Soludo amachighi ‘betting’, lee ihe merenụ - Gọọmentị Anambra

Akụkọ pụtara n’ụbọchị Fraịde na gọọmentị Anambra steeti amachiela ụlọọrụ chacha n’ụzọ ọbụla dịka ‘betting’, ‘gambling’, ‘casino’, na ndị ọzọ yiri ya.

Mana Christian Aburime bụ ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Chukwuma Soludo, gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ekwentị na ọbụghị mmachi ka gọọmentị machiri ndị na-agba chacha, ka ọ bụ nhazigharị ka ọ haziri usoro ọrụ ha n’Anambra steeti.

Ndí nke a metụtara bụ ụlọ oriri na nkwari nwekwara ebe a na-agba chacha, o metụtaghị ụlọọrụ 'betting'.

Aburime kwuru sị: “I lee anya ị ga-ahụ na ọtụtụ ụlọọrụ ebe a na-agba chacha na-eselite isi n’ebe dị icheiche, nke mere na ọtụtụ ndị ekperima jizi ya aghọgbu ụmụ mmadụ ma na-anapụ ha ego.”

“Ihe gọvanọ Soludo mere bụ itinye usoro iji jikwaa ụlọọrụ ndị a ka ndị adigboroja ghara ijizi ya ezu ohi, kama ka ọ bụrụ naanị ndị dị njikere ịzụ ahịa n’ụzọ ziri ezi nọ na ya.”

“Ndị niile nwere ụdị ụlọahịa ebe a na-agba chacha ga-edenye aha ha n’aka gọọmentị ka e wee mara ndị bụ ndị, ma na-elekọtakwa usoro ha si azụ ahịa ha.”

Aburime kwuru na gọọmentị ewepụtala ohere ka ndị niile nke a metụtara ga denye aha ha ma natakwa ikike.

Iji hazie ihe ndị a, Mịnịstrị na-ahụ maka ọdịnala, ịkpa obi ọma nakwa njem nlere anya (Ministry of Culture, Entertainment and Tourism) nyere iwu ka ụlọ oriri na nkwari niile na-eme egwuregwu casino, 'gaming' nakwa ụdị chacha ọbụla kwụsịgodu ime nke a ugbua ruo mgbe a hazichara usoro ọhụrụ maka ya.

Gọọmentị Anambra kpọkwara ọgbakọ maka ndị niile nwere ụlọ oriri na nkwari n'Anambra steeti, ebe a ga-akpa ihe banyere ego ha na-akwụ gọọmentị, imegharị ikike licence' ha nakwa okwu gbasara nchekwa.

Ọ bụ ngalaba ọdịnala, ịkpa obi ọma nakwa njem nlere anya, nakwa ụlọọrụ na-ahazi mkpata ego bụ 'Anambra State Internal Revenue Service jikọrọ aka na-ahazi atụmatụ a.

Ụdị ihe a ọ bụ ihe ọhụrụ?

Ihibe usoro maka iji chịkọta ịgba chacha abụghị ihe ọhụrụ.

Gọọmentị etiti nwere ngalaba a na-akpọ 'National Lottery Regulatory Commission', nke ọrụ ha bụ ịchịkọta nakwa ihazi ihe ọbụla yitere ịgba chacha maọbụ egwuregwu etinye okwe e rie okwe.

Ọ bụkwa ọrụ ngalaba a ịhụ na gọọmentị na-enweta ego o kwesịrị inweta site n'egwuregwu chacha dị icheiche.

Ọ bụrụ na ụlọọrụ chacha ọbụla chọọ ịghọgbu ndị obodo, ọ bụ ọrụ dịịrị ngalaba NLRC inwetara onye dị otu a ikpe nkwụmọtọ.