Etu ndị ọchịehi si wakpo obodo Agwa dị n'Oguta Imo steeti ma gbaa nwaanyị dị ime egbe ugboro ise

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị obodo Agwa dị n'okpuruọchịchị Oguta nke Imo Steeti nọ n'iru uju site na mwakpo ndị na-achị ehi wakporo obodo ha.

Ọtụtụ mmadụ nwụrụ site na mwakpo ahụ ebe otu nwaanyị dị ime na ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde 16 Mee, 2025 ka ndị omekome ahụ na-achị ehi wakporo obodo Obeakuma Mbano, Agwa. Dịka ndị obodo siri kwuo, ndị omekome ahụ gbalrii egbe elu.

Otu nwaanyị dị ime aha ya bụ Joy Achibugo bụ onye nọ n'ụlọọgwụ ugbua maka mgbọ egbe ise tụrụ ya.

Ka ndị obodo ahụ na-achọ ịchọpụta ihe kpatara mwakpo ahụ, mwakpo ọzọ mere n'obodo Umuekpu, Mgbala na obodo ndị ọzọ dị n'Agwa n'ụbọchị Wenezde 4 Juun, 2025.

Ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ndị omekome ahụ gburu mmadụ ise n'okporoụzọ Ejemekwuru-Agwa dị n'opuruọchịchị Oguta nakwa otu onye ọzọ e gburu n'ụlọ ya dị n'Umuekpu, Agwa.

Ndị obodo kwuru na ndị na-achị ehi ahụ na ndị obodo Amakohia-Ubi dị n'okpuruọchịchị Owerri West nwere esemokwu.

Ndị ntoroọbịa obodo ahụ chụpụrụ ndị na-achị ehi, mana oge ha rutere Agwa, ha malitere ịgba ndị mmadụ na-agara onwe ha egbe nke mere ka a chụpụ ha n'obodo ahụ.

Nne ochie nwaanyị ahụ dị ime a gbara egbe n'ụkwụ kọwaara BBC etu ndị ahụ siri wakpoo ha n'ụlọ ha.

Theresa Achigbuo kwuru na ya si ọrụ ubi bata n'ụbọchị ahụ wee gwa ụmụ ya ka ha chịbata nkụ o jiri bata.

N'okwu ya "dịka m chọrọ ịmalite izu ike, anyị nụrụ ụda egbe aghara aghara, ọ bụ oge anyị na-agba ọsọ ndụ ka mgbọ tụrụ nwa nwa m dị ime aha ya bụ Joy Achibugo".

O gosikwara onye ntaakụkọ BBC etu mgbọ egbe siri gbapuo ahụ ụlọ na ọnụụzọ ha.

Theresa, onye kwuru na ndị obodo ha na ndị na-achị ehi enwebeghị esemokwu mbụ, gwara BBC na gọọmenti Imo steetị maọbụ nke okpuruọchịchị ha abịabeghị nleta ebe ahụ ya bụ ajọ ihe mere kemgbe ahụ.

Davis Ekene Onyejiekwe a gbara egbe n'ọnụ, nọ n'ụlọọgwụ Federal University Teaching Hospital, Owerri (FUTHO) a nara ọgwụgwọ ugbua.

O mere ka BBC mata na nwanne ya nwoke nwụrụ site na mwakpo ahụ.

Ọ gwara BBC na ọtụtụ ndị obodo ha nwụrụ ebe ụfọdụ merụrụ ahụ n'ebe dị iche iche. O kwuru na ụfọdụ ndị meuru ahụ nọ n'ụlọọgwụ anara ọgwụgwọ ebe ndị merụrụ ahụ na-enweghị ego nọ n'ụlọ ha arịọ chi ha.

Anyị chọpụtara na onye ọbụla agbaala ọsọ n'obodo ahụ. Mbọ niile anyị gbara ịgba Eze obodo ahụ ajụjụ amịtaghị mkpụrụ dịka e kwuru na ọ nọghị n'ụlọ.

Onye ọzọ bụ otu nwaanyị dị afọ iri abụọ na abụọ bụ onye ji ụmụ abụọ ma dịkwa ime ọzọ. Nwaanyị ahụ bụ onye kwuru na ndị ahụ na-achị ehi gburu dị ya mgbe ọ nọ n'ụzọ na-alọta ụlọ.

Kasarachi, onye di ya na-edozi ụgbọala, kwuru na ha ebighị n'obodo ha kama ọ bụ na Ndọni dị na Rivas steeti ka ha bi.

O kwukwara na ya ahụbeghị ozu di ya anya kemgbe ahụ ma gbakwunyekwa na ndị uweojii maọbụ ndị gọọmenti a kpọtụrụbeghị ya ruo ugbua.

Kasarachi kwuru na di ya hapụụrụ ya ụmụaka isii na otu nọ n'ime afọ dịka ọ kọwara na di ya nwere ụmụaka anọ tinyere abụọ ya na di ya mụtara.

Ruo ugbua, anyị ka na-eche ka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye zaghachi ozi anyị zigaara ya.