Chidiebere Ibe: Ihe mere m ji jiri eserese isiojii egosipụta ọrịa na ahụike mmadụ

Aha onyonyo, Medical Illustrator: Ihe mere m ji jiri eserese isiojii egosipụta ọrịa na ahụike mmadụ

Chidiebere Ibe wuru ewu na soshal midia maka eserese akụkụ ahụ onye isiojii nke ndị ọrụ ahụike ji egosipụta ọrịa.

Ndị mmadụ na soshal midia ji obi ụtọ nabata eserese ya maka na ọ bụ ihe pụrụiche na-egosipụta nsogbu ahụike n’eserese onye isi ojii.

N'ihe onyoonyo a, Ibe gwara BBC Igbo na o bụ n'ụlọakwụkwọ mahadum nke ndị dibịa Oyibo ka o bidoro nwewe mmasị ina-ese ndị mmadụ maka nkọwa ya bụ ahụ mmadụ site n'iji ndị isiojii.

Ọ sị na kwaizu ka o ji egosipụta ya bụ eserese ya n'igwe soshial midịa mere ndị mmadụ jiri nwe ihe itunaya maka ihe eserese ya.

O kwukwara na o nwere mmasị iji ihe eserese ya kuzie ndị ụmụakwụkwọ dọkịnta ka e ji eserese ndị isi ojii ji mụta ka ahụike ndị ma nleta ndị isi ojii kama iji eserese nke ndị ọcha nke ukwuu.

Ibe na-atụanaya na eserese ya ndị a ga-abara ndị ụmụakwụkwọ na-amụta ọrụ dibịa Oyibo n'Afrịka ezigbote uru.

Kirie ihe onyoonyo a ka i hụ ka nwa amadị a bụ Chidiebere Ibe ji eji igwe kọmpụta eseta ihe ndị a.

Akara ntụ-ntụ

Onye bụ Chidiebere Ibe?

Chidiebere Ibe

Ebe foto si, Instagram/ebereillustrator

Ibe bụ nwa akwụkwọ na-agụ akwụkwọ ịbụ dibịa oyibo.

O buruụzọ gụọ Kemistrị na Mahadum Uyo.

Ugbua ọ na-agụ maka nsogbu ụbụrụisi na mahadum Kyiv dị na mba Rọshịa.

O nwekwara akaọrụ n’ịse ihe kama na ụdịrị ihe ọ na-ese bụ eserese gbasara ngosipụta ọrịa na ahụike mmadụ.

Eserese ya nke gosiri nwa ka dị nne isiojii n’afọ wuru ewu n’ịntaneti dịka ọtụtụ mmadụ nabatara ya.

O wuruewu n'igwe soshial midịa mgbe o gosipụtara eserese ahụ ndị isiojii ndị o sere mere ka ndị mmadụ nwe mmasị n'ihe o sere.

Ihe mere eserese Chidiebere ji dị mkpa.

Eserese Chidiebere Ibe

Ebe foto si, Instagram/ebereillustrator

Nkọwa foto, Eserese nke Chidiebere ji gosipụta ọrịa akpata na etu o si emetụta ụmụaka.

Chidiebere kọwara na ọtụtụ ọrịa ndị egbu ndị isiojii ekwesịghị ma ọ bụrụ na ndị nna nna anyị maara ka ọrịa ndị a si emetụta ndị isiojii site n’eserese ya.

Ọ gara n’ihu kọwaa na site na esrese ya, ị ga-ahụ na usoro e ji agwọ onye ọcha n’otu ọrịa abụchaghị usoro e kwesịrị i ji gwọọ onye ojii.

O nwere olileanya na a ga-ebido iji eserese ndị isiojii akụziri ndị mmadụ ihe n’ụlọakwụkwọ ndị ahụike.

Kirie akụkọ a ka ị hụ ka ịhụ ka Chidiebere is kọwaa ya.

Ndị mere akụkọ a bụ Grace Ekpu, Makuochi Okafor na Nnamdi Agbanelo.