I hụtula ihe e sere ese na-agụ egwu?

Aha onyonyo, Ọ na-enye m ọṅụ inye eserese m ndụ - Ife Olowu
I hụtula ihe e sere ese na-agụ egwu?
Ife Olowu
Nkọwa foto, "Ndị mmadụ na-ajụ m sị ihe nke a ọ bụ anwansi?"
    • Onye dere ya, Chimezie UcheAgbo & Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist

Nwamadị Ife Olowu ji teknụzụ Augmented Reality eme ka eserese ya nweta ndụ.

O seela nwoke mee ya ka ọ na-afụ opi, see nwaanyị na-eme inyanga ma a na-etu ya aha ma sekwa okporo ụzọ ụgbọala na-aga na ya mana ihe dị iche bụ na ihe ndị ahụ na-eme n'ezie n'ime eserese ndị ahụ ma i jiri ekwentị lee ya.

Olowu malitere iji teknụzụ a kpọrọ 'augumented reality' mee ka eserese ndị ọ na-emepụta na-egosi ihe ndị ha na-eme n'ime eserese ndị ahụ.

Teknụzụ ahụ na-apụta ihe ma i jiri ekwentị kirie eserese ahụ. Ịmaatụ, otu n'ime eserese ya ọ kpọrọ Makoko na-egosi obodo Makoko mana i jiri ekwentị lee ya, ị hụ na mmiri na-ezo, egbeigwe a na-agba n'ime ya.

Eserese Ife Olowu

Ebe foto si, bbc

Nkọwa foto, Eserese na-akpọ anwụrụ

Ụfọdụ ndị mmadụ akpọọla ya ọgwụ a gwọrọ agwọ na ndị mmụọ mana ọ bụ teknụzụ.

Ife Olowu gwara BBC Igbo na inye eserese ya ndụ bụ ihe na-enye ya ọṅụ ma bụrụkwa etu ya choro iji mee ka ndị mmadụ nwee obi aṅụrị oge ọbụla ha na-ele eserese ya.