ASUU Strike: Onyeisiala Buhari arịọla ndị ASUU ka ha kwụsị abụbụọrụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla ndị nkuzi Mahadum ka ha biko tụlee ahụhụ ụmụakwụkwọ na-ata ma kwụsị abụbụọrụ ha na-agba.

Ọ kpọrọ oku a n'ọgbakọ a kpọrọ 'National productivity day' nke ugboro iri na itoolu e mere na Tọzde.

Ọ rịọkwara ụmụakwụkwọ ka ha nwee ndidi na Gọomentị ga-eme ihe ya ruru leba anya na nsogbu ahụ nọ na mahadum.

Arịrịọ Buhari a na-abịa n'ime ụbọchị abụọ ndị ASUU gbatikwuru abụbụọrụ ha ma boo gọọmentị ebubo adịghị njikere ịkwụsị ya.

Otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ mahadum Naịjrịa amalitela ngagharịiwe maka abụbọ ọrụ Asuu

Otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ mahadum Naịjirịa bụ National Association of Nigerian Students (Nans) nke ndị Anambra steeti akwụchịela n'okporoụzọ Arroma Junction nke si Enugwu gawa Awka n'ụbọchị Tuzde maka abụbọ ọrụ otu ndị nkuzi mahadum Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu).

Cheta na otu a malitere ime ngagharịiwe a na gburugburu Naịjirịa niile nye Asuu dịka ha kwuru na abụbọ ọrụ ha na-agba kwa mgbe kwa mgbe na-emetụta ha nakwa agụmakwụkwọ ha nke ukwu.

Nke a na-abịa dịka Sunday Asefon du ndị otu ya ga hụ minista agụmakwụkwọ na Naịjirịa bụ Adamu Adamu n'isi ụlọọrụ ministri agụmakwụkwọ nke Abuja n'ụbọchị Mọnde ịrọ ya ka ha na ndị Asuu nwee nkwekọrita ngwangwa.

Minista ahụ ji iwe pụọ n'etiti ya bụ nzukọ dịka o kwuru naanị ihe ha kwuru chitara aja bụ na ụmụakwụkwọ ekwezighi etinye aka maọbụ ọnụ na okwu dịrị ha na Asuu.

N'ihe onyoonyo na-efeghari na soshal midia nke gosiri ka nzukọ ahụ si gaa, Asefon kwuru:

"Anyị hụrụ ebe ịno na-eto nwa gị gụchara akwụkwọ n'otu mahadum na nso nso, ọbụghị anyị niile ka aka ruru ịga mba ofesi gụọ akwụkwọm ya mere anyị ji arịọ ka okwu a nọ n'etiti unu na otu Asuu bịe na nso nso ka anyị lọghachị ụlọakwụkwọ anyị dị ịche ịche malite agụmakwụkwọ anyị".

O kwukwara "Ọ bụrụ na unu egeghi anyị ntị ngagharịiwe a nwere ike ịka nke End Sars emere n'afọ 2020"

Dịka Minista ahụ egeghi ha ntị, ndị otu a gbakọrọ n'ama egwuregwu nke Unity Fountain Abuja mee ngagharịiwe a n'ụbọchị Mọnde si ebe ahụ gaa n'ihu isi ụlọọrụ mịnịstri agụmakwụkwọ n'Abuja.

Onyeisi otu a na Naịjirịa niile bụ Sunday Asefon bụ onye duu ndị a pụta ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde.

Gịnị mere Asuu ji kpebie ịgba abụbụọrụ otu ọnwa?

Ndị nkuzi mahadum na Naịjrịa bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) kwuru n'ụbọchị ọnwa Febụwarị, 2022 na ha-agba abụbụọrụ otu ọnwa.

Nke a dị n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụtụtụ Mọnde ahụ mgbe ndịisi otu a mechara nzukọ bụ nke ha kwerikọtara ịgba abụbụọrụ.

N'ozi ha wepụtara n'akara Twitter ngalaba agụmaakwụkwọ a sị na ha mere ọ gbakọ a malite n'abalị Sọnde rute n'ụtụtụ Mọnde ahụ ma mee mkpebi ịgba ya bụ abụbọọrụ.

Kedụ ihe bụ iwe Asuu?

Ngalaba Academic Staff Union of Universities (Asuu) sị na abụbụọrụ a bụ iji dọọ gọọmentị aka na ntị ka ha nwee ike mezuo ihe ndị ha chọrọ nke gụnyere;

  • Ka gọọmentị kwụọ ha ụgwọ mgbakwụnye a kpọrọ 'Earned Academic Allowance'.
  • Ka gọọmentị tinyekwuo ego n'agụmaakwụkwọ.
  • Ka gọọmentị gbanwee usoro ịkwụ ha ụgwọ a kpọrọ 'Integrated Personnel Payroll Information System' (IPPIS) ka ọ bụrụzie 'University Transparency and Accountability System' (UTAS).

ASUU sị na abụbụọrụ a ga-aga n'ihu ruo mgbe a na-amabeghi ma ọ bụrụ na gọọmentị emeghi ihe banyere ihe ndị a ha chọrọ.

Cheta na ASUU na gọọmentị etiti nwere mkparịtaụka n'izuụka gara iji leba anya n'ihe ndị a mana ọ dị ka nke ahụ amịtabeghi mkpụrụ nke mere ASUU jiri malite abụbụọrụ a.

Kedụ ndị bụ ASUU?

ASUU bụ aha mkpiriisi otu Academic Staff Union of Universities bụ nke jikọtara ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa.

E hiwere otu a n'afọ 1978, mgbe ha gbanwere otu a kpọrọ 'Nigerian Association of University Teachers' bụ nke e hiwere n'afọ 1965.

Ọrụ ha bụ ikwulite okwu ka agụmaakwụkwọ mahadum Naịjirịa dị mma ma nwete oke ruru ha.

Otu a agbaala ọtụtụ abụbụọrụ nke malitere n'afọ 1988 mgbe ndị agha ka na-achị Naịjirịa ma rute ugbua ndị nktịtị na-achị.

Ụfọdụ ndị chịrị dịka ndịisi ngalaba a gụnyere; Oladipo Fashina, Attahiru Jega, Assisi Asobie,Festus Iyayi, Victor Emmanuel Osodeke dgz.