You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu: Ihe 'National Security Council' kwuru maka mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị
Ọgbakọ Gọọmentị Etiti na-ahụ maka nchekwa bụ ‘National Security Council’ nọrọ ụbọchị Fraide akwado ihe Ọkaukwu Gọọmentị Etiti bụ Abubakar Malami kwuru sị na n’okwu Nnamdi Kanu ebibeghị.
Ụlọikpe Mkpegharị nyere ntuziaka ụbọchị Tozde ,sị ka a tọhapụ Kanu , n’ikpe amaghị ya mana Abubakar Malami, sara sị na nke ahụ apụtaghị na a ga-ahụ Kanu ka ọlaghị dịka o kwuru na o nwere ikpe ya ekpebibeghị.
Ọtụtụ ụmụ Naijiria na-atụ anya ntọhapụ Nnamdi Kanu dịka ha na-ekwu mkpa ọ dị gọọmentị irubere mkpebi ụlọikpe isi.
Mana n'ọgbakọ nke ndị isi nchekwa Naijiria na Onyeisiala Muhammadu Buhari nwere ụbọchị Fraide, kaụncil kwuru na na ọ bụ nanị na akụchapụụ ebubo e boro Kanu, na gọọmentị ga aga n'ihu isochi okwu ahụ.
Ihe a kpara n'ọgbakọ ahụ pụtara ihe dịka Mịnịsta na-ahụ maka ihe na'eme n'ime Naijiria bụ Raud Aregbesola , ogbo ya na-ahụ maka ihe gbasara ndị uweojii bụ Mohammed Dingyadi, na Onyeisi ndị chekwa( Chief of Defence Staff) bụ Generalụ Lucky Irabor, gwara ndị ntaakụkọ okwu.
Mohammed Dingyadikwụrụ sị, “A kpalitere okwu gbasara Kanu ma gwa ọgbakọ ahụ ebe okwu ya kwụ , etu o si bụụ na asị ya na ikpe amaghị ya mana ọbụghị ya lawa."
“Ya mere, Gọọmentị na-atụlee ụkwụ ka mma ịzọpụ. A ga-eme ka ọha mata ihe ha kpebiri n'okwu Kanu."
Ch