Egbe ntụ Arsenal ji bịa ọgụ anyụọla ka ọkụ na be Man Utd

Manchester United agbanyụọla ọkụ mmeri Arsenal dịka ha ji ọkpụ goolu atọ a satara naanị otu merie ha.

Man Utd nabatara Arsenal bụ ndị nọ n'elu tebulu Premier League na be ha n'Old Trafford, mana ha emezighi ha ọfụma ka ndị ọbịa dịka ha mere ha echeta ebewe.

Antony dos Santos ka batara Man Utd ọhụrụ n'izu a bu ụzọ meere Arsenal ọjị site na goolu mbụ o nyere na nkeji 35 bọọlụ ji malite.

Bukayo Saka nke Arsenal sara ha site n'ịgbanye goolu nke ya na nkeji 60.

Rashford mezuru ya goolu abụọ na nkeji 66 ma jiri goolu nke atọ o nyere na nkeji 75 chọọ ya mma.

Mmeri a mere ya nke anọ Man Utd na-emeri n'afọ bọọlụ ọhụrụ a, n'ime ugboro isii ha gbarala bọọlụ.

Nke a ebugotela Man Utd n'ogogo nke ise na tebulu Premier League, ebe ha ji pọịntị 12 ugbua.