Igbo currencies: Ego ayọrọ na ụdị ego ndị ọzọ Igbo ji zụọ ahịa oge gboo

Igbo currencies: Ego ayọrọ na ụdị ego ndị ọzọ Igbo ji zụọ ahịa oge gboo
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Ọ bụghị taa ka ukwu dịwara n'azụ, ndị Igbo bụ agbụrụ a na-ahụkarị ma mpaghara Ọwụwa Naijiria bụ agbụrụ e ji azụmahịa na ịchụ nta ego mara ọbụladị oge ụwa nọ n'isi tupu ndị ọcha abịa. Ha ji ego ndị a azụ ngwahịa, lụọ nwaanyị, chie echichi maọbụ mee akwamozu.

Lee ụfọdụ ego maọbụ ihe ndị Igbo ji eme azụmahịa maọbụ mgbere n'oge ochie:

1. Ego ayọrọ

Ego ayọrọ bụ okpokoro eju mmiri na amụke amuke nke Igbo si mere ego oge gboo.

Ọ bụ na mmiri ka ena mmiri ka esi nweta ya. Akụkọ kwuru na ọ bụghị nani iji ya azụrịta onwe ha ahịa ka ndị Igbo ji ego ayọrọ mee , ha na ndị agbataobi ha jikwa ya azụrịta ahịa, alụ nwaanyị nakwa eme ihe ndị ọzọ. Igbo jikwara ego ayọrọ zụọ ahịa ha na ndị ọcha oge ndị Bekee malite bịawa ikpere mmiri Ọdịda Anyanwụ Afrịka azụmahịa. Okenye Igbo mabụ®ụkwa onye okwu ihe mere oge ochie doro anya bụ Nze Duruagwu Ukaejuoha, kọwara na ego ayọrọ “ bụ ndị dimkpa na-enwe ya. Ọ bụ ego ndị Igbo ji zụọ ahịa”.

2. Okpogho

 Ị nụtụla, " Nnaa, okpoghọ adịghị m n'akpa?

Ikekwa, Ị ma ya dịka okwu ogbe ndị na-etolite etolite ji akọwa ego, mana ị ma na aha bụ aha ego ochie ma bụụkwa aha obodo?

Okpogho bụ aha obodo a ma ama n'Ezeagu Enugwu steeti maka ị bụ ebe e ji ọrụ igwe mara oge mgbe ochie.

Ihe ọzọ e ji mara ndị Okpogho bụ ikpụpụta ego a Igbo ji zụọ ahịa oge gboo a kpọrọ ;okpogho.

3. Manila

Manila bụ ego ndị Igbo si n'akụkụ Rivas steeti na-eji azụrịta ahịa.

Ha jikwa ya akwụ ụgwọ isi nwaanyị n'oge Jaja nke Opobo dị ndụ.

Nze Ukaejuoha kọwara na ọ bụ Bekee wetara Manila.

A na-eche na ọ bụ ego nke ndị nọ na mpaghara Afrịka ji gbaa mgbere oge gboo bụ nke ha nwetara na aka ndị Pọtụgiiz bụ ndị bịara na Ọdịda Anyanwụ Afrịka(West Africa)tupu ndị ọcha eweghara n'ike achịwa mpaghara ahụ.

Mana ụfọdụ ndị akụkọ mgbe ochie were anya na-ekwu na ọ dịla tupu Bekee abịa.

4. Nne Ego

Nze Ukaejuoha kọwara na "Ọ na-adịka ego ayọrọ mana ọ na-aka ego ayọrọ ebu ibu."

Dịka ego ego ayọrọ, ọ bụ na mmiri ka e si eweta nne ego.

5. Ego igwe/ ego kịrịkịrị

Ego ígwe nke Bekee kpọrọ 'coins' bụkwa ego ọzọ ndị Igbo ji zụọ ahịa oge gboo

Ọ bụrụ na i toro n'agbata afọ 1980 rue 1990, i nwere ike ị na-ahụ ụfọdụ ego kịrịkịrị a na-etunye n'isi ndị nwere dada.

Ego ahụ so na-ego Igbo ji zụọ ahịa mgbe gboo bụ ego nke Bekee wetara.

.

6. Ehi

Ọ bụghị nanaị ihe enweghị ndụ ka Igbo ji mee ego mgbe ochie, ha ji ihe ume dị n'ime kpọrọ ego.

Ehi so n'otu ihe ọzọ Igbo ji mere ego mabụụkwa ihe e ji amata aka ji akụ.

Nze Ukaejuoha kwuru na " A na-eji ehi azụ ahịa."

"onye ọbụla na-akpa ehi Igbo ,nwee ya ebe o buru ibu bụ nnukwu mmadụ ."

"I nwere ike nwee ọba ji buru ibu mana otu onye nwere otu ehi, otu ehi ahụ ga-aka ya."

" Ndị ọbụla kpaga ehi oge gboo bụ ndị a na-akwanyere ugwu n'ihi na ihe nile dị ehi na-ahụ bụ ihe eji azụ ahịa mabụụ ihe e ji ama na mmadụ bara ụba."

" Ihe dịka mpi ya, e mewe mmemme, mmadụ wepụta mpi ya, ọ na-abụ ihe a na-elele elele."

"Ọdụ ya e ji ya akwa ahịa, ndị ọzọ na-ejikwa ya."

"Akpụkọya bụ ihe eji achọ ụlọ mma mgbe ahụ."

"Isi ya, a na-ekpowe ya n'obi iji gosi na ị bụ dịmkpa, e tuwee gị 'ogbuehi'. A naghị akpọ ogbenye ogbuehi."

7. Ala

Igbo ji ala maọbụ ihe dị n'ime ya eme ihe ego.

Nze Ukaejuoha sịrị " A na-eji ala eme ego."

"E nwere ebe m ma mmadụ gwọrọ ezigbote ọgwụ, agbara naakụsi ndị mmadụ, ya achụlaa ya. E ji nnukwu ala buru ibu"

8. Mmadu

Nze Ukaejuoha kọwara E ji mmadụ akwụ ụgwọ , ma ọbụrụ na o nweghị ihe ndị e mereji ụgwọ enweghị ego ha ga-akwụ.

Iji maa atụ, Ukaejuoha kwuru sị, " Onye nwere nsogbu, dịka ọrịa, ndị ọnwụ ike, dịbịa rụọra ha ọrụ dịka nwaanyị ara na-agba, mgbe ụfọdụ ezinaụlọ ya enweghị ego ha ga-akwụ dibịa maka nke a, ha kpọrọ nwaanyị ahụ kpọnye ya si ya lụwa."

Ọ gara n'ihu kọwaaa, "Mana ọ bụghị na onye ahụ e ji kwụọ ụgwọ ahụ abụghị ohu n'ihi na ohu bụ onye a zụrụ n'ahịa."

" Ọzọ, obodo kuziri ndị be anyị egwu Ọkọnkọ bụ ndị ndị Umunobo, Nkwere. Abụ m onye Ụmụnaka Isu.

"N'ihi na o nweghị ụzọ ọbụla ndị be anyị ga-eji asị ndị Ụmụnọbo, 'ụnụ emela', anyị weere otu nwa anyị nwaanyị nye ha sị ha lụwa iji kelee ha maka egwu ahụ ha kuziri anyị. "

Ihe ndị ọzọ Igbo ji eme ego

Ọ bụghị nani ihe ndị a anyị gụp.ụtarala ka ndị mgbe ochie ji eme ego.

Ihe ndị ọzọ Igbo kpọrọ ego gụnyere:

  • Ọdụ
  • Ọlaedo
  • Ọla nchara
  • Nnu
  • Mmanya ọkụ
  • Ngwagha dịka egbe