Foto na-egosi etu e si mee ngagharịiwe n'ụwa maka ogbunigwe a tụrụ n'ụlọọgwụ Gaza

    • Onye dere ya, By Andrew Webb
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service

Ngagharịiwe adapụtala n'ụfọdụ mpaghara ụwa maka ogbunigwe gbara n'ụlọọgwụ Gaza n'ụbọchị Tuzde bụ ndị gọọmentị Palestine kwuru na ọtụtụ narị mmadụ nwụrụ.

Otu onye dọkịta katọrọ nke a ma kpọọ ya 'igbu ọchụ' n'ụlọọgwụ Al-Ahli Arab ebe onye ọzọ kwuru na nke a bụ mbimbi.

Ndị ọrụ mba Palestine sị na ọ bụ mba Isreal tụrụ ogbunigwe ahụ.

Mana ndịagha mba Isreal kwuru na ọ bụ ogbunigwe ndị oyi ndụ egwu na Palestine tụrụ bụ nke dajọrọ - ndịagha nnupuisi a jụrụ ịnabata ebubo ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha mba Isreal bụ Daniel Hagari, kwusiri ike na ihe akaebe ahụrụ anya kwadoro nke a ma gosikwa ozi ekwentị nke ọ sị n'aka onye otu Hamas mgbe o kwetere na ogbunigwe ha si n'akụkọ ebe a na-eli ozu tụọ dajọrọ. O kwuru na ihe onyonyo gosiri na ọ bụghị Isreal tụrụ ogbunigwe ahụ.

E mechara, ọnụ na-ekwuru otu Hamasa n'ụwa gwara BBC: "anyị enweghi ikike maọbụ akụrụngwa iji tụọ ogbunigwe nnukwu a."

Lebanon: N'obodo Beirut

Ndị ndọrọ ndọrọ, ndịagha nakwa ọha a kpọro Hezbollah na Lebanon kporo oku ka e nwee "otu ụbọchị iwe" na Wenezde.

Ọtụtụ igwe mmadụ na-akpagharị n'okporoụzọ.

Ndị ọrụ nchekwa na ndị ngagharịiwe sọkatara isi n'ehihie ụbọchị Wenezde n'akụkọ ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka dị na Beirut.

Na mbụ ngagharịiwe malitere n'ihu ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka n'abalị Tuzde, Hezbollah katọrọ ihe ndị otu a kpọrọ :mwakpo ọjọọ Isreal mere" n'ụlọọgwụ dị na Gaza.

Jordan: Obodo Amman

Ngagharịiwe na-aga n'ihu na mba Jordan, ebe igwe mmadụ chọburu ịbanye n'ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka na mbụ.

A kagbuola njem Onyeisiala Biden nke mba Amerịka chọburu ime maka ogbunigwe a gbara n'ụlọọgwụ, mana o mechara mee njem ahụ.

Tunisia: Obodo Tunis

Ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara n'ihu ụlọọrụ nnọchiteanya mba France, ụfọdụ na-ebo France ebubo iso si mpaghara "West na-akwado Zionists".

Ndị ọzọ na-akpọ oku ka mba ndị Arab niile gbakọta ma nwee ofu nkwekọrịta.

Colombia: Obodo Bogota

Ndị mmadụ mekwara ngagharịiwe na mpaghara Latin Amerịka.

N'isi obodo mba Colombian bụ Bogota, ndị ngagharịiwe pụtara n'okporoụzọ.

Israel akwụsịla iziga ndị nchekwa na mba Colombia maka nsogbu dapụtara n'etiti ha n'ihi ozi onyeisiala ha wepụtara na soshal midia ebe ọ na-atụnyere mwakpo Isreala na-eme na Gaza ka nke ndị Nazi mba Germany.

West Bank: Ramallah

N'abalị Tuzde bọtara ụtụtụ Wenezde, ndị na-eme ngagharịiwe mụnyere ọkụ ma gbochie ụzọ na-ama ndị uweojii okwute n'obodo Ramallah dị na West Bank.

Ndị uweojii obodo nke Palestina gbochiri ndị ngagharịiwe.

West Bank: Obodo Nablus

Igwe mmadụ gbakọtara na Nablus.

Mmalite ngagharịiwe na West Bank gosiri iwe na ọnụma juru ndị mmadụ n'obi kamgbe n'ebe Onyeisiala mba Palestine bụ Mahmoud Abbas nọ, onye a katọrọla ndịagha na ha na ndịagha Isreal na-agbakọta aka ịhụ maka nchekwa na mpaghara ahụ.

Turkey: Obodo Istanbul

Ndị ngagharịiwe dapụtara n'igwe na mba Turkey.

Onyeisiala Tayyip Erdogan kpọrọ ogbunigwe gbara n'ụlọọgwụ Gaza "dịka ihe ịmaatụ mwakpo mba Isreal na-eme nke megidere ugwu ruuru mmadụ".

Ndị uweojii ji ose anya mmiri na egbe mmiri chụsaa ọtụtụ puku mmadụ na-eme ngagharịiwe chọrọ ịbanye n'ime ụlọọrụ Isreal dị n'Istanbul, mba Turkey.

A nwụchiri mmadụ ise dịka gọvanọ Istanbul si kwuo.

USA: Obodo Boston

Ọtụtu puku ndị ngagharịiwe gbakọtara n'ụlọ agụmaakwụkwọ dị na Boston iji gosi nkwado n'ebe ezinaụlọ ndị Palestine nọ ndị ihe metụtara na Gaza.

Ndị kwụsịrị n'ihu ụlọọrụ mba Isreal bụ ebe ndị nchekwa jupụtara na-eche nche, ebe na-agụ ma na-agba egwu.

Morocco: Obodo Rabat

Ọtụtụ narị ndị mmadụ mere ngagharịiwe n'isi obodo Morocco bụ Rabat.

Ndị a kpọrọ oku ka e mechie ụlọọrụ mba Isreal dị n'obodo ha.