You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụfọdụ ọkpụrụkpụ ihe a ga-eji echeta ndụ George Obiozor
Dịka Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo steeti gbara ama ọnwụ onyeisi otu Ohaneze ndigbo bụ George Obiozor n’abalị ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba 2022, ọtụtụ ozi apụtawala banyere ndụ ya.
Ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze ndigbo bụ Alex Ogbonnia gwara BBC Igbo n’ụbọchị 29 nke ọnwa Disemba, 2022 na ‘Ọnwụ Obiozor na-ewute onye ọbụla, ọkachasị ndị Igbo nakwa ndi Naịjirịa niile.”
Ọ gara n’ihu kwupụta ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Obiozor ji ndụ ya mee tupu ọmalite ịchị otu ha.
O kwuru:
“Ya na Ibrahim Babangida, ya na Goodluck Jonathan rụkọrọ ọrụ, ya na Shehu Shagari rụkọrọ ọrụ nakwa Olusegun Obasanjo.”
“Ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ na-ekwu niile okwu ọma banyere ya.”
“Nke kacha nke bụ ihe ndị ọ meere ndị Igbo ọkachasị na nso nso a”
N’okwu ihe ọ sị Obiozor meere ndị Igbo o kwuru na ọ gbara isi akwara ma kwusie ike na oge ntuliaka a na-abịa bụ oge ọchịchị nke ndị Igbo.
Ogbonnia kọwara na Obiozor hụrụ na a nụrụ olu ndị Igbo n’okwu inye ha ohere ọchịchị ugbua.
Ma kwuo na ọ na-enwe olilianya na mkpụrụ ọ kụrụ n’okwu a ga-amịta mkpụrụ na 2023.
“Ihe na-ewute m bụ na ọ gaghị anọ hụ ụbọchị aga enye Peter Obi ọchịchị na 2023 ka a mara na ọ bụ mbọ Obiozor gbara.”
O kwukwara etu Obiozor si bụrụ onye oha na-agbara ezi ama ma bụrụkwa onye rụụrụ Naịjirịa ọrụ dịka n'oge mbụ ọ rụbụrụ ọrụ dịka onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba dị iche iche.
Agbanyeghị na ọ kwupụtaghị etu o siri laa mmụọ kpọm kwem, ọ kọwara na ozi banyere nke nakwa ihe ndị ọzọ ga-eso ọchịchị otu ha ugbua ga-apụta ihe na nso nso a.
Cheta na akụkọ ọnwụ ya malitere ifesea n'ebe ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba mana n'ụbọchị 28 nke ọnwa Dịsemba tupu Gọvanọ Uzodinma ezipụta ozi ọkwa ọnwụ ya na Ogbonnia gwara BBC Igbo n'ụbọchị 28 ahụ na ọ gaghị enweike kwuo ihe ọbụla banyere ọnwụ maọbụ ndụ ya:
"Otu onye kpọrọ m kwuo na nwa Obiozor gwara ya na Papa ya ka dị ndụ "
Ogbonnia kọwara na ọ natara ozi a n'ụbọchị 27 nke ọnwa Disemba ma kwuo na enwebeghi ozi ọzọ ọ nụrụla n'aka ezinaụlọ ya taa bụ abalị 28 nke ọnwa Disemba.
Ọ gara n'ihu kwuo:
" Ihe a m gwara gị bụ ihe m mara. Agaghị m ekwu ihe ọbụla na-abụghị ihe ezịnụlọ ya ekwuo".
George Obiozor bụ Onyeisi Ohanaeze Ndigbo anwụọla - Gọv Hope Uzodimma
Gọvanọ Hope Uzodimma bụ onye ji aka ya zipụta ozi ọnwụ Obiozor mgbe ọ depụtara n'akara soshal midia ya, kwuo na Obiozor rịara obere ọrịa tupu ọ nwụọ.
O kwuru na ọnwụ ya bụ oke ihe funahụrụ ndị Igbo, Naịjirịa nakwa mbaụwa gbaa gburu gburu maka ụdịrị akụnauche Obiozor nwere.
Uzodimma sị na oge na-adịghị anya na a ga-ekwupụta mgbe a ga-eli ya nakwa usoro a ga-eji lie ya.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Onye bụ George Obiozor
- George Obiozor bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị Igbo nke bụ Ohaneze.
- Ọ bụ ọkankuzi ma rụọkwa ọrụ dịka onye nnọchite anya Naịjirịa na mba Amerịka, Izrel na Sịprụs.
- A mụrụ ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgụst afọ 1942.
- Obiozor gụrụ akwụkwọ na Institute of African Studies nke dị na Geneva, Switzerland ya na Mahadum nke South Tacoma nke mba Amerka ebe ọ nwetara asambodo na Political Science.
- O mechara gụọ kwa na Columbia University nke New York site n'afọ 1971 ruo afọ 1975.
- Obiozor lọghachitere Naijirịa n'afọ 1979.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi Nigerian Institute of International Affairs.
- Obiozor rụrụ ọrụ dịka onye nnọchite anya Naijirịa na mba Izrel n'afọ 1999 ruo afọ 2003.
- Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nnọchite anya Naijirịa na mba Amerịka site n'afọ 2004 ruo afọ 2008.
- Ọ bụ n'ụbọchị iri nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021 ka o meriri ntulịaka nke ọnyeisi otu Ohaneze.
Kedụ otu bụ Ohaneze
Ohaneze Ndịigbo bụ otu jịkọrọ ndị Igbo niile.
Otu a abụghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị, ọrụ ha bụ ịkwalite ọdịmma n'etiti ndị Igbo bụ ihụ kwa na ihe ruru ndị Igbo rutere ha aka.
Ọ bụ n'afọ 1934 ka e hiwere otu OhanezeNdiigbo maka ọdịmma ndị Igbo oge mpaghara ọwụwa anyanwụ ka nọ n'okpuru ọchịchị mba Briten.