You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ị kwesiri ịma maka ụgwọ 0.5% ọhụrụ CBN manyere
Ụlọakaụ etiti dị na Naịjirịa bụ CBN ekwuputala n'ụbọchị Monde ka ụlọakụ ndị dị icheiche malite ịnapụ ndị mmadụ ụgwọ ha kpọrọ 'cybersecurity levy'.
N'ime ozi ahụ ha kwuru na nke a bụ iji mezu ihe dị n'ime iwu akpọrọ Cybercrime (Prohibition, Prevention, etc) (amendment) Act 2024.
N'ime iwu a, ha kwuru na 0.5% n'elu ọpụpụ na mbata ego niile n'ụlọakụ bụ nke a ga-eewpụta ma nye ụlọọrụ onyendụmọdụ gbasara nchekwa.
O kwughi ihe ụlọorụ ahụ bụ NSA n'ịchafụ ga-eji ya bụ ego mee.
- Nkọwa ọzọ bụkwa na ọ bụ onye na-ezipu ego ahụ ka a ga-anata ego ahụ ma kpọọ ya 'Cybersecurity levy' n'ozi a ga-ezigara onye nwe ọba ego.
- A ga-amalite ịwepu ego a n'izuụka abụọ ọzọ na-abịa.
- E nyere ụlọakụ ohere ha ga-eji wulite igwe ọrụ ịha inweike iji napụta ndị mmadụ ya bụ ụgwọ bido n'ụbọchị e nyere.
- Ụlọakụ ọbụla emeghi nke a bụ nke a ga-ada nha ihe ruru pasentị abụọ n'ego ha ritere n'ime otu ọnwa.
Etu ndị mmadụ si nabata nkwuputa a
Ndị mmadụ na soshal midia egosila iwe ha gbasara ego a amanyere ọhụrụ nakwa ụgwọ ndị ọzọ ndị ụlọakụ si n'aka ndị mmadụ amịta.
"Gịnị ga-afọzi n'ime ego anyị chọro ịnwe?" bụkwa ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ n'elu soshal midia.
Otu onye na-akpọ oku ka e mee ngagharị iwe n'ihi na nke a akarịala.
Ndị ọzọ na-agụpụta ụgwọ niile ndị ụlọakụ na-anapụ ha ugbua ma kwuo na ọ dịghị ha mma.
Ihe ọzọ bụ okwu a kpụ n'ọnụ bụ ma ụlọakụ etiti e nwere ikike ịmanye udiri iwu a ma malite ya n'adaghị iwu.