'Ọ bụrụ na asambodo gị enyeghị gị ọrụ, jiri ọrụ aka gị chọrọ onwe gị ọrụ' - Maduakolam

Aha onyonyo, Etu nwaada a siri nwere ịrụ akpụụkwụ na-aba ọgaranya na Legọs
'Ọ bụrụ na asambodo gị enyeghị gị ọrụ, jiri ọrụ aka gị chọrọ onwe gị ọrụ' - Maduakolam

Nwaada Maduakolam ji ịrụ akpụụkwụ na-enwete ego gbara ọkpụrụkpụ o ji amachị akpa ugbua mana ọ bụghị ihe o zubebụrụ iji ndụ ya mee na mbụ.

Maduakolam gụrụ akwụkwọ na mahadum ebe ọ natara ọzụzụ n’ọrụ idebeego nke Bekee na-akpọ 'Accountancy’, ọ malitere ọrụ n’ụlọakụ e mechee ụlọọrụ ebe ọ na-arụ emechị ọrụ.

Nwaada Amarachi na-agba mbọ n'ọrụ
Akụkọ ndị ọzọ banyere ndị na-agba mbọ

Kama ịnọ n’ụlọ na-elegharị anya, Maduakolam legharịrị anya n’akụkụ ya ma họrọ iji oge ya mụọ etu e si arụ akpụụkwụ.

Maduakolam akọwarala BBC Igbo etu ihe malitere ka egwu sizi enye ya ego o ji eme ihe ndị dị ya mkpa ugbua.

N’okwu ya ọ sị: “Enweghị ihe na-enye mmadụ obi ụtọ karịa ịhụ na ndị mmadụ yi ihe iji aka gị rụọ, ọ maa ha mma n’ahụ”.

Ọ kọwara na ọrụ ọ na-arụ na-enye ya ezigbo obi ụtọ mana ọ gara n'ihu kwuo na ya bụ ọrụ adịghịrị ya mfe na mbido mana na ezinụlọ ya kwadoro ya.

Ọ dụrụ ndị ntorobịa ọdụ na-ekwu ka ha gbaa mbọ hụ na ha abụghị ndị ngala kama ka ha hụ na bụ ndị na-agba mbọ ma bụrụkwa ndị na-arụsị ọrụ ọma ike

Nwaada na-arụ akpụụkwụ

.

Ọ gbara ama na etu o si azụta akpụkpaahụ ụmụ anụmanụ o ji arụ ọrụ na Legọs nakwa n'Aba ma kwuo na ugbua ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa nakwa n’ofesi na-agba ya aka ahịa.

Ọrụ Maduakolam na-arụ na-abara ya uru dịka ọ na-abara akụnụba Naịjriịa uru.

Naịjirịa so na mba kacha emepụta akpụkpụ ahụ ụmụanụmanụ e ji arụ akpa, akpụụkwụ, mgbanukwu nakwa ihe ndị ọzọ. Nnyocha ụlọọrụ Nigerian Economic Summit Group (NESG) mere na nso nso kwuru na n’ebe afọ 2025, ntụkọta ego ụlọọrụ ndị ji akpụkpụ ahụ ụmụanụmanụ arụ ọrụ nwereike iru

otu nde dọla.

Kirie ihe onyonyo a ka ị nụrụ ihe Maduakolam kwuru banyere ebumnobi ya n’ọrụ aka ọ na-arụ nakwa etu i nwereike isi mụta ya bụ ọrụ.