Foto na-egosi etu e si mee ngagharịiwe n'ụwa maka ogbunigwe a tụrụ n'ụlọọgwụ Gaza

Nwafọ Lebanon ka o ji ọkọlọtọ mba Palestinian ka ọ nọ ọdụ n'elu isingwu mmadụ na Beirut

Ebe foto si, Reuters

    • Onye dere ya, By Andrew Webb
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service

Ngagharịiwe adapụtala n'ụfọdụ mpaghara ụwa maka ogbunigwe gbara n'ụlọọgwụ Gaza n'ụbọchị Tuzde bụ ndị gọọmentị Palestine kwuru na ọtụtụ narị mmadụ nwụrụ.

Otu onye dọkịta katọrọ nke a ma kpọọ ya 'igbu ọchụ' n'ụlọọgwụ Al-Ahli Arab ebe onye ọzọ kwuru na nke a bụ mbimbi.

Ndị ọrụ mba Palestine sị na ọ bụ mba Isreal tụrụ ogbunigwe ahụ.

Mana ndịagha mba Isreal kwuru na ọ bụ ogbunigwe ndị oyi ndụ egwu na Palestine tụrụ bụ nke dajọrọ - ndịagha nnupuisi a jụrụ ịnabata ebubo ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha mba Isreal bụ Daniel Hagari, kwusiri ike na ihe akaebe ahụrụ anya kwadoro nke a ma gosikwa ozi ekwentị nke ọ sị n'aka onye otu Hamas mgbe o kwetere na ogbunigwe ha si n'akụkọ ebe a na-eli ozu tụọ dajọrọ. O kwuru na ihe onyonyo gosiri na ọ bụghị Isreal tụrụ ogbunigwe ahụ.

E mechara, ọnụ na-ekwuru otu Hamasa n'ụwa gwara BBC: "anyị enweghi ikike maọbụ akụrụngwa iji tụọ ogbunigwe nnukwu a."

Lebanon: N'obodo Beirut

Igwe mmadụ na-efe ọkọlọtọ na Lebanon

Ebe foto si, Reuters

Ndị ndọrọ ndọrọ, ndịagha nakwa ọha a kpọro Hezbollah na Lebanon kporo oku ka e nwee "otu ụbọchị iwe" na Wenezde.

Ọtụtụ igwe mmadụ na-akpagharị n'okporoụzọ.

Anwụrụọkụ anya mmiri na-ekoju n'ụlọọrụ mba Amerịka dị n'akụkụ Beirut nke Lebanon dịka ndị ngagharịiwe na-ama okwute na ihe ndị ọzọ na Wenezde 18 Ọktoba 2023

Ebe foto si, AFP

Ndị ọrụ nchekwa na ndị ngagharịiwe sọkatara isi n'ehihie ụbọchị Wenezde n'akụkọ ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka dị na Beirut.

Ndị mmadụ kwụ n'ihu ọkụ na-agba n'ezi n'ụlọorụ ndị ọrụ nchekwa n'oge ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị ọrụ nchekwa na ndị ngagharịiwe n'ihu ụlọọrụ mba Amerịka dị na Beirut, Lebanon na 18 Ọktoba 2023

Ebe foto si, EPA

Na mbụ ngagharịiwe malitere n'ihu ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka n'abalị Tuzde, Hezbollah katọrọ ihe ndị otu a kpọrọ :mwakpo ọjọọ Isreal mere" n'ụlọọgwụ dị na Gaza.

Jordan: Obodo Amman

Igwe mmadụ na-efe ọkọlọtọ mba Palestine

Ebe foto si, Reuters

Ngagharịiwe na-aga n'ihu na mba Jordan, ebe igwe mmadụ chọburu ịbanye n'ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka na mbụ.

A kagbuola njem Onyeisiala Biden nke mba Amerịka chọburu ime maka ogbunigwe a gbara n'ụlọọgwụ, mana o mechara mee njem ahụ.

Tunisia: Obodo Tunis

Ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara n'akụkụ ụlọọrụ nnọchiteanya mba France ka ha ji ihe ngosi nakwa ọkọlọtọ mba Lebanon fụchie onwe ha.

Ebe foto si, Reuters

Ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara n'ihu ụlọọrụ nnọchiteanya mba France, ụfọdụ na-ebo France ebubo iso si mpaghara "West na-akwado Zionists".

Ndị ọzọ na-akpọ oku ka mba ndị Arab niile gbakọta ma nwee ofu nkwekọrịta.

Colombia: Obodo Bogota

Otu nwaanyị ji ọkọlọtọ mba Palestine nọro n'etiti ndị ngagharịiwe na Bogota, Colombia

Ebe foto si, EPA

Ndị mmadụ mekwara ngagharịiwe na mpaghara Latin Amerịka.

N'isi obodo mba Colombian bụ Bogota, ndị ngagharịiwe pụtara n'okporoụzọ.

Israel akwụsịla iziga ndị nchekwa na mba Colombia maka nsogbu dapụtara n'etiti ha n'ihi ozi onyeisiala ha wepụtara na soshal midia ebe ọ na-atụnyere mwakpo Isreala na-eme na Gaza ka nke ndị Nazi mba Germany.

West Bank: Ramallah

Ndị ngagharịiwe kpuruchiri ihu ha, jiri ogwute ma nọrọ n'ihu ihe mgbochi nakwa ọkụ

Ebe foto si, Getty Images

N'abalị Tuzde bọtara ụtụtụ Wenezde, ndị na-eme ngagharịiwe mụnyere ọkụ ma gbochie ụzọ na-ama ndị uweojii okwute n'obodo Ramallah dị na West Bank.

Otu nwoke na-agafe n'ihu ọkụ a mụnyere n'okporoụzọ dị na Ramallah

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii obodo nke Palestina gbochiri ndị ngagharịiwe.

Aha onyonyo, Watch: Ndị ngagharịiwe na ndị ọrụ nchekwa sọkatara isi na Ramallah

West Bank: Obodo Nablus

Ndị ngagharịiwe na-efe ọkọlọtọ na Nablus

Ebe foto si, EPA

Igwe mmadụ gbakọtara na Nablus.

Mmalite ngagharịiwe na West Bank gosiri iwe na ọnụma juru ndị mmadụ n'obi kamgbe n'ebe Onyeisiala mba Palestine bụ Mahmoud Abbas nọ, onye a katọrọla ndịagha na ha na ndịagha Isreal na-agbakọta aka ịhụ maka nchekwa na mpaghara ahụ.

Turkey: Obodo Istanbul

Ndi ngagharịiwe weliri mkpịsị aka ha elu

Ebe foto si, EPA

Ndị ngagharịiwe dapụtara n'igwe na mba Turkey.

Onyeisiala Tayyip Erdogan kpọrọ ogbunigwe gbara n'ụlọọgwụ Gaza "dịka ihe ịmaatụ mwakpo mba Isreal na-eme nke megidere ugwu ruuru mmadụ".

Ndị ngagharịiwe gbanahụrụ anwụrụọkụ oseanya mmiri n'ihu ụlọọrụ mba Isreal dị n'Istanbul

Ebe foto si, EPA

Ndị uweojii ji ose anya mmiri na egbe mmiri chụsaa ọtụtụ puku mmadụ na-eme ngagharịiwe chọrọ ịbanye n'ime ụlọọrụ Isreal dị n'Istanbul, mba Turkey.

A nwụchiri mmadụ ise dịka gọvanọ Istanbul si kwuo.

USA: Obodo Boston

Otu nwaanyị bere akwa ka ọ na-ege okwu a na-ekwu n'obodo Boston mba Amerịka

Ebe foto si, Reuters

Ọtụtu puku ndị ngagharịiwe gbakọtara n'ụlọ agụmaakwụkwọ dị na Boston iji gosi nkwado n'ebe ezinaụlọ ndị Palestine nọ ndị ihe metụtara na Gaza.

Ndị kwụsịrị n'ihu ụlọọrụ mba Isreal bụ ebe ndị nchekwa jupụtara na-eche nche, ebe na-agụ ma na-agba egwu.

Morocco: Obodo Rabat

Otu nwaanyị na-amụ amụ ka o ji ọkọlọtọ mba Palestine ya na ndị ọzọ n'ihu ụlọomeiwu dị na Rabat, Morocco n'ụbọchị 17 Ọktoba 2023

Ebe foto si, EPA

Ọtụtụ narị ndị mmadụ mere ngagharịiwe n'isi obodo Morocco bụ Rabat.

Ndị a kpọrọ oku ka e mechie ụlọọrụ mba Isreal dị n'obodo ha.