You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
ASUU: Ụmụakwụkwọ mahadum ga-ebido akwụkwọ echi
Akụkọ dị mkpa
Ugbua ka ha kwuputere ya site n'akara Twitter ha na abụbọ ọrụ ha bidoro kemgbe ụbọchị 5 n'ọnwa Nọvemba akwụsịla.
Nke a bịara dịka ASUU na gọọmentị etiti nwechara nzụkọ imeụlọ taa ma kwuo na akwụkwọ ga-ebido echi.
Ha kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị emezughi nkwa asatọ ha kwere n'ime nzụkọ ahụ, na ha ga-ebido abụbọrụ ha ọzọ.
Na ndọrọndọrọ,
Otu kpọrọ onwe ha 'Red Card Movement' agọrọla aka ha na ụkwụ o nweghi otu ndọrọndọrọ ha kwụnyere.
Nke a bịara dịka a na-anụ kepukepu na ha gbahapụla Oby Ezekwesili na-akwadozi Atiku Abubakar na ntuliaka na-abịa.
Nakwa,
Na mgbede ụbọchị Tọọzde ka otu na-achụso ọchịchị ziri ezi , BBC na mba Naịjirịa nakwa TVC gbakọrọ aka hiwe nrụrịtaụka ndị osote onyeisiala na Naịjirịa.
Ọ malite n'elekere asaa nke mgbede, ebe egosikwa ya n'elu igwe okwu BBC niile gụnyere Pidgin, Yoroba, Igbo na nke Awụsa.
Na mba ofesi,
Ọgbakọ mba ndị Yurop bụ EU n'aha ịchafụ ekwuola na ha ga-aga ihu n'ilebanye anya na ntuliaka Naịjirịa nke n'abịa.
Cheta na Gọvanọ Kaduna steeti Nasirel-Rufai kwuru na ndị mba ọzọ chọrọ ileba anya na ntulika Naịjirịa na-aga e ji akpa ozu bula ha.
N'egwuregwu,
Otu Super Eagles nke Naịjrịa ejirila ọnọdụ abụọ datuo n'ọkwa FIFA nakwa nke Afrịka n'ọnwa Jenụwarị.
Ugbua Naịjirịa nọzị n'ọkwa iri anọ n'isii n'ụwa niile nakwa ọkwa nke anọ n'Afrịka.
Akụkọ BBC Igbo na nkeji
Ndị agha Naịjirịa enwetela ụgbọelu ọhụrụ
Ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọelu na mba Brazil bụ Embraer ekwuola na ha ga-eresi ndị agha Naịjirịa ụgbọelu dị iri na abụọ ha ga-eji buso Boko Haram agha.
Embraer na ogbo ya bụ Sierra Nevada Corporation nke mba Amerịka enwela nkwekọrị ịhụ na ụgbọelu ndi a ruru Naịjirịa aka.
N'aka nke ọzọ onyeisi ndị agha ụgbọelu Naịjirịa bụ Sadigue Abubakar ekwuola na ha enwetala ụgbọelu dị iri abụọ na abụọ na nso nso a.
O kwuru na nke bulitere ọnụọgụgụ ụgbọelu ha site na pasentị iri isii n'afọ 2015 rue pasentị iri asatọ.
PDP akatọọla mgbanwe ndị Kọmishịọna uweojii
Pati PDP nakwa CNPP agbarụọla ihu na mgbanwe e mere n'ebe ndị kọmishịọna uweojii nke Steeti dị iche iche na Naịjirịa.
Ha kwuru na mgbanwe a mere na n'oge a na-egosi na pati APC nwere nkata ha na-akpa banyere ntuliaka na-abịa abịa.
N'ofesi
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na a ga-emeri ndi omekome Islamic State kpamkpam n'izuụka na-abịa.
Trump kwuru nke a na nzukọ mba ndị na-ebusokọ ndi omekatapụọ ụjọọ a agha mere.