Incest: Gịnị bụ arụ ibe nne na ihe mere Igbo na sayensị jiri sọọ ya nsọ?

Ị bụ onye Igbo mana ị nụtụbeghi okwu a bụ 'arụ ibe nne' ?

O nwere ike ọ bụrụ na a mụrụ gị na mba maọbụ na nne na nna gị gwara gị na ị bụ onye Igbo maọbụ na ị bụ nnọọ onye Igbo na-amaghị ihe a na-akpọ ya n'Igbo, nwanne dere jụụ, o nweghi ihe mere gị.

Ọ bụghị naanị gị kwụ. Ma mụ onwe m na-ede ihe a amabụghị ihe a na-akpọ 'arụ ibe nne'.

Mana a jụọ ma ị makwa ihe bụ 'incest' n'olu ndị iti, onye ọbụla ga-eweli aka maka na anyị niile abụrụla ndị Igbo Bekee.

Arụ ibe nne pụtara 'incest' na Bekee, nnọọ!

Gịnị bụ arụ ibe nne?

"Naanị mkpi bụ anụ rụchara ala bee nne ya". Nke a bụ okwu Maazị Nnabuife bụ onye ọkachamara n'okwu agụmagụ na omenaala Igbo na mahadum legọs bụ onye BBC igbo kpọrọ ka ọ kọwaa okwu a.

O kwuru na arụ ibe nne gụnyere mmekọ aramara ọbụla mere n'etiti nwanne otu nne na otu nna, nwanne otu nna na-abụghị otu nne, nwanne otu nne na-abụghị otu nna, nne na nwa maọbụ nna na nwa .

N'akụkụ nke ya, Nze Duruagwụ gwara anyị na arụ a gụnyekwara mmekọ aramara dị n'etiti otu ọbara, otu ezi, otu agbụrụ dgz. O kwuru na ụmụnne ekwesighi inwe mmekọ aramara ma ọbụrụ na ha erughi agbụrụ isii n'etiti ha.

O kwukwara na o nwere obodo ndị anaghị alụkọ onwe ha maka na omenala kwenyere na ha bụ ụmụnne.

Ihe Igbo na-akpọ ụdịrị mmekọ ahụ bụ ibe nne. Onye ọbụla nọ n'ime ọgbakọ a nwere ụdịrị mmekọ a, Igbo na-ahụta ya na ha emeela arụ megide ala, ya bụ 'arụ ibe nne.'

Mana nke bụ eziokwu bụ na ọ bụghị naanị ndị igbo na-ahụta ya ka ihe ọjọọ.

Gịnị kpatara e ji ebe nne?

Ụfọdụ agbụrụ dị icheiche ọkachasị na mpaghara Yurope, ndị eze na ndị ọchịchị oge ahụ jiri ibe nne echekwa ọbara ha ka ọ bụrụ ọbara eze na ọbara na-enweghi ntụpọ si n'agbụrụ ha kpọrọ ndị atịtị.

Ya mere ha ji ekwe ka ụmụnne lụkọọ onwe ha mụta nwa, ụmụnna lụkọọ onwe ha na ụdịrị nlụkọ dị icheiche ha mere iji hụ na e metọghị ọbara ezinaụlọ ha nakwa ịgba mbọ hụ n'ọbara eze ahụ dịịrị gaba n'ime ezinaụlọ ha.

Ọ rụrụ ọrụ?

Hmm! ọ bụrụ na ị na-ekwu maka ime ka ọchịchị dịgide n'ezinaụlọ ha, ị ga-asị na ọ rụrụ ọrụ mana ime ka ọbara ha ghara inwe ntụpọ, amaghịkwa ma maka na e kwuru na ọbara ha kachazi nwee ntụpọ.

Ibe nne na ihe sayensị kwuru maka ya

Omenala dị icheiche na mpaghara ụwa niile na-ahụtakwa ibe nne dịka ihe ọjọọ na ihe na-ekwesighi omume cha cha, ihe a na-ekpuchi ntị ma anụ ya.

Mana ihe ọbụla sayensị kpọrọ ihe ọjọọ, ị mata na ezigbo nsogbu dị na ya.

Sayensị katọrọ ibe nne maọbụ mmekọ n'etiti ụmụnne na-erughi agbụrụ isii, ihe ha kpọrọ ya bụ 'in breeding'. Ihe m ji kwuo ụmụnne bụ maka na mmadụ niile nọ n'ụwa bụ ụmụnne, anyị niile sitere n'otu mmadụ dịka agụmagụ siri kwuo. Mana tupu i nwee mmekọ, ọ ga-abụrụrị n'etiti onye na-abụghị agbụrụ gị nke mbụ, abụọ, atọ, anọ maọbụ ise.

Nchọpụta sayensi gosiri na ibe nne maọbụ 'in breeding' egosila na ọ na-ebute ọtụtụ ihe dị icheiche dịka ọrịa. Nke a bụ maka akụrụngwa dị n'ime ọbara mmadụ a kpọrọ DNA nke ga-eme na mmadụ na nwanne ya otu nne na otu nna nwee mmekọ, ha mụọ nwa si na mmekọ ahụ, nwa ahụ nwere ikike ibute ọrịa dị njọ ruo pasentị 50 nakwa ihe ndị ọzọ nwereike iso ya. Ya bụ na ndụmọdụ ndị sayensị bụ na ị chọrọ ịlụ nwaanyị maọbụ ime ọyị, nwanne chọrọ onye na-esighi n'agbụrụ nne gị maọbụ nna dị nso gaa lụọ.

Onye a mụrụ site n'ibe nne

Ọtụtụ ihe ka agụmagụ kwuru mere ụfọdụ ndị a mụrụ site n'ụdị mmekọ ahụ. Ịmaatụ n'ụlọ Hamsburg na mba Spen ebe a mụrụ Eze Charles II nke Spen n'afọ 1661.

Nne ya bụ nwa nwanne nna ya ebe nne ya ochie bụkwa nwanne nna ya, ọ na-agbagwoju anya na nghọta. Eze Charles II nwere ọtụtụ ọrịa o si n'afọ buru pụta ụwa dịka: o kwughi okwu ruo afọ anọ, ọ gaghị ije ruo afọ asatọ ma agba ya adịghị mma mere na ọ naghị atali ihe.

O mechara ara agbaa ya nke mere o ji nye iwu ka a bọpụta ozu ndị ezinaụlọ ya niile nwụrụ anwụ ka ọ na-ekiri ha.

Ọ dịrị ndụ naanị afọ 38 ma ndị nyochara ahụ ya oge ọ nwụrụ kwuru na o nweghi kama otu mkpụrụ ọbara dị ya n'ahụ oge ọ nwụrụ, mkpụrụ obi ya dị ntakịrị ka mkpụrụ ọka, akụrụ ya emebiela, eriri afọ ya emebiela, isi ya bụ mmiri juru ya ma nke ka njọ bụ na o nwere naanị otu mkpụrụ amụ.

Ọzọ dịka ibe ya bụ na otu nwantakịrị na mba ofesi kpụpụrụ nne na nna ya ụlọikpe oge ọ chọpụtara na ha abọ bụ ụmụnne we mụta ya maka ọrịa niile ọ na-arịa.

Nyocha egosila na ibe nne na-ebute nsogbu a na-ahụ anya n'ahụ nakwa nke ụbụrụ isi.

Gịnị ka Igbo kwenyere arụ ibe nne na-ebute?

Sayensị katọrọ ibe nne, Igbo katọkwa ibe nne ma kpọọ ya arụ.

Maka gịnị?Nze Duruagwụ kwuru na ya amaghị ihe Igbo jiri kpọọ ibe nne arụ mana ya mara na ọ na-ebute ihe dị icheiche n'etiti ndị na-eme ya. Ọ kpụpụtara ụzọ ihe ise nwere ike ime onye na-ebe nne:

1. Ọ na-ebute mkpọbi ụkwụ

2. Ọ na-ebute agaghị n'ihu

3. Ọ na-ebute ọgbata uhie

4. Ọ na-ebute ụchụ

5. O nwerei ke ibute ọnwụ ike

Ọnwụ ike kwa, ha! Ihe a abụghịkwa ihe ọchị.

Gịnị ka a na-eme onye kpara arụ ibe nne?

Nze Duruagwu kwuru na obodo dị icheiche nwere omenala dị icheiche bụ etu ha si eme gbasara onye metọrọ ala site na ibe nne maọbụ nwanne idina nwanne ya.

O kwuru na ndị obodo na-eme otu n'ime ihe ndị a:

1. Ikpụ arụ: Nke a bụ emume ihicha ala. Ihe ndị e ji ehicha ala dị icheiche site n'obodo gaa n'obodo. Maazị nnabuihe kwuru na ụfọdụ na-eji mkpi, akwa na ihe ndị ọzọ jiri gaa n'arụsị iji hichaa ala.

2. Ịzụ ahịa: Ụfọdụ na-akpụrụ ndị ahụ kpụpụ ha n'ahịa obodo mee ha ihe akaja na ihe ihere maka na ha emechuola obodo ihu.

3. Nchụpụ n'obodo: Ụfọdụ obodo anaghị anabata arụ ahụ chacha nke ga-eme na onye ọbụla ha jidere, ha ga-achụpụ ya achụpụ kpam kpam n'obodo.

4. Idepụ ndị ahụ: Nke a dịkwa ka ibe ya, idepụ ha na ha esoghizi n'obodo ahụ.

Onye bee nne n'Igbo, kedụ ihe ọ ga-eme?

Igbo kwenyere na ihe onye amaghị, anaghị egbu ya. Otu ihe bụ ibe nne na-amaghị ama.

Mmadụ nwere ike zute onye masịrị ya na mba ha amalite inwe mmekọ mana ha amaghị na ha bụ ụmụnne.

N'ụdị ịmaatụ a, Mazzị Nnabuihe na Nze Duruagwụ kwenyere na ha amaghị ama mana ngwa ngwa ha chọpụtara, ha kwesiri ịkwụsị ya ozugbo gaa kpụo arụ.

Mana nke ka njọ bụ ndị hiri asaa n'anya kpachara anya mara na ha bụ ụmụnne maọbụ na agbụrụ ha dị nso ma gaa n'ihu na-enwe mmekọ.

Nke ahụ bụ arụ megidere ala niile n'ala Igbo n'olu Nnabuihe.

Gịnịkwanụ ka a ga-eme?

Ha abụọ kwetara na a ga-akpụ rịrị arụ.

Onye e jidere maọbụ chọpụta ga-akpụ arụ maọbụ hichaa ala.

Nke a bụ maka na arụ ibe nne anaghị akwụsị ma onye ahụ nwụọ, ọ ga-esokwa ahụ lọọ ụwa, ya bụ na ịkpụ arụ maọbụ ihicha ala ga-eme ka onye mere ụdịrị ihe ahụ nwere onwe ya.

Anyị jụrụ Nnabuihe gbasara onye na-ekwenyeghi n'omenala, ihe ọ sara bụ; "ala Igbo dị tupu ụka abịa. Ụka erubeghi afọ narị ise mana Igbo eruola afọ puku iri"

Ọ bụrụ na ị ghọtaghị ya, hapụzie ya.

Onye chọọ ime enyi maọbụ ịlụ di na nwaanyị, jiri nwayọọ chọrọ onye na-abụghị ọbara gị maka na ihe so ya ka nkụ.

Ọ bụrụ na ị gbalarị akụkụ omenala, i nwekwara ike, ị gaghị agbalarị akụkụ sayensi, belụsọ ma ọ bụ na nwa agaghị apụta na ya.