjiria.

Ha hibere otu a kpọrọ National Association of Medical and Dental Academics (NAMDA) na Congress of Nigerian University Academics (CONUA).

Dkt Chris Ngige bụ minista na-ahụ maka Ọrụ na Naịjiria, kọwara na otu abụọ dị iche n'Asuu, mana ha ga na-arụkwa otu ọrụ ahụ Asuu na-arụ.

O kwuru nke a dịka ọ na-enye otu abụọ a asambodo nhibe ha n'Abuja.

CONUA bụ otu ga-ejikọta ụfọdụ mahadum nke Gọọmentị Etiti, nke Niyi Sunmonu bụ onye nkuzi na mahadum Obafemi Awolowo University (OAU), Ile-Ife, Osun steeti, bụ onyeisi ya.

Nke a na-abịa dịka ndị Asuu gbara abụbụ ọrụ kemgbe ọnwa Febrụwarị afọ 2022.

Gọọmentị etiti nyere ndị isi ụlọakwụkwọ iwu ka ha mepee ụlọakwụkwọ malite akwụkwọ ozugbo ozugbo

Gọọmentị etiti esila n'aka ndị ụlọọrụ National University Commission (NUC) nye ndị isiụlọakwụkwọ Mahadum iwu ka ha mepee ụlọakwụkwọ ma malite akwụkwọ ozugbo ozugbo na-eleghị anya n'azụ.

N'akwụkwọ Sam Onazi bụ onyeisi ọrụ n'ahụ maka ego na NUC dere ọ sị, " gbaanụ mbọ hụ na e mepere ụlọakwụkwọ ozigbo ka ụlọakwụkwọ lọhachi azụ ka ọ dị mbụ".

Onazi dere ya bụ akwụkwọ n'aha odeakwụkwọ ukwu ụlọọrụ ahụ bụ Abubakar Rasheed.

Ọ bụ ndị isị ụlọakwụkwọ Mahadum bụ Vice Chancellors, ndị Pro-chancellors nakwa ndị isi ọgbakọ ndị isi ọrụ Mahadum ka ha nyere iwu a.

Nke a na-abịa dịka ndị nkuzi Mahadum nọ n'abụbụ ọrụ ọnwa asaa ugbua maka ajọ ọnọdụ ọrụ ha nakwa ajọ ọnọdụ ụlọakwakwụkwọ Mahadum.

N'izu gara aga ka ụlọikpe ndị ọrụ nyere iwu ka ndị nkuzi Mahadum malite ọrụ ozugbo, mana Academic Staff Union; ASUU gara ụlọikpe mkpegharị maka na ha ekweghị na ya bụ mkpebi.

N'ime ihe iri na anọ (14) ha jiri sị ka e kpegharịa ya bụ ikpe, Femi Falana bụ okaiwu ndị Academic Staff Union; ASUU sị na ya bụ ụlọikpe mkpegharị ha gara ga-ebi ya bụ iwu ụlọikpe ndị Industral Court nyere.

Mana ka ọ dị ugbua, gọomentị agaala n'ihu nye iwu ka ndị isi ụloakwụkwọ nye ndị nkuzi iwu ka ha malite ọrụ ozugbo ozugbo eleghị anya n'azụ.

Izuụka gara aga - Asuu gosiri ka obi dị ha na mkpebi ụlọikpe mere n'isi ha

Onyeisi otu Asuu bụ Emmanuel Osodeke gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV n'abalị Wenezde na ha enwebeghị ọnụ okwu maka mkpebi a ụlọikpe nyere ma kwuo na ruo mgbe ha na ndị okaiwu ha hụrụ mgbe ahụ ka ha ga-enwe asịsa.

Ọ gara n'ihu kwuo na etu ọ dị ugbua, na ọ dịzị ka gọọmentị etiti eji aka ike e so ha.

Ọ sị na nke ahụ nwereike ịme ka ya bụ okwu kawanye njọ.

Ọ jụrụ sị, "Kedụ ka ọ ga a dị gị ma onyeisi ụlọọrụ gị sị na ọ bụ iwu na ị ga-arụrịrị ọrụ a?"

Osodeke sị na nke a nwereike ịme ka ọtụtụ ndị nkuzi "Japa".

O kwukwara na ndị otu ha ka nwekwara ohere ị ga ụlọikpe mkpegharị maka na ya bụ okwu ebibeghị ebe a.

O kwuru na ụzọ kacha mma iji dozie ya bụ okwu bụ ụzọ ndị ụlọomeiwu nta Naịjirịa so.

Cheta na Asuu na ụlọomeiwu nta nwere ọgbakọ pụrụiche n'ụbọchị Tuzde bụ nke onyeisi ha bụ Femi Gbajabiamila kọwara ka "ihe gara nke ọme".

Gbajabiamila sị na ha ga-akpọ onyeisi ụlọọrụ ngụkọego bụ Auditor General ka ọ bịa kọwaara ha ihe ụfọdụ ga-enyere ha aka ịkpezi ya bụ ikpe.

Ọ sị na ha na Auditor General ga-ahụ ụbọchị Tọzde.

Ọ sị na ha ga-ebugazịrị onyeisiala Muhammadu Buharị ihe ọbụla ha kwutere mgbe ọ si nzụka United Nations ọ gara n'Amerịka lọta.

Ụlọikpe nke National Industrial Court nyere otu Academic Staff Union of Universities bụ (Asuu) iwu ka ha kwụsị abụbọ ọrụ ha na-agba malite ọrụ ngwa ngwa.

N'otu aka ahụ Onyeisi otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum (Asuu) na mahadum Chukwuemeka Ojukwu dị n'Anambra steeti bụ Okay Aniebo gwara BBC Igbo n’ụbọchị Wenezde bụ ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba 2022 na ha anụla ihe ụlọikpe ‘Industrial Court’ nke Abuja kwuru banyere nkwụsị abụbọ ọrụ otu Asuu na gburu gburu Naịjirịa niile.

Aniebo kwuru “Asịsa anyị n’okwu a ga-apụta ihe na nso nso, cherenụ ka anyị mee ọgbakọ ime ụlọ maka mkpebi a ụlọikpe mere”.

Cheta na Ọkaikpe Polycarp Hamman nọ n’isi ikpe a nke gọọmentị etiti Naịjirịa gbara Asuu gbara Asuu n’ụbọchị Wenezde bụ ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba ka ha gharazie ịgba abụbụọrụ ha ruo mgbe mkpebi ikpe a pụtara.

Ọkaikpe Polycarp sị na aga e bugara onyeisi ụlọikpe ‘Industrial court’ ahụ ka onye ọkaikpe ọzọ lebanye ikpe ahụ anya.

O gara n’ihi kwuo na mkpebi a ha mere ka Asuu kwụsị abụbụọrụ ha bụ maka ọdịmma ụmụakwụkwọ Najirịa.

Ma kwuo “Enweghi ihe a ga-eji kwụghachi ụmụakwụkwọ ndị a oge abụbụọrụ a napụrụla ha”.

Ọ gara n’ihu kwuo na abụbụọrụ a emeela ka ụmụakwụkwọ ndị gụcharala ghara inwe ikike fee ala nna ha ma ghara inwe ike nweta ọrụ ndị dịịrị ha.

Cheta na otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadaum Naịjirịa bụ Asuu malitere abụbụọrụ ha n’ụbọchị 14 nke ọnwa Febụwarị, 2022 maka okwu nọ n’etiti ha na gọọmentị Naịjriịa banyere ụgwọ ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ.

Ọtụtụ nrụrịtaụka pụtara n’etiti gọọmentị Naịjirịa na Asuu mana ọ mịtaghị mkpụrụ nke mere gọọmentị Naịjirịa jiri bupụ okwu ahụ ụlọikpe.

Ihe ndị ọzọ metụtarala abụbụọrụ Asuu

Ndị nkuzi jụrụ ịpụ n'abụbụọrụ Asuu

Akụkọ ọhụrụ pụtara n'okwu mahadum Imo steeti bụ Imo state University (Imsu), banyere ọpụpụ ha n'abụbụọrụ ndị otu Asuu na-agba kemgbe ọnwa asaa ugbua.

Akụkọ ọhụrụ a kwuru na ndị nkuzi mahadum ahụ jụrụ atụmatụ ịpụ n'abụbụọrụ Asuu dịka akụkọ sibu kwuo.

Cheta na n'ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Sepụtemba, ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ralph Obinjoku gwara onye ntaakụkọ anyị n’Imo steeti na ha sepụrụ aka n’abụbụọrụ ahụ maka ọdịmma ụmụakwụkwọ ha nakwa ndị ọrụ ya bụ ụlọakwụkwọ.

Onyeisi otu Asuu n'Imsu bụ Odinakachukwu Ejiogu gwarazịrị onye ntaakụkọ anyị n'Imo na ndị nkuzi Imsu ka sonyere n'abụbụọrụ a nke Asuu na-agba.

Ejiogu ji okwu saa ozi ahụ Obinjoku zipụtara nke sị ụmụakwụkwọ Imsu ka ha lọghachịte akwụkwọ n'ụbọchị Tuzde ma kwuo "agụmakwụkwọ ga-amalite n'Imsu n'ụbọchị Tuzde."

Ejiogu kọwara na ndị nkuzi Imsu na-erubere naanị otu Asuu nke Naijiria gburu gburu isi na ha anaghị e rubere ọchịchị ụlọakwụkwọ isi n'okwu banyere otu ha.

O kwusiri ike 'Ndị nkuzi anyị nọ n'Imsu ga-aga n'ihu na-esonye abụbụọrụ a.'

'Ndị otu anyị agaghị amalite ikuzi nkuzi n'ụlọakwụkwọ Imsu ruo mgbe ndị otu anyị nke Naịjirịa gbaa gburu gburu jiri kagbuo abụbụọrụ a.'

Ngagharịiwe ndị sonyerela abụbụọrụ Asuu

Okwu abụbụọrụ Asuu nakwa ekweghị ekwe dị n'etiti ha na gọọmentị Naịjirịa akpatala ọtụtụ ngagharịiwe, dịka otu dị icheiche na-akwunyere Asuu.

Lee ụfọdụ otu merela ngagharịwe n'ihi abụbụọrụ ndị Asuu:

Ngagharịiwe otu Nans: Otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ mahadum na Naịjirịa bụ National Association of Nigerian Students (Nans) malitere ngagharịiwe megide gọọmentị Naịjriịa maka abụbụọrụ nke Asuu na-agba kemgbe ọnwa asaa.

N'ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba, Nans kwuru na ga-aga n'ọdụ ụgbọelụ nke Abuja mee ngagharịiwe ma kwụchie ụzọ iji gosi iwe ha banyere abụbụọrụ Asuu mana nke a emeghị etu ha siri kwuo.

N'ụbọchị 20 Nans kwuru na ha agaghị ekwe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mee achụmnta vootu n'akụkụ Naịjirịa gbaa gburu gburu dịka nke a bụ etu ha ga-esi gosi ndị ọchịchị iwe ha.

N'ụbọchị Sepụtemba 19 Nans buuru ngagharịiwe ha gaa n'ọdọụgbọelu Legọs ma kwụchịe ụzọ nke metụtara ndị njem.

N'ụbọchị 15 nke ọnwa Sepụtemba, ha wụpụtara n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan iji mee ngagharị iwe.

Ọnụ na-ekwuru Nans bụ Giwa Yisa Temitope kwuru na nke a bụ "n'ihi na ike agwụla ma ụmụakwụkwọ ma ndị nne na nna maka abụbọ ọrụ ndị Asuu gbara".

Nke a metụtụra atụmatụ njem ọtụtụ mmadụ, mana ọnụ na-ekwuru Nans bụ Temitope kwuru na nke a bụ iji gwa gọọmentị Naịjirịa na ha anaghị eti mmanwụ a na-akwa aka.

Otu Nans mebụrụ ngagharịiwe nke ịdọ aka na ntị n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche n'ọnwa Julaị oge ọgbakọ ha na minista agụmakwụkwọ Naịjirịa bụ Adamu Adamu amịtaghị mkpụrụ.

Ngagharịiwe otu NLC: Otu jikọrọ ndị ọrụ niile na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress mere ngagharịiwe nke ha n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Julaị iji gosi nkwado nye ndị Asuu.

Gọomentị Naịjirịa dọrọ NLC aka na ntị ka ha ghara ịme ngagharịiwe ahụ maka ndị omekome iji ohere ahụ mebie ihe, mana ha gbara isi akwara ma mee ya.

Ya bụ ngagharịiwe mere n'akụkụ Naịjriịa niile.

Ihe ndị ọzọ dị mkpa maka abụbụọrụ Asuu

  • Asuu malitere abụbụ ọrụ ha kemgbe ọnwa Febụwarị 2022.
  • Ewezuga, okwu ụgwọ ọnwa na ọnọdụ ụlọ akwụkwọ mahadum Naịjirịa, ihe ọzọ na-esere Asuu na gọọmentị etiti bụ na Asuu achọghị iso usoro akwụmụgwo ọnwa nke gọomentị etiti bụ Integrated Personnel Payroll Information System, IPPIS.
  • Ọ bụ naanị ulọakwụkwọ mahadum nke gọọmenti etiti na ụfọdụ nke ndị steeti so na ya bụ abubụọrụ.
  • Gọọmentị etiti nwere mahadum 49 ebe steeti nwere 54, ndị mmadụ na otu ndị ọzọ nwee 109. A na-akọwa na ọ bụ maka oke abụbụọrụ ndị mahadum gọọmentị na-agbakarị na-akwanye ndị mmadụ ha ji abanye mahadum nke ndị nkịtị.
  • Na nkwekọrịta Gọọmentị etiti na Asuu nwere mgbe gara aga, gọọmentị kwetere ịtinye ọkpụrụkpụ ego kwa afọ ruo afọ ise maka iwulite ọnọdụ mahadum.
  • N'ụbọchị 19 nke ọnwa Julaị, onyeisiala Muhammadu Buhari nyere minista agụmakwụkwọ Naịjịrịa bụ Adamu Adamu na minista na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige iwu ka ha hụ na abụbụọrụ ahụ kwụsịrị n'izu abụọ mana nke a amịtaghị mkpụrụ ma ncha.
  • N'ihi na mkparịtaụka dị n'etiti Asuu na gọọmentị etiti ekweghị amịta mkpụrụ, gọọmentị etiti bupụrụ okwu ha ụlọikpe 'Industrial court' ka e kpezie ya ebe ahụ.
  • Ọtụtụ ndị omeiwu nwere agba na Naịjirịa nakwa ndị ji ọkwa a na-akpọ 'SAN' na Beekee, pụtara kwunyere Asuu n'ikpe a nke otu n'ime ha bụ ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa bụ Femi Falana.