Peter Obi: Ihe mere o ji amụnye ndị ntorobịa ọkụ n'obi

Peter Obi

Ebe foto si, AFP

Otu nwoke bụ onye oji ego achụ ego a ma dịka onye anaghị emefu ego bụ Peter Obi apụtala ọha ka onye dị ike dịka Naịjirịa na-akwado ntuliaka na Febụwarị ọzọ na-abịa.

Ọ na-awụlite mmụọ ndị nwere mmasị ịtụ vootu site n'ozi ịchekwa akụnaụba nakwa ịkwụbaakaọtụ nke na-agbasasi ike site n'aka ndị nkwado ya na soshal midia.

Na mba ebe ọ dị ka ndị mmadụ a na-achọ onye nzọpụta ga-agbapụta ha n’aka nsogbu niile na-echere ha aka mgba, ndị ntorobia na-akwado Maazị Obi na soshal midia eburula okwu ya n’isi ma na-egosi ya (Obi) dịka onye nsọ ma na-akwado otu pati Labour Party nke ọtụtụ amaghị ama ma.

Nke a bụ na ha na-agbagido otu pati abụọ ndị nke ọzọ nwere agba azụ. Aha Obi na-ewukarị na soshal midia ugbua nke ihe kacha akpalite ya bụ okwu ndị nkwado ya na-ebupụta kwa ụbọchị.

Ọtụtụ n’ime ha na-eji foto Obi maọbụ foto akara njirimara pati ya were tinye dịka foto akara soshal mida ha. Ndị a bụ ndị ụmụntorobia chara ya ma bụrụkwa ndị isi na-acha ọkụ dịka ha na-akpọ onwe ha 'ọgbara ndị isi aki' nke pụtara na ha anaghị atụ onye ọbụla egwu ọkachasị n’ikwu uche ha maọbụ ime ihe sọrọ ha.

Nke mere ọtụtụ n’ime ha anaghị atụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nke ọgbara ọchịị ụjọ n’ihi ha kwuru na ndị a emeghiri ha ihe ọbụla gbara ọkpụrụkpụ. Ọtụtụ n’ime ndị nkwado Obi nke gụnyere nwamadị Dayo Ekundayo bụ onye bi n’Owerri so mee ngagharịiwe nke EndSars e mere n’afọ abụọ gara aga

Ya bụ ngagharịiwe wuru ewu mere gọọmentị ji machie otu ndị uweojii ‘Sars’ na Naịjirịa maka etu ha siri jiri aka ike n’eso ndị nkiti.

Onye nkwado Peter Obi

Ebe foto si, DAYO EKUNDAYO

Ekundayo sonyela na ngagharị nkwado e meere Obi ma wepụtakwa ngwa ọrụ ya ọ jị nahaziri ụmụakwụkwọ atụmatụ achụmnta vootu dịka o si mee n'oge EndSars.

Ọtụtụ ndị nkwado pati People's Democratic Party (PDP ) na ndị nkiti kwetara na Obi ka ndị ọzọ pụtarala ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjịrịa mma mana amaghi ya n'ebe niile na Naịjirịa nke mere ha ji ddọọ ndị nso nso ya aka na ntị na ha nwereike ịda na ntuliaka ahụ.

Ha cheere na atụmatụ Obi na-ekposa atụmatụ ha iwepu otu All Progressives Congress (APC) n'ọchịchi dịka ha kwuru na nke a ga-ekewa vootu a ga-atụ.

Obi ekwuola kwa mgbe kwa mgbe na ọ naghị echu ya ụra ịbụ onyeisiala mana ọ gbanweela otu ndọrọndọrọ ya ugboro anọ.

O si n'otu PDP pụọ abalị ole na ole tupu ha ahọpụta Atiku Abubakar dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'aha ha.

Achụmnta vootu Atiku na Obi

Ebe foto si, AFP

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị na-akatọ ya na-ekwu na ọ pụrụ n'otu ahụ n'ihi na ọ ma na ọ gaghị emeri ma na o kwuru na ihe ndị na-eme n'otu PDP bụ ihe mere o ji hapụ patu ahụ ma banye otu Labour.

Ndị nso nso ya kwenyesiri ike na ọ bụ n'ihi na o kweghi enye ego aka azụ ka e ji kwapụ ya n'otu PDP.

Dịka Obi bụ onye okpukperechi Karịsti nke ụka Katọlịkn, ndị na-akatọ ya na-arụ aka na dịka amaghị ya ama na mpaghara ukwu Naịjirịa bụ ebe ọtụtụ bụ ndị okpukperechi alakụbụ, ha kwuru na nke a ga-emetụta ya n'ụzọ ọjọọ ebe ahụ, ọkachasị dịka vootu ndị mpaghara ugwu ga-adịrị ezigbo mkpa n'inweta mmerị.

Na mba ihe ruru ọkara ndị bi ebe ahụ bụ ndị okpukperechi Kraịst, ndị nso nso ya na-enwe olileanya na ọ ga-akwalite ọnọdụ mmeri ya n'ihi na ha achọghị onye okpukpere alakuba ọzọ dịka afọ asatọ gachara.

Ụfọdụ na-akwadokwa Obi maka agbụrụ o si na ya. Ndị Igbo so na agbụrụ atọ kachasị na Naịjirịa mana ha achịala naanị otu mgbe kemgbe Naịjirịa nwetara nnwereonwe ya n'afọ 1960.

Ndị OBIdients

N'agbenyeghị okwu gbasara nchekwa na mmefu ego gọọmentị ya mgbe ọ bụ aka na-achị Anambra steeti, ọchịchị ya ebe ahụ abụrụla ihe eji a ama atụ na achụmnta vootu ya.

Ndị nso nso ya na-ekwu na ọ wulitere agụmakwụkwọ ma kwụọ ụgwọ ọnwa n'oge - ụfọdụ obere ihe Gọvanọ ndị Naịjirịa ndị nke ọzọ na-agbahapụ

Ọ hapụkwara ọtụtụ ego n'ọbaego steeti ahụ mgbe ọ rituru n'ọkwa dịka afọ asatọ gachara.

Ndí na-eme ngaghariwe

Ebe foto si, Getty Images

Kama ọgbagwojuru Frances Ogbonnaya anya, onye bụ nwata akwụkwọ na Mahadum nke Anambra Steeti mgbe Peter Obi nọ n’ọchịchi etu ndị mmadụ si eto Obi ma na-ekwu na ọchịchị ya dị mma.

O kwuru sị "Gwam uru dị n'idokọ ego ebe agụụ na-agụ ndị mmadụ, gwam onye na-edokọ ego ebe enweghị ọtụtụ akụrụngwa obodo jị enyere ndị mmadụ aka?”.

Kama ọ bụ etu Obi siri dokọọ ego mere ọtụtụ ndị na-akpọ onwe ha “OBIdients” ji akwado ya.

Ụfọdụ n’ime ndị a ka a na-ebo ebubo ịmekpa ndị mmadụ ahụ n’ịntanetị maọbụ kpọo ha ndị na-achọghị ọganihu obodo ma ọ bụrụ na ha akwadoghị Obi na ntụliaka onyeisiala.

Obi jiri akara Twitter ya gwa ndị na-akwado ya ka ha jiri obi umelala na obi nwanne eso ya bụ okwu achụmnta vootu, kama enweghị mkpụrụ arịrịọ ya mụtara