Ọ bụghị eziokwu na ndị mmadụ na-ebe mkpịsị ụkwụ ha ere $40,000 na Zimbabwe

Ụkwụ mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Otu kepukepu na-efegharị na Naijiria bụ na ụbịam emeela ka ndị Zimbabwe na-erezi mkpịsịụkwụ ha ihe ruru puku dọla iri anọ ($40,000).

Ngalaba 'BBC Disinformation Unit' nyochara akụkọ ahụ nke otu ọba ozi Zimbabwe bụ Gambakwe wepụtara n'ịntanet.

N'akụkọ ha wepụtara n'abalị 28 nke ọnwa Mee afọ, 2022, Gambakwe dere sị, “ndị dibia ndị Saụt Afrika a kpọrọ 'sangoma' na-akwụ ndị ntorobia Harare akatamkpo ego maka mkpịsịụkwụ ha."

Sangoma bụ ndịbịa maọbụ onye na-agba afa n'asụọ̀ụ Zulu.

Ọbaozi ahụ kwuru na ozi ahụ si na ọbaozi Whatsapp na-efegharị na social midia mba Zimbabwe.

Ahịa ịgba mgbere mkpịsị ụkwụ, dịka Gambakwe si kwuo, na-eme n'ọdọahịa Ximex Mall' dị na Harare, isiobodo, Zimbabwe.

Akụkọ a efesaala na mba dị iche iche n'Africa dịka ndị Yuganda na ndị Naijiria na-eke ozi maka ya na Twitter.

Otu onye si Kampala, dị na mbaYuganda nwere mmadụ 6,881 na-eso ya ji akara @joyie7star kee otu akụkọ ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Na Naijiria, otu akụkọ ahụ nke @InnocentZikky kere nwere ndị kegharịrị ya ugboro 2,668 mana o mechara ria rue 4731 n'awa 18

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

N'akụkọ nke a, e ji foto nke ọba akụkọ Gambakwe ji depụta nke ha were kọọ ya.

Foto ndị ahụ bụ nke ọtụtụ ndị na-eke ya na social midia ji ekesa ya.

Ụlọọrụ redio mba Kenya bụ 933 KFM kekwara otu akụkọ ahụ n'akara Twitter ha na-ajụ ndị na-eso ha kedụ akụkụ ahụ ha ga-amasị ha ire.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Akwụkwọ akụkọ mba Zimbabwe a kpọrọ 'H-Metro' wepụtara ozi na Twitter nke na- ekwu na ha na ndị na-azụ ahịa n'ọdọahịa 'Ximex Mall' nwere mkparịtaụka ha kwuo na ndị ha amaghị na-abịa na-ajụ ha etu ha ga-esi rite elele na mgbere ahụ.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4

Ụfọdụ ndị ahịa gwara H-Metro na ha gwara ndị kpọtụrụ ha na ọ bụ "asịrị".

BBC Disinformation Unit lekwara ihe onyonyo abụọ, bụ ndị a sị rere mkpịsịụkwụ ha maọbụ na-achọ ire mkpịsịụkwụ ha, were hụ na ihe onyonyo ndị a bụ akpụrụ akpụ, ya bụ ha ma ụma hazie onyonyo ndị ahụ ka ọ dịka a na-eme ihe e kwuru mere.

N'otu ihe onyonyo, otu nwoke jikọrọ mkpịsịụkwụ ya , were 'plaster' machie ya ka ọ dị ka ihe e bere ebe.

N'ihe onyonyo ọzọ, e gosiri otu nwoke nọ ka a chọrọ ibepụ mkpịsịụkwụ ya mana o nweghị ihe gosiri na nke a na-eme n'ezie, dịka nwoke ahụ a chọọ ibepụ ụkwụ ya nọ na-achị ọchị.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 5

Akụkọ yiri akụkọ ndị ọzọ na-ekwu na-eji akụkụ ahụ ndị mmadụ agwọ ọkwụ ego nke wuorola n'akụkụ Afrịka dị iche iche n'oge gara aga.

Mana ụfọd̄ụ akụkọ na-ewu nwere ka o si emetụta ndụ ndị mmadụ n'ezie. dịka ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ya ma malite na-etinye ya n'ọrụ.

Na Janụwarị afọ 2022, a nwụchiri ụmụaka abụọ na-etolite etolite na otu enyị ha gbara afọ 20 maka ebubo igbu enyi ha nwaanyị maka ịgwọ ọgwụ ego na Naiijria.(https://www.bbc.com/pidgin/tori-60182632).

Otu n'ime ndị ahụ a na-enyo enyo kwuru na ọ bụ ihe ya na-agụ na soshal midia kwanyere ya. (https://punchng.com/i-learnt-how-to-do-money-rituals-through-facebook-says-ogun-teenager-who-killed-lover/)

Na mba Malawi, a na-atụ anya na n'abalị 27 nke ọnwa Juun afọ 2022, ụlọikpe ga-ebi ikpe banyere mmadụ ise maka ogbugbu otu nwioke bụ anyarị n'abalị 27 nke ọnwa Juun afọ 2018.

Ogbugbu ndị anyarị na mba Malawi gbadoro ụkwụ na nkwenye na-eji ha agwọ ọgwụ ego maọbụ inweta ihu ọma.