'Ha gburu ụmụ ntoroọbịa ndị a niile' - Nnyocha BBC mere n'ebubo ogbugbu igwe mmadụ n'ebe ndịagha nnupuisi kpachiri na Kongo

Freddy Makuza yi ugegbe anya ma na-ekwu okwu n'ekwentị.

Ebe foto si, Freddy Mukuza / Facebook

Nkọwa foto, Freddy Makuza na-eti egwu, onye lụrụ nwunye ma mụta ụmụ abụọ na-abanye n'ụlọ ya ụbọchị e gburu ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Onye hụrụ Freddy Mukuza anya ikpeazụ bụ enyi ya, onye ọnọdụ ahụ gbara gharịị.

Oge ọ nụrụ na ndịagha nnupuisi M23 gbara Freddy egbe, ya na ndị ọzọ mere ngwangwa gaa ebe ahụ dị na Goma, mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo.

"Onye anyị wuchiri, anyị hụrụ Freddy dịka ọ ka na-eku ume ma chọọ ịkpọpụ ya mana ndị otu M23 ekweghị anyị," ka enyi ya ahụ kwuru, onye anyị na-akpọ Justin.

"Oge anyị jụrụ, ha gbara egbe n'ala dịka ọ bụ iji gwa anyị: 'ọ bụrụ ma gị sie ọnwụ gafee ebe a, anyị egbuo gị n'otu aka ahụ."

Nke ahụ mere ka ha sọlaa azụ dịka Freddy gbara afọ iri atọ na otu (31) kuru ume ikpeazụ ya. Ọ bụ naanị oge ahụ ka ndị M23 nyere ohere ka ha ruo ya nso ma bupụ ozu ya.

N'ime obere oge tupu e gbuo ya, ụgbọala trọọkụ atọ jupụtara na ndịagha nnupuisi bịara n'ebe Freddy bi na Kasika.

Ọ bụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere atọ nke ehihie (15:00) n'ụbọchị Satọde 22 Febụwarị, ihe fọdụrụ obere ka o ruo otu ọnwa ndịagha nnupuisi ahụ kpachiri Goma dịka ha na-abami na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ.

N'ime ihe dịka otu elekere, egbuola mmadụ ruru iri na asaa maọbụ iri abụọ na abụọ, ọkachasị ndị ntorobịa, dịka ndị hụrụ ya siri kwuo.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Anyị enwetala ozi n'aka ndị bi n'obodo ahụ, ndị apụghị ịkpọ aha maka nchekwa ha.

Anyị jụrụ ndị M23 maka ọsịsa nyere ebubo na ha gburu mmadụ n'igwe n'obodo ahụ. Ha ekweghị azaghachi.

Ndị ọchịchị Kasika ekwuputabeghị ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ, dịkwa ka a na-enweghị olileanya maka ime nnyocha kwụụrụ na nke onwe ya gbasara ihe ndị bi n'obodo ahụ kọwara dịka igbu mmadụ n'igwe.

Mana ndị obodo kwusiri ike na M23 bụ naanị otu nwere ngwaọgụ ma na-akpakwa ike na-enweghị mgbochi, dịka ha na-agba ndị mmadụ egbe ma na-egbukwa mmadụ n'ihu ọha na Goma.

Kemgbe ha kpachichara obodo ahụ na ngwụcha ọnwa Jenụwarị, ha bụ ndịagha nnupuisi ewerechaala ọnọdụ. N'ime mkpụrụ ụbọchị iri na asatọ (18) anyị nọọrọ n'obodo ahụ, ọchịchị ha gbasiri mgbọrọgwụ ike.

E boola ha ebubo na mge gara aga ịkpa arụ dị iche iche na mpaghara ndị ọzọ.

Ndị otu ahụ bu ngwaọgụ anaghị eme nke a na nke onwe ha. Ọ bụ mba Rụwanda gbara ha agbataobi na-enye ha nkwado, dịka otu UN na Amerịka siri kwuo. Rụwanda agọpụla onwe ya n'ebubo ahụ mana o kwughị na ndịagha ya anọghị na DR Kongo.

E kwenyere na ndị M23 buru agha na Kasika n'ihi ogige ndịagha Kongo nọbu na mpaghara ahụ.

E mechiela ya bụ ogige Katindo ugbua mana ụfọdụ ndịagha na ndị ezinaụlọ ha ka nọkwa na mpaghara ahụ.

Maapụ mpagahara Kasika na-egosi ogige ndịagha Katindo dị na Goma mba DR Kongo ebe a chọtara ozu ndị mmadụ e gburu n'abalị 22 Febụwarị 2025.

"Ọbụghị ndịagha niile nwereike ịgbapụ," ka otu onye obodo ahụ kọwara. "Ụfọdụ tụfuru egbe ha ma nọrọ na mpaghara ahụ."

Mana Freddy Mukuza bụ onye nkịtị, nwoke ji nwunye na ụmụ abụọ ma na-agbalị ibi ndụ. N'oge ihe isiike, ọ na-agba ọkada iji na-ebi ndụ.

Ọ bụkwa onye na-akpọ oku maka ezi ọchịchị na onye na-ede egwu, dịka ọ na-egwu ya ekwuputa ọtụtụ nsogbu anyị na-agabiga n'obodo a.

DR Kongo bụ mba e ji nrụụaka na ọgbaaghara mara.

Ịkwaso mmadụ iko n'ike bụ njirimara mba ahụ. Gọọmenti ha agbasighị ike.

E nwere ọtụtụ ihe Freddy kwesịrị iji gụọ egwu.

Otu n'ime egwu ya bụ Au Secours (Enyemaka n'asụsụ French).

N'ụbọchị ọ nwụrụ, Freddy na-akwabanye n'ụlọ ọhụrụ ọ kwụrụ ụgwọ ya na Kasika. Nwanne nwunye ya nke nwoke na-enyere ya aka itinye tampolin n'elu ụlọ ahụ.

Nwanne nwunye ya nke nwaanyị nọkwa ebe ahụ, dịka ha na-ahazi ụlọ ahụ maka ezinaụlọ Freddy. Oge ha nụrụ ụda egbe ahụ, ha nọ n'ime ụlọ mana ha jiiri oso pụta ma mechie ụzọ mana ndị M23 hụrụ ha.

Ndị agha nnupuisi ahụ gbagburu ọgọ Freddy abụọ ahụ, dịka enyi ya bụ Justin siri kwuo.

Kemgbe ahụ, Justin apụtabeghị mbaraezi. Naanị ihe ezinaụlọ ya na-eri bụ akwụkwọ nri na mkpụrụosisi.

Ọ kwụsịla ụmụ ya ịga akwụkwọ n'ihi ụjọ na ndị M23 nwere ike ịkpụrụ ha ma manye ha ịbanye n'otu ahụ.

Onye otu M23 bu egbe nwere ọtụụ mgbọ. O guzoro n'ọgbọ egwuruegwu dịka ndị mmadụ nọdụrụ ala n'azụ ya - Goma, DR Kongo

Ebe foto si, Göktay Koraltan / BBC

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị bi na Goma ekwuola na ha bi n'ụjọ

Denis Baeni nọ n'ụzọ na-ala ụlọ ya oge ndị agha nnupuisi ahụ wuchiri na Kasika. Ọ gbabara n'otu obere ụlọahịa iji zoo onwe ya tinyere ụfọdụ ndị ọzọ, ka onye gwara anyị okwu sịrị.

Onyenkụzi Praịmarị ahụ wepụtara akwụkwọ njirimara ya n'akpa. O nwereike iche na nke ahụ ga-azọ ya, site n'igosi na ya bụ onye nkịtị.

Onye agbataobi maara ihe merenụ gwara anyị ka o siri mee. Anyị na-akpọ ya Rebecca.

"Ha nụrụ olu na-ajụ ase n'ezi sị: 'E nwere onyeagha nọ n'etiti ha?'" ka Rebecca kwuru. "Ha sị mba mana onye M23 kpụpụtara ha n'ime ụlọahịa ahụ."

A gwara ndị nke nwoke ka ha gaa ebe e nwere ụlọ ndị a ka na-arụ arụ, bụ ebe a ga-anọ gbagbuo ha.

Denis hapụrụ ụmụ abụọ ndị naanị ya na-azụ.

Ọ bụghị naanị ọnwụ ka anyị na-atụrụ egwu ebe a. Ndị bi ebe a na-atụkwa egwu ịmanye ha ka ha soro lụọ ọgụ - ma ha chọrọ ma ha achọghị.

Corneille Nangaa nke otu Congo River Alliance.

Ebe foto si, AFP

Dịka a na-amanye ezinaụlọ ndị bi na Kasika ịkpachi ihe mgbu ha, M23 agaala n'ihu na-eweghara ọwụwa anyanwụ DR Kongo.

Oge ha kpachichara Goma, ha banyere n'obodo Bukavu n'etiti ọnwa Febụwarị. Ha eyikwaala egwu ịbanye n'isi obodo mba ahụ bụ Kinshasa.

Ha sị na ha bụ ndị chọrọ mgbanwe ọchịchị na-alụ agha n'obodo dara ada ma na-echekwa ikike ndị agbụrụ Tutsi.

Na nsonso a ka BBC gbara onyendu ndịagha nnupuisi bụ Corneille Nangaa ajụjụ. O bụ onyeisi otu a kpọrọ Congo River Alliance nke M23 so n'ime ya.

"Ahụghị m akụkọ ndị ahụ," ka ọ sịrị. "Agaghị m enye nzaghachi maka ihe m agụghị". O kwukwara na ebubo ndị ahụ anaghị amapụ ya obi.

Oge anyị na-agwa otu onye bi na Kasika okwu, nwunye ya kpọro ya gwa ya ka ọ bịa ọsọọsọ iji nwee ike kpọlata nwa ha nwoke gbara afọ asatọ n'ụlọakwụkwọ.

Onye niile chị obi n'aka dịka akụkọ na-efegharị ebe niile na ndị otu M23 na-ekuru ụmụaka n'ụlọakwụkwọ ha.

Ọ kpọlatara nwa ya n'udo mana ọ na-atụ egwu maka ọdịnihu.

"We are all traumatised. They said they came to liberate us," he said. "But now it's like they are taking us hostage. "

"Ike agwụla anyị. Ha sị ha bịara ịnapụta anyị," ka o kwuru. "Mana ugbua, ọ dịzi ka ha na-ejichi anyị n'agbụ."

Maapụ na-egosi mpaghara M23 na-akpa ike na mpaghara ọwụwa anyanwụ DR Kongo