Etu e si eme emume iri ji ọhụrụ n'Enugwu-Ukwu

Aha onyonyo, New Yam Festival: Lee etu emume iri ji ọhụrụ si adị n'Enugwu-ukwu
Etu e si eme emume iri ji ọhụrụ n'Enugwu-Ukwu

Ji bụ nri a kacha akwanyere ugwu n'ala Igbo.

Kwa afọ, obodo ọbụla n'ala Igbo na-ewepụta otu ụbọchị iji mee emume pụrụ iche tupu ha amalite iri ji ọhụrụ nke afọ ahụ.

Emume a na-adabakarị n'ime ọnwa nke asatọ maọbụ ọnwa nke itoolu, ya bụ Ọgọst maọbụ Sepụtemba.

BBC Igbo gara obodo Enugwu-ukwu dị n'Anambra steeti iji sonyere ha n'emume iri ji ọhụrụ nke afọ 2022, ka ha kọwaarọ anyị mpụtara omenala dị icheiche ha na-eme n'oge iri ji ọhụrụ.

Iri ji ọhụrụ
Akụkọ ọdịnala ga-amasị gị

Igwe Ralph Ekpe bụ eze ọdịnala nke obodo Enugwu-Ugwu ma bụrụkwa Igwe Umu Nri, kọwara na emume iri ji ọhụrụ bụ emume e ji ekele Chukwu.

Ọ kọwara na ọtụtụ mmadụ, ọ kachasị ndị na-ekpe okpukperechi Kraịst, na-ahụta ya dịka ịgọ arụsị, mana ọ bụghị ya.

"Ọ bụ emume anyị ji ekele Chukwu onye nyere anyị ji ka agụụ hapụ igbu anyị, ka anyị rekwaa ya n'ahịa wee hụ ego anyị ji egbo mkpa," Igwe Ekpe kwuru.

"Obodo dị icheiche nwere ihe ha na-akpọ ya, ụfọdụ na-akpọ ya emume ịwa ji, mana anyị bụ Enugwu-Ukwu na-akpọ ya iri ji."

Etu e si akwanyere ji ugwu n'omenala Igbo

Igwe Ralph Ekpe

Igwe Ralph Ekpe kọwara na ji nwere nkwanye ugwu pụrụ iche ndị Igbo na-akwanyere ya.

Ha gụnyere ndị a:

  • Mmadụ enweghị ike ịga bọpụta ji onye ọzọ kụnyere n'ala, ime otu a bụ nnukwu arụ
  • Izu ohi ji, ọ kachasị nke a kọnyere n'ala bụ nnukwu nsọala; ọ bụrụgodi onye agụụ na-agụ
  • Onye chiri echichi agaghị etinye ji n'ọnụ ya ma ọ bụrụ na emebeghị emume iri ji ọhụrụ
  • Ji mbụ ga-abanye Eze n'ọnụ n'afọ bụ ji a hụrụ n'ọkụ nke ọ ga-eri n'emume iri ji ọhụrụ
  • N'Enugwu Ugwu, a na-ebu ụzọ mee emume 'Ịkpọ ji' tupu e mee emume iri ji
  • Ọ bụghị onye ọbụla na-akpọ ji, ọ bụ onye chiri ọzọ
  • Onye ahụ ga-akpọ ji ga-enyerịrị ogbe niile dị n'Enugwu-Ukwu nakwa ụmụada otu mba ji
  • Onye ahụ ga-ejizi ji ọhụrụ gọọ ọfọ kelee Chukwu tupu amalite emume iri ji ọhụrụ.

Gerezie etu Igwe Ralph Ekpe si kọwaa ya n'ihe onyonyoo dị n'elu.