Etu m si hapụ Naịjirịa gawa mba Chad ịchụ ego - Odinakachukwu Musa Nwaodia

Aha onyonyo, Etu m si gaa Chad ịchụ ego - Musa Nwaodia
Etu m si hapụ Naịjirịa gawa mba Chad ịchụ ego - Odinakachukwu Musa Nwaodia

Maazị Odinakachukwu Musa Nwaodia bụ nwoke Igbo bi ma na-achụ ego n'obodo Abeche nke mba Chad gwara BBC Igbo etu o siri malite ịgba mbọ na mba ahụ.

O kwuru na o biela n'obodo Abeche ihe karịrị afọ iri na abụọ (20years).

Ọ sị na mgbe ọ bịara obodo a na ọ malitere ire mmiri bụ nke ọ na-agbara ndị mmadụ ruo afọ abụọ tupu ọ banye azụmaahịa akpakara (scrap).

Nwaodia sị na ọ bụ onye okpukperechi Alakụba mana o gbochighi ya ịma ebe a kpụrụ ya si bụ ala Igbo.

Ọ dụkwara ndị ntoroọbịa ndụmọdụ ka ha jisie ike na-agba mbọ maka na ọ bụ ihe e jiri maara ụmụafọ Igbo na-abụghị ịlekwasị gọọmentị anya maka enyemaka.

Etu m si gaa Chad ịchụ ego - Musa Nwaodia
Nkọwa foto, Etu m si gaa Chad ịchụ ego - Musa Nwaodia

Maazị Nwaodia sị na ọ bụ onye Igbo si na mpaghara Delta steeti.

Ọ sị na ndị obodo Abeche na mba Chad nabatara ya nke ọma mere azụmaahịa ya ji aga nke ọma.

Ọ sịkwara na ọ lụrụ nwunye ma mụọkwa ụmụ na Chad tinyere ndị ọ mụrụ na Naịjirịa.

BBC hụrụ Nwaọdịa n'ụlọazụmaahịa ya ebe ọ na-ere igwe akpakara na Chad.