Ihe Ipob sara ndị agha kwuru na ha wakporo ogige ndị ESN n'Ohafia

Emma Powerful, bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) ekwuola na ndị agha Naịjirịa anaghị ekwu eziokwu, dịka ha kwuru na ha wakporo ogige ndị IPOB na ESN dị n'Ohafia.

N'ozi o ziteere BBC Igbo, Powerful kwuru na ha bụ ndị Ipob ekwuola ugboro ugboro na ha enweghị ogige ọbụla n'Ohafia.

"Ogige ndị ekperima niile ndị agha Naịjirịa na-asị na ha wakporo abụghị ogige ndị ESN. Ogige ndị ESN nwere ezi nchekwa ma bụrụkwa ebe dị asọ," Powerful dere.

"ESN anaghị atọrọ mmadụ maọbụ anapụ ndị aka ha dị ọcha ego. Ndị agha Naịjirịa kwesịrị ịkwụsị ebubo na aha ọjọọ ha na-akpọ ndị Ipob na ESN, aka anyị dị ọcha."

"Aka ESN adịghị na ntọrọ onye agha n'Ebem Ohafia. Ndị agha ikwu na ha wakporo ogige ndị ESN dị n'Amangu iji gbapụta onye otu ha bụ Bassey Ikunugwan, bụ asị."

Cheta na ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ndịagha ha wakporo ogige ndị Ipob/ESN ma chọta ọtụtụ egbe na ngwaọgụ.

Ihe anyị hụrụ mgbe anyị wakporo ogige ndị ESN/Ipob n'Ohafia - Ndị agha Naịjirịa

Ndị agha Naịjirịa nke ngalaba 82 Division akọọla etu ha si wakpo ogige ebe ha sị na ndị ọgụ nnupuisi Indigenous People of Biafra na 'Eastern Security Network' ji mere ebe obibi.

Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede taa bụ Wenezde, ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba 2022.

Nwachukwu kwuru na ndị ekperima a tọọrọ otu onye otu ha bụ Bassey Ikunugwan n'ụbọchị Wenezde, ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba, n'okporo ụzọ Okwu-Ebem Ohafia dị n'Abia steeti.

N'echi ya bụ Tọzde (Nọvemba 3), ndị agha malitere ịchọ onye otu ha ahụ banye n'ime ọhịa dị n'obodo Amangu ebe ha na ndị ekperima ahụ kwara mgbọ, ha wee gbuo otu onye, ma nata ya otu egbe AK47, ọtụtụ mgbọegbe na otu ekwentị.

Ka abalị abụọ gachara, ndị agha wakpokwara ọhịa ọzọ ebe ndị ekperima bikwa na mpaghara ahụ, gbagbuo ndị ekperima abụọ ebe ndị ọzọ bu mgbọegbe gbaa ọsọ.

"Ndị agha chọtara egbe AK47 abụọ, egbe 'pump action' anọ, otu egbe 'pistol', otu egbe 'sniper', ọtụtụ mgbọegbe na otu ọgbatumtum," Nwachukwu kwuru.

Ihe ndị ọzọ ndị agha kwuru na ha hụrụ n'ogige ndị ekperima a gụnyere igwe osefoto CCTV abụọ, otu ekwentị walkie-talkie, ekwentị abụọ, akwụkwọ ukwe njirimara ndị Biafra abụọ, nnukwu mma, uwe ndị agha, otu igbe vootu ndị Inec, otu igwe ndị Inec ji edebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka, na ihe ndị ọzọ.

Nwachukwu gara n'ihu dọọ aka na ntị na ha agaghị agbachi nkịtị ka ndị ekperima na-awakpo ma na-atọrọ ndị agha.

O kwuru na ha agaghị ege ntị na ndị asịrị na-akatọ ndị agha ma na-ebo ha ebubo iji aka ike akpaso ndị obodo agwa.

"Anyị na-agwa ndị obodo Amangu bụ ndị na-edebe iwu obodo ka ha ghara ịtụ ụjọ ọbụla n'ihi na ndị agha ga na-echekwa ha oge niile," Nwachukwu kwuru.

Ọnọdụ nchekwa dị njọ n'Ohafia

Nke a abụghị nke mbụ maọbụ nke abụọ ndị agha na ndị ojiegbe na-atakọta isi na mpaghara Ohafia, Abia steeti.

N'ọnwa Ọgọst, BBC Igbo dere akụkọ etu mwakpo ndị ojiegbe si taa isi ndịagha abụọ n'Ohafia.

N'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachị afọ a, akụkọ pụtakwara maka etu ndị amaghị ndị ha bụ si wakpo Obodo Amangwu, gbuo ụfọdụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.

N'afọ 2020, n'ọnwa Eprel, ndị obodo Ohafia boro ebubo na ndị uweojii gburu otu nwa okorobịa aha ya bụ Fraiday Arunsi.

Ọbụghị sọ n'Ohafia maọbụ n'Abia steeti ka ọnọdụ nchekwa jọrọ njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa; ọ dị otu a na steeti ise dị na mpaghara ahụ.

Ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob n'ịchafụ, na ndị ọgụ ha bụ ESN, na-akpa ike ọjọọ niile a.

Mana ndị Ipob na-agọ agọ na ọ bụghị ha.

Onyeisi Ipob bụ Mazi Nnamdi Kanu nọ n'ụlọ mkpọrọ n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja, dịka gọọmentị na-ebo ya ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu.

Kedụ ndị bụ ndị Ipob?

Ipob nke pụtara Indigenous People of Biafra bụ otu Nnamdi Kanu hiwere dịka ọ na-agba mbọ ịchọta nwereonwe Biafra.

Ya bụ otu bụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ka otu kacha akpaike.

Gọọmentị Naijirịa amchiela ya bụ otu ma kpọọ ya otu oyiegwu, ebe ndị Ipob na-ebo gọọmentị Naijirịa ebubo aka ike na ịkpa oke megide ndị Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa ebe ndị Igbo juputara.

Kedụ ndị bụ ESN?

N'ọnwa Disemba afọ 2020, Nnamdi Kanu malitere otu ọrụ nche o kwuru ga-echekwa Ọwụwa Anyanwụ. Ọ kpọrọ ha 'Eastern Security Network'.

Malite mgbe ahụ rue ugbua, tigbuo zogbuo rịrị elu n'a mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Ndị ojiegbe awakpola ọtụtụ ogige ndị uweojii ma gbaa ha ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị uweojii na ndị Igbo nwere agba.

Ndị ọrụ nchekwa nakwa Gọọmentị Naijiria eboola Ipob na ESN ebubo ịbụ ndị na-akpa arụ ndị a, mana ha agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.