Ị nụla maka osimiri Ethiope, mmiri a sị na-agwọ ọrịa ma na-enye onyinye?
Obodo Umuaja nke dị na Delta steeti ebe mmiri a na-akpọ ‘River Ethiope’ na-asọ bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-awụbata agba nkiri na na-eme njem nlereanya.
Ọ gịnị ka ọha na-achọ n’obodo a? Ọ bụ mmiri ‘River Ethiope’ a na-adọbata ndị mmadụ ebe a.
Ala ebe mmiri a si asọpụta bụ ebe dị nsọ dịka e kwuru na ya bụ mmiri na-enye ndị mmadụ ike, na-agwọ ọrịa, na-enye ndị mmadụ ihuọma, na-enye ndị na-achọ nwa ụmụ nakwa ndị na-achọ dị maọbụ nwunye ndị odinaobi ha.
Ezenwaanyị na-elekọta mmiri aa kemgbe afọ 20 bụ Oyolu Lucky kọwara BBC Igbo etu nna ya na mgbe gboo siri kọrọ ya maka isi mmiri ahụ.

End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

O kwuru na ọ bụ otu dịnta nke mgbe ochie bụ onye nyochapụtara mmiri a mgbe gboo dịka ya bụ mmiri dị oke ọcha kịrịa mmiri ndị ọzọ.
E kwuru na dịnta ahụ na ndị otu ya beturu osisi ahụ na mgbe gboo mana ụbọchị echi ya, mgbe ha bịara ebe ahụ, ya bụ osisi akwụkwala ọtọ ọzọ.
Ndị dịbia gwara ha na osisi ahụ nakwa mmiri si na ya apụta bụ ihe ngọzi nye ndị obodo ahụ ma kọwa ka ha nkwenyere ya ugwu pụrụiche.
O kwuru na ya bụ mmiri na-esi n’okpuru otu oke osisi gbarala afọ ole m ole ebe ahụ asọpụta, bụ ebe a sị ike mmiri a nọ.
Ya bụ mmiri na-asọpụ na-aga ọtụtụ obodo ndị ọzọ nọ obodo ahụ nso ma na-agwa oke osimmiri nke ‘Atlantic Ocean’.
Ọ gbakwara ma na ọtụtụ ndị mmaọ̄ụ na-abịa ebe ahụ nata ike ma kpee ekpere pụrụiche nke gụnyere ọtụtụ ndị ụkọchukwu.
Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a ka ị nụrụ ihe o kwuru n’uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chigozie Ohaka.


