You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị ojiegbe si gbaguo Gab Onuzulike bụbu Kọmishọna Enugwu Steeti na nwanne ya nwoke
Ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ agbagbuola onye bubu Kọmishiona Enugwu nakwa onyeisi okpuruọchịchị Oji River bụ Gab Onuzulike na nwanne ya nwoke bụ Elvis Onuzulike.
Nke a mere na mgbede ụbọchị Fraịde bụ 18th Nọvemba afọ 2022, mgbe Gab ha si n'obodo ha bụ Oji River na-alọta.
Akụkọ kwuru na Gab na nwanne ya gara akwamozu ma na-alọta, dịka ha rutere n'ahịa Eke Egbo ndị ojiegbe si n'ime ọhịa mapụta ma kwụsị ụgbọala ha.
Ha gbagburu Elvis nwanne ya nwoke ozugbo ma buru Gab gatụ n'ihu obere kilomita ma gbagbuokwa ya.
Kepu kepu na-ekwu na ndị uweojii gbara ndị ojiegbe ahụ nabalị dịka ha kpachara ike igbu Gab na nwanne ya.
BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steetị bụ Daniel Ndukwe mana ọ zabeghi tupu akụkọ a na-apụta.
Ihe ndị uweojii kwuru
Ndị uweojii Enugwu Steetị kwuru na ha agbagbuo mmadụ abụọ so na ndị gburu Gab na nwanne ya nwkoke.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ha bụ Daniel Ndukwe wepụtara ozi a ma sị na ndị ojiegbe si n'akụkụ Anambra Steeti bata n'Oji River kpaa arụ a.
Ọ sị ngwa ngwa ha nwetere ozi ihe mere, ndị ọrụ uweojii na ndịagha chụrụ ndị a gawa n'obodo Inyi bụ ebe ha kwakọrịtara mgbọ.
Ndukwe sị ha gburu mmadụ abụọ n'ime ndị a, ebe ndị ọzọ bucha mgbọ egbe n'ahụ ha rie mbọmbọ ọsọ n'ime ọhịa.
O gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ nchekwa ka na-achọgharị ime ọhịa dị n'ogige iji nwuchie ndị a gbara ọsọ.
Ọ sị na a na-apụtara ndị a egbe AK47, mkpo mgbọ abụọ juru eju nakwa ụgbọala atọ gụnyere nke Gab ha gburu egbu.
Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Gab
- Ọzọ Gab Onuzulike bụ onye obodo Achi dị n'okpuruọchịchị Oji River nke Enugwu Steeti.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Lagos state University ebe o ritere nzere masters degree na Business Administration.
- Ọ bụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama n'Enugwu
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisioche okpuruọchịchị Oji River site n'ọnwa Jenụwarị 2010 ruo Jenụwarị 2014.
- Ọ rụrụ ọrụ Kọmishọna na-ahụ maka mmepe ime obodo (Rural Development) site n'ọnwa Julaị 2015 ruo afọ 2021.
- Gab Onuzulike bụkwa otu n'ime ndịisi otu jikọtara ndị Ọzọ a kpọrọ 'Ọzọ in Counsel' n'Enugwu Steeti.
- Tupu e gbuo ya, Gab Onuzulike na-azọ ọkwa ịnọchite anya Awgu/Aninri/Oji River n'ụlọomeiwu nta n'aha pati PDP na ntuliaka afọ 2023, ebe ọ na-achọ ịnọchi anya Tobi Okechukwu n'ọkwa ahụ.