Ihe mere n'ezie maka nwaanyị a sị gburu onwe ya n'Enugwu

Ebe foto si, Supplied
Nwunye gọvanọ Enugwu steeti bụ Nkechinyere ekwuola na ọ ga-akwado ụmụaka atọ a sị nne ha gburu onwe ya n'Enugwu n'agụmakwụkwọ rue mgbe ha ruru Mahadum.
Cheta na akụkọ kwuru na o nwere nwaanyị kpọpụrụ ụmụ ya n'ebe akpọrọ Ogui Road n'Enugwu ma gbaa onwe ya ọtọ gbabaa n'okpuru ụgbọala ukwu.
Ọ bụ ụmụ nwaanyị ahụ nke ndị uweojii kpọgara n'ụlọorụ ha ka nwunye Gọvanọ nyere aka.
Ihe ọzọ bụkwa na o nyere iwu ka akpọpụ ụmụaka ahụ n'ụlọorụ ndị uweojii ma kpọga ha ebe ha ga-anọzi.
Ụmụaka ahụ nke kachasị ukwu dị naanị afọ isii enweghi ike ịkọ akụkọ nwere isi banyere ebe nne na nna ya nọ.
Mana ndị uweojii kwuru ihe dị iche banyere nwaanyị ahụ na ụmụ ya.
Ihe ndị uweojii kwuru
Ndị uweojii n'onwe ha kwuru na ọ bụghị eziokwu na nwaanyị ahụ kpọsara ụmu ya n'ihu ụlọorụ ndị uweojii ma gbuo onwe ya site n'ịgbaga n'okpuru ụgbọala.
Ha sị na nwaanyị anwụghị anwụ kama na ọ gbara onwe ya ọtọ ghahapụ ụmụ ya ma gbapụ ọsọ ebe ha na amaghị.
Ha sị "anyị ruru n'ebe mmadụ kpọrọ ndị uweojii oku enyemaka ma hụ ụmụaka ahụ ebe ahụ kpọrọ ha gawa ụlọọrụ anyị" ka ozi ahụ ha weputara kwuru.
Ihe ọzọ ha kwuru bụ na di nwaanyị ahụ abịala kpesa n'ụlọorụ ndị uweojii na nwunye ya na-eme omume edochaghị anya nke gosiri na ọ na-enwe nsogbu ụbụrụ.
Ọ sị na ọ latara ọrụ ma hụ na nwunye ya na ụmụ ya atọ anọghizi n'ụlọ na be ha dị n'Uguwaji dị n'okpuruọchịchị Enugu South dị na steeti ahụ.









