'Oge Ozioma jụrụ m ọ bụ na ọrịa a anaghị ala ala, ebere m ezigbo akwa' Nne na nna nwa nwere ọrịa shuga

Aha onyonyo, 'Oge Ozioma jụrụ m ọ bụ na ọrịa a anaghị ala ala, ebere m ezigbo akwa'
'Oge Ozioma jụrụ m ọ bụ na ọrịa a anaghị ala ala, ebere m ezigbo akwa' Nne na nna nwa nwere ọrịa shuga
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu, Ebere Ekeopara, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist, Reporter na Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Ihe a bụ akụkọ gbasara nwatakịrị dị afọ iri na abụọ (12) aha ya bụ Ozioma Rejoice Onuwa.

Dịka nwatakịrị ọbụla nwere ọdịnihu dị mma, ndụ Ozioma nwere rịkọm, ọ bụghị site n'aka onwe ya kama site n'ihe ndụ nyere ya mgbe a mụrụ ya.

Oge Ozioma dị afọ abụọ ọ malitere ịrịa oria kwa mgbe kwa mgbe, mgbe ọbula ahu ya na-ekpe ọku.

Ndị mụrụ Ozioma kpọọrọ ya gaa ụlọọgwu UNTH Enugwu bụ ebe dọkịta na-ahụ maka ọrịa ụmụaka lere ya ahụ ma chọputa na o nwere ọria shuga nke ndị Bekee na-akpọ Diabetes.

Oge ndị mụrụ ya na agwa BBC Igbo okwu, nna ya bụ Clement Onuwa kọwara na mgbe dọkịta gwara ha na Ozioma na-arịa ọrịa shuga "obi gbawara ha maka ha atụghị anya ya".

Kedu ka onye nne ya na nna ya na-enweghị ọrịa shuga si mụọ nwa nwere ya?

Nne Ozioma kpọọrọ ya gaa ụlọọgwu UNTH Enugwu bụ ebe dọkịnta na-ahụ maka ọrịa ụmụaka lere ya ahụ ma chọputa na o nwere ọria shuga bekee kpọrọ Diabetes.
Nkọwa foto, Nne Ozioma bụ Onuwa Blessing kpọọrọ ya gaa ụlọọgwu UNTH Enugwu bụ ebe dọkịnta na-ahụ maka ọrịa ụmụaka lere ya ahụ ma chọputa na o nwere ọria shuga bekee kpọrọ Diabetes.

Nna Ozioma bu Clement Onuwa si na mpaghara Aku dị n'Okpuru ọchịchị Igbo Etiti nke Enugwu Steeti sị na o nwere mgbagwojuanya maka ya na nwaanyị ya enweghị ọrịa shuga.

"Ajụrụ m mama m ma e nwere onye na-arịa ọria shuga n'ụlọ anyị ma ọ sịrị mba"

"Emechara nwunye m agaa jụọ ndi nne na nna ya ma e nwere onye na-arịa ọrịa shuga, ha gwara ya na ọ dịghị onye agbụrụ ha nwere shuga".

Ozioma gbara afọ iri na abụọ sitere n'oge a mụrụ ya taba ahụhụ ọrịa shuga.

Ọ gwara anyị na ọ nweghị ihe ụmụaka ibe ya na-eme nke ọ na-eme, o nweghị egwuregwu nke ọ na-eso ibe ya egwu maka ọria ọ na-arịa n-asọ ihe dị iche iche.

Ozioma gbara afọ iri na abụọ sitere n'oge a mụrụ ya taba ahụhụ ọrịa shuga.
Nkọwa foto, Ozioma gbara afọ iri na abụọ sitere n'oge a mụrụ ya taba ahụhụ ọrịa shuga.

Ozioma kwuru na ihe na ewute ya na nsogbu a ọ na-enwe bu "mgbe ọbula m lere ụmụaka ibe m ka ha na-egwu egwu, obi na-agbawa m".

Ozioma kọọrọ anyị na o nwere mgbe ike ịgba ọgwụ gwụrụ ya maka ọnụ ahụ na-afụ ya ụfụ o were jụọ nna ya otu ụbọchi sị "oge o rubeghị mgbe ọrịa a na-enye m nsogbu ga-ala?"

Nne ozioma si Plateau steeti gwara BBC na ihe mere Ozioma anaghị eso ụmụaka ibe ya egwu egwu bu na o merụọ ahụ, ọ ga-ara ahụ tupu ọ laa.

Enwere olileanya na onye nwere ọrịa shuga ga-emecha nwere onwe ya?

Dọkịnta Nnamdi Anikpo na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital Ebonyi steeti
Nkọwa foto, Dọkịnta Nnamdi Anikpo na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital Ebonyi steeti

Dọkịnta Nnamdi Anikpo na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital Ebonyi steeti na-ahụ maka ọria umuaka (Endocrinology) kwenyere na onye nne na nna ya enweghị ọrịa shuga n'agbụrụ ha nwereike ịrịa ọria shuga.

Ọ kọwara na ọ bụrụ na ihe na-enye aka ka shuga na-ebelata n'ahụ ma na-agazu mmadụ ahụ bụ Insulin arụghị ọrụ dịka o kwesịrị, ọ ga-eme ka mmadụ nwee ọria shuga.

Ọnụọgụgụ ka ọria shuga si agazu mba nile

Ọnụ ụzọ ụlọọwgụ Ebonyi State University Teaching Hospital ebe dọkịnta Nnamdi Anikpo na-arụ ọrụ.
Nkọwa foto, Ọnụ ụzọ ụlọọwgụ Ebonyi State University Teaching Hospital ebe dọkịnta Nnamdi Anikpo na-arụ ọrụ.

Site na nnyocha ndị na-ahụ maka mgbasaozi na nkwalite ndị nwere ọrịa shuga na mba nile a kpọrọ International Diabetes Federation mere, mmadụ ruru nde 589 nwere ọrịa shuga na mba nile.

Ha gara n'ihu kwuo na ọ ga-arịgo ruo ihe dịka nde 853 n'afọ 2050.

Site na nnyocha ndị na-ahụ maka ahụike bụ Novo Nordisk mere, Naịjirịa nwere ndị okenye karịrị nde 3.6 nwere ọrịa shuga.