Ihe L na R adịghị m mfe ime n'ihe onyonyo 'A Tribe called Judah' - Uzor Arukwe

Ebe foto si, Uzor Arukwe/Instagram
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo na Okechukwu Omeire
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
- Ebeg o si, Lagos
Uzor Arukwe bụ omeiheonyonyo a ma na Nollywood.
O malitere iwu nsonso a maka ihe onyonyo tiwara sleeti bụrụ onyonyo kachasị rite ego otu ijeri naira na Naijiria bụ 'A tribe called Judah' nke o so na ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara etu obi si dị ya maka ihe onyonyo ahụ.
Arukwe kwuru na ọ maghị na ihe onyonyo ahụ ga-eme ọfụma etu o si me ma kwuo na onye haziri ya bụ ejije bụ Funke Akindele bụkwa omeiheonyonyo ọzọ a ma ama kwenyesiri ike na ọ ga-eme ọfụma.
"A maghị m na ọ ga-eme ọfụma etu a, obi dị m aṅụrị" ka o kwuru.
O kwukwara etu o si bido ije ime ejije ya nakwa uru na ọghọm dị na ya.
"O teela aka m na-eme ejije, ihe dịka afọ iri abụọ. M bidoro mgbe m dị obere site n'ịgba egwu" ka o kwukwara.
Uzor Arukwe alụọla nwaanyị? Ọ zara anyị.
Mana ị ga-eji aka gị chọpụta ihe ọ zara n'ime ihe onyonyo a.
Gee ntị ka ị nụ ihe ndị o kwuru n'uju.




