Ihe ụmụnwoke a ma ama chere maka ụmụnwaanyị na-arụ ahụ ha
- Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
N'ụwa anyị nọ n'ime ya taa, ihe gbasara ịchọ mma bụ ihe ụmụnwaanyị ejighị egwu egwu.
Ụfọdụ anaghị eche ego ole ọ ga-eri ha, kama ebe uche ha dị bụ 'ka mma ha chawapụ.
Abịa n'ihe gbasara ịchọ mma, e nwere usoro na ihe dị icheiche mmadụ nwereike ime iji mee ya.
Nke kachasị enwu ewu bụ ihe dị iche iche ụmụnwaanyị na-ete n'ihu nke bekee kpọrọ 'makeup'. Nke a gụnyere ihe a na-ete n'ọnụ, n'ihu, n'anya nakwa ebe ndị ọzọ.
Mana ebe akụkọ a madoro ụkwụ bụ ụmụnwaanyị na-awa ma rụọ ahụ ha iji chọọ mma nke bekee kpọrọ 'cosmetic surgery'.
Cosmetic Surgery dị n'ụdị n'ụdị mana nke kachasị enwu ewu bụ Brazil Butt Lift (BBL).
Nke a bụ ụdịrị ịwa ahụ nke a na-eme iji mee ka ukwu nwaanyị buo ibu.
N'agbanyeghị nnukwu ego e ji eme BBL, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-aga n'ihu na-eme BBL iji dọtar uche ụmụnwoke ebe ha nọ.
Mana anyị jụrụ ụfọdụ ụmụnwoke ajụjụ iji chọpụta echiche ha banyere ụmụnwaanyị rụrụ ahụ ha iji chọọ mma.

Ebe foto si, Supplied/Instagram



