Paa Kwesi Asare nke Ghana eritela nturuugo ‘BBC News Komla Dumor Award’ nke afọ 2023

Ebe foto si, BENZILLA_CLICKS/3NEWS.COM
Onye ntaakụkọ mba Ghana aha ya bụ Paa Kwesi Asare emeriela ma rite nturuugo ‘BBC News Komla Dumor Award’ nke afọ 2023.
Nwa amadị a dị afọ 36 bụ onye nke asatọ na-erite ntuurugo a kamgbe ụlọọrụ BBC hibere ya, ma bụrụkwa onye mbụ si mba Ghana ebe Komla Dumor n’onwe ya si.
Asare na-arụ n’ụlọ ntaakụkọ TV3 nke mba Ghana ebe ọ rụrụla ọrụ afọ asaa ma bụrụkwa otu n’ime ndị na-agụpụta akụkọ.
“Mmeri a bụ nnukwu ihe n’ọrụ m dịka onye ntaakụkọ, ọ bụ ohere m ga-eji aka m abụọ anabata,” Asare kwuru.
“Obi dị m ụtọ nke ukwuu na m meriri nturuugo a nke e hibere na ncheta Komla Dumor. Nturuugo a bụ nke kachasị maka onye ntaakụkọ ọbụla n’Afrịka. Komla bụ onye m na-elegara anya nke ukwuu, ugbua m nwere ohere ịga ije na nzọụkwụ ya, ọ bụ ihe oke ọṅụ nakwa nkwanye ugwu nye m.”

Komla Dumor bụ onye ntaakụkọ mba Ghana rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ n’ụlọọrụ BBC tupu ọ nwụọ na ntụmadị n’afọ 2014.
Ọ gbara mbọ nke ukwuu iwepụta ọtụtụ akụkọ ọma gbasara Afrịka.
N’afọ 2015 ka BBC hibere ntuurugo a iji kwanyere ncheta Komla Dumor ugwu maka ọrụ ọma ya oge ọ dị ndụ.
Ndị riterela nturuugo a gụnyere Nancy Kacungira, Dingindaba Jonah Buyoya, Victoria Rubadiri, Solomon Serwanjja, Waihiga Mwaura, Amina Yuguda, na Didi Akinyelure.
N’afọ 2023, Buyoya onye mere njem gaa mba Seychelles iji kọọ akụkọ etu ụfọdụ ihe akụkụ na-eto n’ime osimiri nwere ike iji nye aka gbochie mgbanwe ihu eligwe.










