Ọ fọrọ obere ihe ka mbuze rie ụlọ anyị n’Ogbor Hill Aba.
Ndi bi n'Ogbor Hill dị n’okpuruọchịchị Aba North nke Abia Steeti akpọkuola gọọmentị ka e nyere ha aka maka nsogbu mbuze ha na-enwe.
Mbuze ekewaala okporoụzọ jikọtara ebe dịka Arochukwu, Ovom, Aguwa, Pepples streets, Ahịa ọhụrụ, ebe a na-egbu anụ nakwa ọkpọrọụzọ e si aga ebe ndị ọzọ.

Onye ntaakụkọ anyị kwuru na mbuze a eriela ọtụtụ ụlọ a rụrụ na mpaghara ahụ ebe ọ ka ga-eri ọtụtụ ma ọ bụrụ na e lebaghị ya anya.
Ndị bi ebe ahụ kwuru na ọchịchị Onyeisiala Goodluck Jonathan nyere iwu ka a rụọ ụzọ ahụ mana ndị rụrụ ya emeghi ye nke ọma.
Na kamgbe ahụ onwebeghi ezi ihe e mere iji mezie ya bụ ụzọ ma gbochie mbuze ndị a.
Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Alex Otti bụ Uche Ukeje kwere ndị bi ebe ahụ ngwa na gọọmentị ga-eleba anya n’imezi ma gbochie mbuze a.
Ukeje kwere nkwa a mgbe ọ gara njem nleta na mpaghara Ogbor Hill ebe mbuze a mere.
Ogbor Hill dịka aha ya si dị bụ nọ na mpaghara ugwu dị n’Aba nke mere na mmiri zoo ọ ga na-achọ ụzọ ọ ga-esi asụpụ.
Dịka mmiri na-achọ isụpụ ọkachasị n’ebe e nweghi ezi ọwammiri, ọ na-ekpokọrọ aja ndị nọ n’akụkụ ụzọ malite zie igwu olulu nke na-ebuta mbuze.



