Etu e si zọpụta nwa m a mụrụ ka afọ ime m dị izuụka 24 - Ogubuike

Aha onyonyo, Miracle Baby: Etu e si zọpụta nwa m a mụrụ n'afọ ime dị izuụka 24
Etu e si zọpụta nwa m a mụrụ ka afọ ime m dị izuụka 24 - Ogubuike

Ihe nwaanyị kwesịrị ibu afọ ime tupu ọ mụọ ya bụ izuụka iri atọ na asaa (37 weeks) ruo izuụka iri anọ (40 weeks).

Mana Chioma Ogubuike mụrụ nwa ya oge afọ ime ya dị naanị izuụka iri abụo na anọ (24 weeks), nke pụtara na nwa ahụ akabeghi aka chaa chaa tupu a mụpụta ya.

Ndị dọkịta kwuru na ya bụ nwa agaghị adị ndụ, mana dịka Pantaleon Ogubuike bụ nna nwata ahụ si kọọrọ BBC Igbo, nwa ya nwoke dị ndụ ugbua ma nwee ahụ ike.

Nwata ahụ mgbe a mụrụ ya
Nkọwa foto, Nwata ahụ oge e tinyere ya n'ime 'incubator'

Ogubuike kọrọ etu o si buru nwa ya kpagharịa ọtụtụ ụlọọgwụ n'Owere, Imo steeti, ihe ruru awa atọ tupu ọ hụ ụlọọgwụ nke nabatara ha ma malite inye nwa ya ọgwụgwọ.

Ụlọọgwụ ebe a nọ leta nwata a bụ 'Cradle and Mums Specialist Hospital' nke dị na mpaghara 'New Owerri'.

N'ezie, mbọ a gbara iji zọpụta nwata ahụ dịka mmadụ ịga gụta ọkụ na be ndị mmụọ, mana e mechara, zọta nwata ahụ ndụ.

Dọkịnta Chinwe Muomalu na ndị ọrụ ya gbara mbọ gbapụta nwata ahụ.
Nkọwa foto, Dọkịnta Chinwe Muomalu ndị ọrụ ya gbara mbọ gbapụta nwata ahụ.

Dọkịnta Chinwe Muomalu, onye nwe ụlọọgwụ ahụ, kwuru na Naịjirịa nwere nnukwu ọnụ ọgụgụ ụmụ nwaanyị na-amụ nwa na-akaghị aka.

Naịjirịa bụ mba nke abụọ ebe ụdị ihe a kacha eme. Mba nke mbụ bụ India.

Dkt Muomalu kọrọ ihe niile ha mere iji zọọ nwatakịrị ahụ ndụ; o kwukwara na akụrụngwa e ji eleta ụmụaka a mụrụ ọhụrụ abụghị ihe obere ego.

Ya mere o ji dị mkpa na gọọmentị ga-akpọ ya mkpa ma mee ka ụlọọgwụ niile nwee akụrụngwa ndị a.

Kirie akụkọ a na-awụ akpata oyi n'ihe onyonyo dị n'elu.

Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Vining Ogu.