You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọdịmma mụ na Davido abụghị maka ego - Cubana Chief Priest
Otimkpu a ma ama bụ Cubana Chief priest ekwuola ihe bụ uche ya n'etiti David na Chioma Adeleke.
O kwuru sị na Davido bụ ezi enyi ya na-alụ nwanne ya nwaanyị ma kwuo na ọ ji aha ya akwado ihe niile gbasara Chioma.
Paschal kọwara na ọ bụ ọtụtụ ihe gbasara azụmahịa jikọrọ ya na Davido nakwa na nwa amadi ahụ egosila ya ịhụnanya pụrụiche na mmekọ ha niile.
Ọ sịkwa na mmekọ ha abụo na-ewe ụfọdụ ndị ilo iwe mana o nweghi ihe o gbochiiri ya.
Cheta na otiegwu ahụ a ma dịka Davido mechara lụọ enyi ya nwaanyị bụ Chioma Rowland onye Imo steeti n'ụbọchị 25 nke ọnwa Juun.
Ndị gara ya bụ mmemme gụnyere aka chiburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo, Gọvanọ Osun steeti bụ rụkwa nwanne nna Davido bụ Ademola Adeleke, ogbo ya nke Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu, aka chiburu Akwa-Ibom Steeti bụ Emmanuel Udom, ojiegoachụego a ma ama bụ Obinna Iyiegbu a ma dịka 'Obi Cubana'.
Lee ihe o kwuru n'uju ebe a.
Agbamakwụkwọ Davido na Chioma: Ihe na-akpọtụ dịka Chivido chakere taa
Ọ chajuola dịka otiegwu a ma ama bụ David Adeleke a ma ama dịka Davido na nwa ada Chioma Rowland ga-ejikọ aka agbamaọkwụkwọ taa bụ abalị 25 nke ọnwa Juun afọ 2024.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu; ndị ọchịchị, ndị a ma ama, ndị ihe ejije nakwa ndị eze ọdịnala gwụrụ n'ụlọ dịka ha tụrụ na Legos n'ehihie Tuzde maka mmemme ahụ kpọtụrụ.
Ha gụnyere aka chiburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo, Gọvanọ Osun steeti bụ rụkwa nwanne nna Davido bụ Ademola Adeleke, ogbo ya nke Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu, aka chiburu Akwa-Ibom Steeti bụ Emmanuel Udom, ojiegoachụego a ma ama bụ Obinna Iyiegbu a ma dịka 'Obi Cubana'. otimkpu a ma ama bu Okechukwu Paschal a ma dịka 'Cubana Chiefpriest'.
Ndị ọzọ gara ya bụ mmebe nke Ebuka Uchendu bụ onye nhazi(host) gụnyere eze ọdịnala ndị Ọdịda Anyanwụ; Oni nke Ife bụ Oba Adeyeye Ogunwusi, nwa onyeisiala Naijiria bụ Seyi Tinubu na Otiegwu King Sunny Ade.
Ụzụ agbamakwụkwọ Davido na Chioma malite iwu n'izu gara aga dịka ụkọchukwu Naijiria bi mba Briten tinyere ihe onyon kwupụtara na Davido na-akawdo ịgba akwụkwọ.
N' otu izu ahụ,o tiegwu ahụ wepụrụ n'ụlọikpe okwu ịzọta ikike ịkpọrọ nwa ya nwaanyị bụ Imade n'aka otu nwaanyị ọzọ mụrụ ya nwa bụ Sophia Momodu.
Etu ije Davido na Chioma siri malite
Akụkọ kwuru na Davido zutere nwunye ya bụ Chioma Rowland , onye Nkwere n'Imo steeti n'afọ na mahadum Babcock University ebe ha gakọrọ akwụkwọ.
Davido gara ịgwụ maka egwu , ebe Chioma na-agụ Economics.
Na mkparịtaụka o nyere Tayo Aina n'afọ 2023, Davido gbara ama sị, “Anọrọ m n'ụlọakwụkwọ otu afọ tupu m chakee. ọbụ etu ahụ ka m si zute nwunye m. Agaghị m echezọ ụbọchị m hụrụ ya."
“Anọ m n'ụgbọala Prado lee anya n'azụ hụ nwagbọghọ na-agaje, sị ka a kpọrọ yya.
A kpọrọ ya mana ọ zaghịm."
Mana o mechara bịa Legọs mụ na ya zute."
Mana ọ bụ ka Davido tipụtara egwu ọ kpọrọ 'Assurance' n'afọ 2018 ka ọha ụmụ Naijiria matara Chioma dika o jirinihu ya tipụta ihe onyonyo egwu ahụ.
Cheta na Ha kwadoburu ịgba akwụkwọ n'afọ 2020 mana ọrịa coronavirus kposara atụmatụ ha.
Ha mechaa see okwu nke pụtara ihe dịka ha kwụsiri iso onwe ha n'akara Instagram ha.