Oge iri ji na ihe ị kwesịrị ịma maka arụsị na-elekọta owuwe ihe ubi
Dịka anyị banyere ọnwa Ọgọstụ, ọtụtụ ji obi aṅụrị awụba ya n'ihi ihe ọ pụtaara ha n'oge a.
Ọnwa Ọgọstụ n’ala Igbo dị ezigbo mkpa ọkachasị dịka ọ bụ oge emume iri ji. Ji bụ ihe nkọpụta Igbo na-akwanyere ugwu pụrụiche. A na-ahụ ji dịka eze ihe akụmakụ n’ala Igbo niile. Ị ma ihe mere e ji ahụta ji etu a? Ị ma ihe mere oge iri ji jiri bụrụ oge pụrụ iche?
Ngwaa gee ntị ka ma kọwara gị. Ihe mbụ mere Igbo ji ahụta ji dịka 'eze akụrụ ubi' bụ na ji bụ ihe mbụ a na-ewepụta n’ala n'oge owuwe ihe ubi bụ nke Bekee na-akpọ Harvest.
Mana e nwere arụsị Igbo a na-enye ekele pụrụ ịche n’oge ihe owuwe kwa afọ ọbụla.
Ụfọdụ na-akpọ ya Afoji ọkụ ụfọdụ na-akpọkwa ya Ifeji ọkụ ebe ndị ọzọ na-akpọ ya ahụ ji ọkụ dịka olu ndi si dị.

Ọ bụ arụsị a na-elekọta akụmakụ niile.
Dịka ọrụ ugbo bụ otu n’ime ihe Igbo niile ji ebi ndụ na mgbe gboo ma ruo taa.
Ezinaụlọ niile na-akpoku afoji ọkụ tupu a gaa ugbo.
Mkpọku a ya bụ ka o gozie akụmakụ ndị mmadụ ma chekwaa ezịnaụlọ ha ka ghara ịmerụ ahụ n’orụ ugbo.
Otu onye ọkammụta n'asụsụ Igbo bụ Chigozie Nnabuihe kọwara BBC Igbo na iri ji ọhụrụ bụ emume Igbo ji ekele Chineke maka iji ji zọọ ndụ ha na-ekweghika agụụ gbuo ha.

Kedụ ka nke a siri mee?
Ụfọdụ akụkọ na-ekwu na n’oge mbụ, oke agụụ bịara dị n’ụwa.
Nwoke nke mbụ bụ Igbo kpọkuru Chukwu ka onyere ya na ezinaụlọ ya aka.
Chukwu nyere ya iwu ka o gbuo ụmụ ya abụọ bụ nke nwoke bụ Njoku na nke nwaanyị bụ Ada ma lie ha n’ala.
Igbo gburu ụmụ ya abụọ dịka Chukwu siri nye ya iwu.
Ha abụọ a mechara topụta n’ala dịka Ji na Ede.
Chukwu nyere Igbo gwara Igbo ka rie Ji na Ede ahụ.
Iji kele Njoku maka nke a, Igbo malitere ịna-eme emume iri ji ọhụrụ.
Njoku maọbụ Afoji ọkụ bụ arụsị owuwe ihe ubi nke ji nọ n’isi ya.
A na-ekele Afọji ọkụ maka ezi owuwe ihe ubi ma rịọ maka afọ ubi ọhụrụ.
Ọ bụ etu ahụ ka chukwu siri zọọ Igbo ndụ n’oge agụụ.

E nwekwara akụkọ ndị ọzo na-ekwu na mmaji bụ nwunye Njoku nke bụ arụsị na-ahụ maka ede bụ akụmakụ ụmụnwaanyị na-akọpụta.
Ekele Igbo na-enye Njoku maọbụ Afoji bụ maka etu o siri zọọ Igbo ndụ nakwa etu owuwe ihe ubi nke afọ ọ bụla siri gaa ma ọ gara nke ọ ma ma ọ gaghị.
Igbo na-atụ ilu si na eto dike na nke o mere o mekwa ọzọ.



