You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ọtụtụ ngwaahịa si laa n'iyi n'ọkụ gbara na Main Market Onitsha
Akụkọ si Ọnịcha apụta ugbua na-ekwu na ọkụ na-agba n'ahịa Otu Nkwọ Ọnịcha nke e ji 'Main Market' mara.
Mpaghara ebe na-agba ọkụ a dịka akụkọ anyị hụrụ na Twitter si kwuo bụ ebe a na-akpọ 'Front line' nke dị nso n'ụlọ a na-akpọ 'White House'.
Ya bụ ọkụ malitere n'isi ụtụtụ taa bụ Tuzde, ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị 2023.
'White House' bụ ụlọ ebe onyeisi ahịa 'Main market' nwere ụlọọrụ ya, ọ bụkwa n'ụlọ ahụ ka ndị nche ahịa ahụ nwere isi ụlọọrụ ha.
BBC Igbo kpọrọ onyeisi ụlọọrụ mgbanyụ ọkụ Anambra Steeti bụ Martin Agbili n'ekwentị mana ọ zaghị. Ọ sabeghịkwa ajụjụ anyị zigaara ya n'akara ekwentị ya.
Otu onye na-azụ ahịa na Main market kwuru na ya bụ ọkụ na-agba n'eziokwu.
O dobeghị anya ihe kpatara ọkụ a, mana BBC ezigala onye ntaakụkọ iji chọpụta ihe mere ebe ahụ kpọmkwem.
Dịka onye ahụ gwara BBC Igbo okwu si kwuo, ihe a na-ere na mpaghara ebe ahụ gbara ọkụ bụ akwa 'lace' na 'akwa george'.
"Ndị na-ere ihe e ji akwa akwa, a na-akpọ 'tailoring materials' na-anọkwa ebe ahụ, tinyekwara ụfọdụ na-ere ụdị akwa ndị ọzọ dịka 'jeans, polo' na ndị dịka ha. Ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'iyi n'ọkụ ahụ," ka nwa amadị ahụ kwuru.
Kedụ maka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ?
Otu onye gwara BBC okwu kwuru na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ abịaghị n'oge ịgbanyụ ọkụ ahụ.
O kwukwara na oge ha bịara, ọ bụ naanị otu ụgbọala mgbanyụ ọkụ ka ha bu bịa nke mere ndị mmadụ ji atamu ntamu.
Onye ahụ kwukwara na ọ bụ naanị otu ụlọ dị nso na White House ka ọkụ ahụ metụtara.
Na soshal midịa, ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ n'Asaba ka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ si bịa, mana BBC achọpụtabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu.
Onye a gwara BBC okwu kwuru na otu ụgbọala mgbanyụ ọkụ nke Anambra Steeti mechara bịa tinye aka iji gbanyụọ ya bụ ọkụ.
"Agbanyụọla ọkụ ahụ ugbua," nwa amadị a gwara anyị n'ebe elekere itoolu n'ọkwra nke ụtụtụ Tuzde.