Ahụhụ akarịala n'ihi ụkọ na oke ọnụ mmanụ 'petrol' - Ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ

Ọnụ ego mmanụ ụgbọala
Nkọwa foto, Ego ole gọọmentị tinyere maka mmanụ ụgbọala bụ N179 mana nke a abụghị maka mpaghara ọwụwa anyanwụ

Ọtụtụ ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-ebe arịrị maka etu mmanụ ụgbọala si galaa oke ọnụ n'ebe dị icheiche, nakwa ụkọ ya n'ebe ụfọdụ.

Taa, n'ebe dị icheiche na steeti ise dị n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ n'etiti N320 ruo 350, ma a hụ ya anya.

N'ụlọahịa olemole ebe ndị a na-ere mmanụ ụgbọala n'ọnụ ego gọọmentị etiti tinyere nke bụ N179 ruo N185, ahịrị na-eto ogologo nke ukwuu nke pụtara na mmadụ ga-anọ ọtụtụ awa n'ahịrị tupu o nwee ike ịzụta.

Lee ihe BBC chọpụtara na steeti dị icheiche:

N'Enugwu

Ụlọahịa mmanụ ụgbọala
Nkọwa foto, Ụfọdụ ụlọahịa anaghị ere mmanụ ụgbọala an'Enugwu

N'Enugwu anyị chọpụtara na otu lita 'petrol' bụ bido na N320 ruo N350.

Ụlọahịa abụọ (Pinnacle na Northwest) bụ ndị na-ere n'ọnụ ego gọọmentị nke bụ N185.

Mana otu onye kwuru na ndị mmadụ na-anọ n'ahịrị ruo chi ofufo iji nweeike ịgbata mmanụ ụgbọala.

Chukwuma Ogbonna, otu onye gwara BBC Igbo okwu, kwuru na oke ọnụ mmanụ ụgbọala na-ada etinyela ọtụtụ mmadụ n'ahụhụ.

Ndị kwụ n'ahịrị maka mmanụ ụgbọala

"Ọ dị mwute na ihe a na-emepụta n'obodo anyị bịaziri bụrụ ihe galara ọnụ otu a. Ọ bịakwa bụrụ n'oge a na-achọ ịhọpụta onyeisiala," Ogbonna kwuru.

"Ọ ga-abụ ọnụego mmanụ ụgbọala a mere ihe niile ji agala ọnụ n'ahịa, maka na ndị ọkwọ ụgbọala ga-etinye ego n'ego ole ha na-anabu, ndị ahịa etinyekwa ego nke ha, ahụhụ akarịa ebe niile."

Onye ọzọ na-anya ọgbatumtum ụkwụ atọ (tricycle) kwuru na ọnọdụ ọjọọ a enyeghị ha ọnụ okwu.

N'Umuahia

Ụlọahịa mmanụ ụgbọala
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọahịa mmanụ ụgbọala anaghị ere n'Umuahia taa bụ Wenezde

Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo kpagharịrị n'Umuahia, isi obodo Abia Steeti n'ụtụtụ Wenezde, ọ chọpụtara na ụlọahịa ndị nọ na mpaghara Aba Road enweghị nke n'ime ha na-ere mmanụ ụgbọala.

Na ngwụcha izuụka gara aga, ọtụtụ n'ime ha na-ere n'ọnụego N360 maka otu lita 'petrol'.

Otu ebe anyị hụrụ a na-ere mmanụ ụgbọala na mpaghara Umuagu Ibeku, ha na-ere n'ọnụ ego N350 maka otu lita.

Mana ndị ọzọ na-ere mmanụ ụgbọala n'ụzọ ịgba ọsọ ahịa (black market) na-ere n'ọnụ N550 ruo N650 maka otu lita.

Nke a emeela ka ọnụego ime njem site n'otu ebe gaa ebe ọzọ n'ime Umuahia gbalie nke ukwu.

N'Anambra

Ndị bi n'Ọnịcha kwuru na ha na-azụ mmanụ ụgbọala n'etiti N300 ruo N350.

Otu onye na-azụ ahịa na 'Main Market' Ọnịcha aha ya bụ Christopher Obi, sị na site na mpaghara Egerton gawa 3-3, ha na-akwụ N300 maka ịbanye keke.

"Ihe anyị na-akwụbu mbụ bụ N200, mana ugbua, N300 ka anyị na-akwụzi," ka o kwuru.

"O doro onye ọbụla anya na gọọmentị ewepụbeghị 'subsidy', gịnị meziri mmanụ ụgbọala ji agala ọnụ?" ka Christopher jụrụ?