O nweghị mgbe m rituuru onye ọbụla n'ịzọ Gọvanọ n'Enugwu steeti - Frank Nweke

Onye ji otu APGA azọ ọkwa Gọvanọ n'Enugwu bụ Frank Nweke Jr. ekwuola na akụkọ na efegharị na ya anaghịzị azọ ọkwa Gọvanọ bụ okpotokpo asị.

Frank Nweke dọrọ ndị n'ebu ya bụ akụkọ ụgha aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọrọ aka mmadụ.

N'aka nke ọzọ mazi Frank Nweke kwuru na pati ya bụ APGA achọpụtala na o nwere pati ndị chọrọ iji mago mago na aghụghọ merie na ntuliaka gọvanọ n'Enugwu n'ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị afọ 2023, were kwuo na pati ya edegarala ndị uwe ojii, INEC nakwa ndị niile ọ dị na-aka inyọcha mpụ gbasara ntuliaka nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị.

O gwara ndị Enugwu ka ha hapụ ige ntị na asịrị ọbụla kama ha kwadoo nke oma bia tinyere ya aka n'akwụkwọ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị ma họpụta ya dịka Gọvanọ Enugwu.

Akụkọ ka na-abịa