Gịnị na-eme ụbụrụ anyị ma anyị nwụọ?

Onye nyocha na-ele nyocha MRI

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Margarita Rodríguez
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News Mundo

Jimo Borjigin bụ ọkachamara na ngalaba sayensị a kpọrọ 'Neuroscientist' kwuru na ọ bụ ihe ịtụ n’anya mgbe ọ chọpụtara na enweghị ihe anyị maa banyere ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ na-agbanyeghị na "ọnwụ bụ oku anyị niile ga-aza".

Nghọta ahụ pụtara ihe n’afọ iri gara aga dịka "ihe mberede".

Ọ gwara BBC Mundo na "Anyị nọ na-eme nwale ma na-enyocha ihe nzuzo na-eme n'ụbụrụ”

Ka oke abụọ n’ime ha nwụrụ, o nyere ya ohere ịhụ usoro ọnwụ nke ụbụrụ ha.

"Otu n'ime oke ahụ gosipụtara oke serotonin. Oke ahụ ọ nọ na-arọ nrọ?” Ọ kọwara, sị: “E nwere ihe njịkọ dị n’etiti serotonin na nhụsianya.

“A malitere m ime nnyocha iji chọpụta nkọwa a. O juru m anya mgbe m chọpụtara na anyị amaghị ihe gbasara usoro ịnwụ anwụ.”

Kemgbe ahụ, Dọkịta Borjigin, onye bụ osote ọkammụta na ngalaba 'molecular and integrative physiology and neurology' na Mahadum Michigan, etinyela onwe ya n'ịmụ ihe na-eme n'ụbụrụ mgbe mmadụ na-anwụ.

Ihe ọ chọpụtara megidere ihe e chere.

Nkọwa ọnwụ

Ngosipụta ụbụrụ na obi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ngosipụta ụbụrụ na obi

Ọ na-akọwa na ruo ogologo oge, ọ bụrụ na obi mmadụ kwụsịrị ịrụ ọrụ, a ga-akọwa ya dị ka onye nwụrụ anwụ n'ụlọọgwụ.

Mgbe nke a mere, a na-elekwasị anya n'obi: "A na-akpọ ya ‘cardiac arrest’, ma ọ dịghị mgbe e ji elebanye anya n’ụbụrụ.

"Nghọta sayensị kwuru na ụbụrụ dịka ọ naghị arụ ọrụ: onye ahụ enweghị ike ikwu okwu, enweghị ike iguzo ọtọ, enweghị ike ịnọdụ ala."

Ụbụrụ chọrọ nnukwu ikuku iji rụọ ọrụ. Ọ bụrụ na obi anaghị ekesa ọbara, ikuku adịghị eru ya.

"Ya mere, ihe niile a na-egosi bụ na ụbụrụ anaghịzi arụ ọrụ,"

Na-agbanyeghị, nyocha nke otu ya na-egosi ihe dị iche.

Ụbụrụ na-arụsi ọrụ ike

N'ime ọmụmụ e mere n’afọ 2013 gbasara oke, ha hụrụ ọrụ siri ike n'ọtụtụ 'neurotransmitters' mgbe obi anụmanụ kwụsịrị ịrụ ọrụ.

Akụrụngwa Serotonin gbagoro ruo 60, ebe dopamine nke bụ ihe na-eme ka ahụ dị gị mma, mụbara nke ukwuu, site 40 ruo 60.

"Na norepinephrine, nke na-eme ka ị mụrụ anya, mụbara ihe dị ka otu narị (100)."

O kwuru na enweghị ike ịhụ ihe dị elu dị etu ahụ mgbe anụmanụ ahụ dị ndụ.

N'afọ 2015, ndị otu ahụ bipụtara ihe ọmụmụ ọzọ gbasara ụbụrụ ụmụ oke na-anwụ anwụ.

"N'okwu abụọ ahụ, pasentị 100% nke anụmanụ gosipụtara nnukwu ọrụ ụbụrụ na-arụ ọrụ."

"Ụbụrụ dị n'ọnọdụ 'hyperdrive', ọ na-arụsi ọrụ ike."

Ikuku Gamma

ngosipụta neurons

Ebe foto si, Getty Images

N'afọ 2023, ha bipụtara akwụkwọ nyocha maka ndị ọrịa anọ nọ n'ọnụ ọnwụ a kpọrọ 'coma' na nkwado ndụ, ndị e tinyere 'electroencephalography electrodes' nke na-enyocha ọrụ ụbụrụ.

Mmadụ anọ ahụ nọ na-anwụ. Ndị dọkịta na ezinaụlọ ha gbakọtara wee “kwere na ha enweghị ihe a ga-eme iji nyere ha aka, yabụ ha kpebiri ịhapụ ha ka ha nwụọ”.

Site n'ikike sitere n'aka ndị ezinaụlọ ha, agbanyụrụ ikuku na-edobe ha ndụ.

Ndị nchọpụta ahụ chọpụtaziri na mmadụ abụọ n'ime ndị ọrịa ahụ nwere ụbụrụ na-arụ ọrụ nke ọma, nke na-egosi ọrụ ọgụgụ isi.

A chọpụtakwara ikuku Gamma -. ikuku Gamma na-etinye aka na nhazi ozi na ebe nchekwa dị mgbagwoju anya.

Otu n'ime ndị ọrịa ahụ nwere nnukwu ọrụ na n'akụkụ abụọ nke ụbụrụ ya.

Dọkịta Borjigin na-arụtụ aka na temporoparietal dị oke mkpa.

"Ọtụtụ ndị ọrịa na-alanarị obi ịkwụsi ịrụ ọrụ [ma nwee] ahụmahụ dị nso ọnwụ (NDE) na-ekwu na o mere ka ha bụrụ ezigbo mmadụ, na ha nwere ike inwe mmetụta ọmịiko n'ebe ndị ọzọ nọ."

Ị nọ ọnwụ nso

Ngosipụta ihe na-eme n'ahụ mmadụ.

Ebe foto si, Getty Images

Ụfọdụ ndị gafeworo NDE na-ekwu na ha hụrụ ọnwụ.

Ọtụtụ ndị kwuru na ha hụrụ oke ọkụ siri ike ma ndị ọzọ na-akọwa na ha hụrụ ihe ndị na-esighị n'ahụ ahụ.

Dọkịta Borjigin o nwere ike ị kowaa na ụbụrụ ahụ ọ hụrụ na ọmụmụ ihe ya nwere ike ịkọwa ihe mere ụfọdụ ha?

"Ee, e chere m na ọ na-eme," ka ọ na-ekwu.

"Ihe ruru pasent 20% -25% nke ndị lanarịrị obi ịkwusiri ịrụ ọrụ na-akọ na ha hụrụ ọkụ, nke na-egosi na cortex visual na-arụ ọrụ."

N'ihe banyere ndị ọrịa abụọ ahụ bụ ndị a hụrụ ọrụ ụbụrụ ha mgbe agbanyụrụ ihe ha ji eku ume, onye nchọpụta ahụ kwuru na cortices ha (nke na-akwado ịhụụ ihe) gosipụtara ọrụ siri ike "nke nwere ike jikọta ya na ihe ha na-ahụ".

Nghọta ọhụrụ

Dọkịta Jimo Borjigin yi uwe ọrụ ya

Ebe foto si, UNIVERSITY OF MICHIGAN

Nkọwa foto, Dọkịta Jimo Borjigin na-ekuzi na mahadum Michigan ebe ọ bụ onyeisi mpaghara na-emenyocha lab.

Dọkịta Borjigin kwetara na ihe ọmụmụ ya pere mpe mpe nakwa na a chọkwuru nnyocha banyere ihe na-eme n’ụbụrụ mgbe anyị na-anwụ.

Otú ọ dị, ka e mesịrị nnyocha ihe karịrị afọ 10 n’akụkụ a, e nwere otu ihe doro ya anya: “Ụbụrụ na-emebiga ihe ókè mgbe obi mmadụ kwụsiri ịrụ ọrụ.”

Ma gịnị na-eme ụbụrụ mgbe ọ chọpụtara na ọ naghị enweta ikuku oxygen?

"Anyị na-agbalị ịghọta nke ahụ. N'ezie, ọ dịghị ihe a maara,".

"Ruo ugbu a, a na-eche na ụbụrụ enweghị ihe gbasara ya ma ọ bụrụ na obi kwusi ịrụ ọrụ: mgbe obi kwụsịrị, ụbụrụ na-adaba n'ọnwụ. Nke ahụ bụ echiche anyị ugbua: ụbụrụ enweghị ike ịnagide nke a.”

Ma, ọ na-ekwusi ike si na anyị amaghị ma ọ bụ eziokwu.

O kwenyere na ụbụrụ anaghị anọgide nwụọ. Dịka nzaghachi nye nsogbu ndị ọzọ, ọ na-alụ ọgụ.

Ọtụtụ ihe a ga-achọpụta

Dọkịta Borjigin kwuru na ihe ya na ndị otu ya chọtara n'ọmụmụ ihe ha dị naanị ntakarị maka e nwere ọtụtụ ihe a ka ga-achọpụta:

Ekwenyere m na ụbụrụ nwere usoro dị iche iche iji nagide hypoxia [mgbe ọ na-enweghị ikuku oxygen] nke anyị anaghị aghọta.

"Ugbua ajụjụ bụ: gịnị kpatara ụbụrụ na-anwụ anwụ ji arụ ọrụ?

"Anyị kwesịrị ịbịakọta ọnụ iji ghọta, ịmụ ihe, mee nyocha, mee chọpụta n'ihi na anyị nwere ike na-eme nchọpụta ọnwụ site n’ụzọ na-ezighị ezi maka ọtụtụ nde mmadụ, maka na anyị aghọtaghị usoro ọnwụ."