China chọrọ iji ihe onyonyo Satelaịt TV erite mkpụrụobi ndị Afrịka

Igwe mgbasaozi Satelaịt
    • Onye dere ya, Shawn Yuan
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Global China Unit
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ka ndi ọchịchị na mba Afrịka na-eme ọgbakọ na Beijing maka nzụkọ China-Afrịka Sọmịt, onyeisiala mba China Xi Jinping were otu ihe ọ ga-eji mee ọnụ bụ Satalaịt Tv.

Ịhe dịka afọ itoolu garaaga ka Xi Jinping kwere nkwa nye ndị isiala mmba Afrịka n'ọgbakọ China-Africa Cooperation (FOCAC) ha merer na Johannesburg kwuo na China ga-etinye afere Satalait ruru 10,000 'ime obodo na mba Afrịka 23.

Ugbua a na-achọzị imechi ikesa efere Satalaịt ahụ ka ha ruru ọnụ ọgụgụ satalaịt ruru 8600.

Nkwa ahụ gbara ọkpụrụkpụ bụ nke e kwuoutara na ọgbakọ China-Afrịka bụ nke Gọọmenti China kwadoro ma tinye n'aka ndị ụlọrọrụ Startimes bụ ụlọọrụn nọ na Saụt Afrịka na-atụ mgbere.

Nke a bụ ihe ime obi ebere nakwa China igosi ike ha were na mpaghara ụwa dị oke mkpa.

Ka China na-enwe nsogbu n'akụnụba ha ma na-agbawe ka ha na Afrịka sị emeko, BBC gara n'obodo anọ ritara erere na afere Satalaịt China kesere n'ime obodo ịmara ka ọ mịtara ezi mkpụrụ.

N'obodo a na-akpọ Olasiti bụ ododo ga-enwe mmadụ awa atọ ị sị Nairobi gaa ka nwoke aha ya bụ Nicholas Nguku kpọkọtara ezinaụlọ ya nakwa ndị ọnyị ya ka ha kirie nwa Kenya sọ agbaọsọ na Paris Olympịịk e na-egosi na TV.

"Obi dị m aṅụrị ịkịrị Olympịịk bụ nke anyị enweghị ike ịrị afọ ole ma ole garaaga ruo mgbe anyị wetara StarTimes" Oge ọ na-ekwu okwu gbasara Startimes tinyere satalaịt n'afọ anọ garaaga.

Nicholas Nguku kpọkọrọ ezinaụlọ ya ka ha kirie egwuriegwu Paris Olympịịk na obodo ya dị na Nairobi.
Nkọwa foto, Nicholas Nguku kpọkọrọ ezinaụlọ ya ka ha kirie egwuriegwu Paris Olympịịk
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ bụghị naanị ya ritere erere na efere Satalaịt Tv StarTimes tinyere na mpaghara dị icheiche n'Afrịka. StarTimes bidoro itinye efere Satalaịt Tv n'afọ 2008, ugbua ha sọ na ndị kacha na ngaraba onyonyo nke dịjịta ma nwee ndị ruru mmadụ 16million nọ na onyonyo ha.

Ndị maara ihe ekwe na-akụ kwuru na ọnụ oge ha dị ala so mee ka ndị mmadụ na-etinyere ha.

Na Kenya ego a na-akwụ ha kwa ọnwa maka ịkịrị TV bidoro na 329 shillings ($2.50; £2) ruo 1,799 shillings ($14; £10.50).

Ọ bụlụ na ị tunyere ya na DStv, bụ nke ndị MultiChoice, bụkwa ndị amaama na Dịjịta TV n'Afrịka nke ọnụ ahịa ruru agbata 700 na10,500 shillings.

Dịka StarTim,es sị na-eweta ego n'aka ndị na-azụ ha ahịa kwa ọnwa, efere Satalaịt ahụ ruru 10,000 nke gọọmenti China kesere ka ndị South-South Assistance Fund na-afụ maka ya.

Efere Satalaịt TV ahụ e kesere nwere ọkọrọtọ ụlọ ngaraba mgbasaozi mba Kenya, nke China-Aid na nke StarTimes.

ọtụtụ obodo ebe e tinyere efere Tv ahụ chetere na oge e tinyere ha ihe onyonyo ahụ na a gwara ha na nke ahụ bụ "ihe efu" sị mba China.

Efere Satalaịt StarTimes e tinyere n'otu obodo n'ụlọ dị na Kenya
Nkọwa foto, Efere Satalaịt StarTimes e tinyere n'otu obodo n'ụlọ dị na Kenya

Dịka Dọkịnta Angela Lewis bụ onye degoro ọtụtụ ihe gbasara StarTimes kwuru na nke ahụ ga-eme ndị mmadụ jiri anya ọma na-ahụ mba China n'ime Afrịka.

Obodo niile etinyere efere satalaịtị ahụ wetara ihe niile eji etinye ya n'efu.

Lewis kwuru na nke a gbanwere ọtụtụ ihe n'ime obodo ndị ahụ ma nyere ha aka ima ihe na-eme n'ụwa karịa ihe na-eme na gburugburu ha.

Ihe dịka ụlọọgwụ, na ụlọakwụkwọ dị na Ainomoi dị na ọdịda anyanwụmba Kenya, adịghị akwụ ụgwọ ekiri ya.

StarTimes etinyere n'ụlọọgwụ na-enyere ndị ọrịa aka ha nwee ndịdị chere oge a ga-ahụ ha anya, ebe nke e tinyere n'ụlọakwụkwọ na-enye ụmụakwukwọ obi aṅụrị maka ọtụtụ n'ime ha na-ekiri onyonyo Katuun ma ha gbasa akwụkwọ.

Nwata-akwụkwọ bụ Ruth Chelang'at kwuru na "anyị mechaa ihe gbassara akwụkwọ, anyị na-ekiri Katuun. Ọ na enyere anyị aka ịdị na-emekota ma na-abịa onwe anyị nso.

Mana ọtụtụ ezinaulo BBC gbara ajuju ọnụ kwuru na nke ahụ StarTimes tinyere ha adịghị agwụụgwọ ekiri anọteghị aka tupuu ha akwụsị ya.

Na agbanyịghị na ọ dị ọnụ ala, ọ hịara ọtụtụ ezinaụlọ ahụ iji ego ha kwụọ ụgwọ ikiri StarTimes oge nke enyere ha n'efu kwụsịrị.

Nke a mere obi aṅụrị ha nwere na mbụ gbanwere ma mebie ebu m n'obi ịkpa ndị mmadụ obi ụtọ bụ nke ndị China choro ime.

Rose Chepkemoi sị mpaghara Chemori dị na Kericho mba ahụ kwuru na "Anyi niile nwere obi ụtọ oge mbụ enyere anyị efere Satalaịt, mana ka ọ gefere ọnwa ole ma ole, anyị ebido kwụwa ụgwọ". "Ego anyị na-akwụ dị nnukwu nke mere anyị ji kwụsị ikiri ya.”

Ndị na-ejighị ego ha ga-eji kwụọ nwere kirie Startimes kwa ọnwa kwuru na ọ bụ naanị onyonyo Kenya Broadcasting Cooperation ka ha na-ekiri.

Oge BBC gara hụ obodo anọ dị icheiche bụ ndị ritere erere bido n'afọ 2018 ruo afọ 2020, ọtụtụ ndị obodo ahụ kwuru na ha kwụsịrị ikdiri StarTimes oge ọ kwụsịrị ịbụ n'efu.

Eze ala Ainamoi kwuru na ọtụtụ ezinaụlọ n'ime mmadụ 25 enyere StarTimes n'efu kwụsịrị ịkịrị ya ma hara ịjị ego ha kwụọ ka ha nweike ikiri ya kwa ọnwa.

Ndị BBC kpọtụrụ StarTimes ka ha kọwaa maka etu ohere enyere ndị ahụ ikiri StarTimes n'efu sị kwụsị mana ha ekwụghị ihe ọbụla.

Ugwu na omenaala ndị China rukwara na ejije a na-eme na StarTimes. Ejije Kung Fu na Sino na-egosi naanị ihe gbasara mba China.

Ha tugharịrị ejije ndị China ruru 1000 n'asụsụ obodo dị icheiche. Na Kenya, StarTimes weputara ụlọọrụ onyonyo a kpọrọ ST Swahili na-eme ihe gbassara Swahili.

N'ime obodo ahụ niile kiriri StarTimes, ọtụtụ n'ime ha kwuru na onyonyo ahụ na-egosi China n'otu udi ma na-egosi ihe garaaga. Ha na-emekwa ọtụtụ ihe nkiri dịka Hello, Mr. Right nakwa bke China a kpọrọ If You Are the One.

Ngotiek sị na Olasiti dị na Ariana dị afọ ịrị na abụọ kwuru na ejiji a na-eme na StarTimes dị ka Eternal Love bụ nke a tughariri na bekee na-amasị ya. "Adaghịm arahụụra ma ọbụlụ na m ekirihị ya".

Egwuregwu bọọlụ na-ekpokọta ọtụtụ ndị mmadụ

Asambodo mgbasaozi StarTimes dị n'okporoụzọ na Nairobi na-ego ihe banyere asọmpi bọọlụ La Liga a kpọro "Feel the full thrill of La Liga"
Nkọwa foto, StarTimes na-achọ na-achọ inwete ndịahịa site n'ịgbasa ihe onyonyo asọmpi egwuregwu bọọlụ Spanish League

Egwuregwu so n'ihe kacha ekpokọta igwe mmadụ ọnụ. N'otu afọ mmadụ ruru ijeri abụọ kiriri 2023 Africa Cup of Nations (Afcon) dịka ndị Confederation of African Football sị kwuo.

StarTimes bụ ndi mara ịtụ mgbere na ohere dị na ya tinyere nnukwu ego zụta ikike igosi asọmpị dị icheiche dịka Afcon, La Liga ndị Spain na Bundesliga nka mba Germany.

Dọkịnta Lewis kwuru na "ọ bụ egwuregwu mere StarTimes jiri weta onwe ha na ngaraba ejije"

Mana akụkọ kwuru na SuperSports nke ndị MultiChoice na-akwụ $200m (£152m) kwa afọ maka ha igosi asọmpị English Premier League.

Oge Kyliam Mbappe bụ nwa mba France kwuru na ya ga-abanye Real Madrid, ndị StarTimes jị ohere ahụ rụọ nnukwu bọodụ eji ama ọkwa ma dee ya "Bịa kirie ụtọ dị na na La Liga" ma gbakwụnye ya njiri mara StarTimes.

Mana nke a adịghị onye obụla mma.

Levi Obonyo, bụ onye ọka mmụta na mahadum Daystar dị na Nairobi, Kenya kwuru na "ọ bụ English Premier League" ka ndị mmadụ na-ekiri.