Kwụsị ịbo ndị Igbo ebubo maka ndị ugwu e gburu n'Uromi, Edo steeti – Ohanaeze Ndigbo

Sinetọ John Azuta Mbata bụ onyeisi Ohanaeze ndigbo

Ebe foto si, David Mbata/Facebook/screenshot

Nkọwa foto, Sinetọ John Azuta Mbata bụ onyeisi Ohanaeze ndigbo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu jịkọrọ ndị Igbo bụ Ohanaeze Ndigbo adọọla ndị okwu ụgha aka na ntị banyere mbọ ha na-agba ikonye mkpamkpa kpara n'Edo steeti n'isi ndi Igbo.

Akụkọ kwuru na ụmụntorobịa jidere ndị ugwu a sị na ha na-achụ nta ma gbaa ha ọkụ na ndụ maka na ha hụrụ egbe n'aka ha.

A sị na ndị ugwu ahụ si Pọtakọt na-aga ugwu mana n'oge ha ruru n'Edo steeti ka ndị nche ogbe kwụsịrị ha, mee ha nnyocha ma hụ egbe n'ụgbọala ha bụ nke mere igwe mmadụ jiri nwere iwe gbaa ha ọkụ.

Ọnọdụ nchekwa n'Uromi, n'Edo steeti tupuu e gbuo ndị ugwu ahụ

Gọvanọ Edo Steeti bụ Monday Okpebholo na ndị ọrụ nchekwa

Ebe foto si, Edo state government

Nkọwa foto, Gọvanọ Edo Steeti bụ Monday Okpebholo na ndị ọrụ nchekwa

Cheta na e nwere ndekọ dị icheiche maka ugboro ole na ole ndị jiegbe achụ ehi bụ ndi mpaghara ugwu Naịjirịa wakporo ọtụtụ ndị mmadụ n'ugbo ha n'Edo steeti.

Ọtụtụ ndị ahụ ndị na-achị ehi wakporo ka ha tinyere n'onọdụ ọdụ ndụ ọnwụ ka mma, ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ha mara elu n'ike ebe ndị ọzọ ka ha gburu egbu ma n'Edo steeti ma na mpaghara ndị ọzọ dịka Enugwu steeti.

Ọ bụ ọnọdụ dị etu a ka a sị na ọ nwereike ịbụ ihe kpatara ụmụ ntorobịa n'Edo steeti jiri hụ ndị ugwu jiegbe ma gbuo ha maka egwu na ha bụ ndị ahụ na-awakpo ndị obodo ha.

Ihe mere Ohanaeze jiri kwuo okwu

Ebe e gburu ndị ugwu jiegbe (a sị na ha bụ ndị nta) n'Uromi Edo steeti.

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Ebe e gburu ndị ugwu jiegbe (a sị na ha bụ ndị nta) n'Uromi Edo steeti.

Kemgbe mkpamkpa ahụ kpara n'Edo steeti, ọtụtụ ndị mmadụ ji akara soshal mịdịa ha ọkachasị na X were na-ekesasi ozi ga-eme ka ahụta ndị Igbo dịka ndị soro kpaa mkpamkpa ahụ.

Ohanaeze ndị Igbo katọrọ ebubo ụgha a ma dọọ aka na ntị na nke ahụ nwereike ịbụta nnukwu ọgbaaghara na Naịjirịa.

Ihe Ohanaeze Ndigbo kwuru

Sinetọ John Azuta Mbata bụ onyeisi Ohanaeze ndigbo

Ebe foto si, David Mbata/Facebook

Nkọwa foto, Sinetọ John Azuta Mbata bụ onyeisi Ohanaeze ndigbo
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ozi odeakwụkwọ Ohanaeze Ndigbo bụ Ezechi Chukwu zitere BBC IGBO, ha katọrọ etu e si gbuo ndị mmadụ n'Uromi dị n'Edo steeti ma gwa ndị ọrụ nchekwa ka ha mee ezigbo nnyocha maka ihe mere.

Ohaneze Ndigbo jiri ohere ahụ sị "n'aka ndị Igbo adịghị n'ogbugbu ụmụntorobịa Uromi gburu ndị ugwu n'Edo steeti".

N'okwu ha "Ohanaeze Ndigbo bụ nke Sinetọ John Azuta Mbata bụ onyeisi ya anụla ajọ akụkọ mere n'ụbọchị Tọzde Maachi 27, 2025 n'Uromi, n'Edo steeti bụ ebe e gburu ndị ugwu".

"Ohaneze akatọọla mkpamkpa a ma gwa ndị ọrụ nchekwa ka ha jide ndị kpara mkpamkpa ahụ ma mee ka e kpe ha ikpe".

"Ohaneze ji ohere ahụ katọọ ndị na-ebo ndị Igbo ebubo banyere ajọ ihe ahụ n'agbenyeghị na ọ bụ okwu asị. Ha makwara na-enweghị ihe gbasara ndị Igbo na mkpamkpa ahụ"

"Ohanaeze gwara ha ka ha kwụsị ikwu okwu ga-eme ka a wakpoo ndị Igbo ọkachasị ndị bi na mpaghara ugwu Naịjirịa maka na ọ ga ebuta nnukwu ọgbaaghara na Naịjirịa".

Ohanaeze gwara ndị Igbo niile "ka ha na-azụ ahịa ha, nọrọ ebe ọbụla ha nọ n'udo ma na-eme ihe iwu Naịjirịa kwadoro".

Ha jiri ohere ahụ zigara ezinaụlọ egburu ndị nke ha ozi ịtị aka n'obi ma na-akpọ oku ka e wetere ha ikpe ziri ezi.