Gịnị bụ nje 'chikungunya' a na-efe efe nke mmadụ 7,000 buterela na mba Chaịna?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Kelly Ng
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Singapore
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Ihe karịrị mmadụ 7000 ebutela nje ọhụrụ anwụnta na-ebunye a na-akpọ chikungunya na mba Chaịna kamgbe ọnwa Julaị.
Etu ọrịa a si agbasa mere e jiri bido ime ọtụtụ ihe e mere mgbe nje Covid-19 kpara mkpamkpa na mba Chaịna.
N'obodo Foshan bụ ebe nje ahụ kachasị efe ndị mmadụ ka e mere ka ọ bụrụ iwu na ndị niile butere nje ahụ ga-anọ n'ime ụlọọgwụ.
A na-eme ka ha nọrọ n'ụlọọgwụ ruo mgbe a ga-agwọta ha ma mee nyocha gosiri na ha enweghizi nje ahụ n'ahụ ha.
Ọtụtụ ndị e bugara ụlọọgwụ nọrọ ihe karịrị otu izuụka.
Nje ahụ na-agbasa mgbe ọbụla anwụnta tara mmadụ .
Nje ahụ na-eme onye butere ya ahụ ọkụ, ike ọgwụgwụ na ahụ nkuri bụ nke nwereike ịnọ ihe karịrị otu afọ n'ahụ onye bu ya.
Nje chikungunya bụ ihe ọhụrụ na mba Chaịna, mana ọ na-eme na mpaghara Afrịka nakwa ndịda ọwụwa anyanwụ Asia.
Kedụ etu nje a si agbasa na mba Chaịna?
E wepụ Foshan, mpaghara obodo ruru iri na abụọ na Saụt Guangdong enweela ndekọ ọtụtụ ndị mmadụ butere nje ahụ. Ihe ruru mmadụ 3000 bụ ihe butere nje ahụ n'otu izuụka.
N'ụbọchị Monde ka Hong Kong nwetere onye mbụ butere nje ahụ. Onye butere ya bụ nwoke dị afọ iri na abụọ. Nwa ahụ butere ya mgbe ọ gachara Foshan n'ọnwa Julaị.
Nje ahụ na-eme naanị mgbe anwụnta bu ya tara mmadụ.
Ndị ọchịchị kwuru na ndị niile butere ọrịa ahụ adịghị njọ nke ukwuu ma kwuo na pasenti 95% na ndị niiile butere ya si n'ụlọọgwụ pụọ n'ihe dịka abalị asaa.
Ọnụdụ a butere nnukwu ụjọ na Chaịna maka na ọ bụghị ihe ha ma maka ya.
Mba Amerịka agwala ndị na-aga Chaịna ka ha gbaa mbọ mee ka ha ghara ibute nje ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ihe ọzọ mba Chaịna na-eme ka nke a kwụsị?
Ndị ọchịchị na Guangdong ekwela nkwa ịkwụsị mgbasa nje ahụ na-agbasa.
Ọtụtụ ndị mba Chaịna na-enwe ahụ ọkụ mgbe awụnta bu nje ahụ tara ha. A na-agwa ha ka ha gaa n'ụlọọgwụ ngwangwa ka a chọpụta ma ha ebu nje ahụ ma ọ bụru na-ahụ ọkụ bido ha.
Gọọmenti enyela iwu ka e wepụ mmiri niile dọrọ adọrọ n'ebe niile na mba ahụ, ọkachasị n'ụlọ ha ma kwuo na ntaramaahụhụ ndị dara iwu ahụ ga-eru 10,000 yuan maọbụ ($1,400).
Chaịna na-atọhapụ anwụnta ndị nnukwu nwereike ịtagbu anwụnta ndị nke ahụ bu nje chikungunya.
Ha tọhapụkwara azụ na-eri anwụnta ruru 5,000 n'oke oshimiri dị na mba ahụ ma jiri droonu na-achọ ebe mmiri dọrọ adọ ma bụ ebe anwụnta bu chikunguya.
Steeti dị iche iche na-eme ka onye ọbụla si Foshan nọrọ n'ime ụlọ ihe dịka abalị iri na anọ iji nyochaa ma ha ebu nje ahụ.
Chaịna na-eme ihe niile ha nwereike ime ka nje ahụ kwụsị dịka e mere n'oge Covid19.
Gịnị bụ chikungunya?
Onye ọbụla awụnta tara na-eweta ọnọdụ ahụike na-adị ka nke chikungunya n'ihe dịka abalị atọ maọbụ asaa.
E wepụ ahụ ọkụ na ahụ nkụjisi, ọ na-abụpụta mmadụ ihe n'ahụ, na-eme ha isi ọwụwa nakwa ahụ mgbu.
Ndị ọ mere na-eweta onwe ha n'ihe dịka abalị asaa. Mana ahụ nkụjisi na-eme onye ahụ ruo ihe dịka out ọnwa mọabụ karịa.
Ndị nje a kachasị emetụta bụ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ, ndị okenye nakwa ndị nweburu ọnọdụ ahụike dịka ọrịa suga nakwa ọrịa obi.
Enwebeghị ihe ọgwụgwọ ya mana e webeghị onye nwụrụ maka ya.
A chọbụtara nje ahụ na mba Tanzania n'afọ 1952 tupuu ọ gbasaa n amba dị icheiceh.
Taata, e wetela ndị butere nje ahụ n amba ruru 110 n'ụwa niile.
Mana out World Health Organization (WHO) kwuru na naanị usoro ga-enyereaka kwụsị mgbasa nje ahụ bụ ime ka mmmiri hara ịdọrọ ebe ọbụla.









