Royal Rebranding: Gịnị ga-eme ego, 'stamp' nakwa akwụkọ njem mba Britain?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọ chịchara afọ iri asaa n'ọkwa, Ezenwaanyị Elizabeth abụrụla onye dị mkpa na ndụ ndị mba Briten.
A na-ahụ isi ya n'ego, nakwa ngwa ndị ọzọ mana gịnị ga-eme ugbua?
Mgbanwe niile
Ego igwe niile dị na mba Briten ruru ijeri iri abụo na itoolu nwere isi Ezenwaanyị n'elu ya.
Nke ọhụrụ a kachasị mee bụ nke ewepụtara n'afọ 2015 mgbe ọ dị afọ iri asatọ na asatọ. Nke ahụ bụ mgbanwe nke ise emerela kemgbe ọ nọ n'ọkwa.
Ụlọọrụ na-arụpụta ego ahụ bụ 'Royal Mint' ekwubeghi mgbe ha ga-eji bido rụpụtawa ego igwe bu isi Eze Charles III na ya mana o nwereike iwe ọtụtụ afọ n'ihi na usoro mgbanwe ya ga-abụ nwayọ nwayọ.

Ebe foto si, Getty Images
Tupu agbanwee ego igwe niile site na Teknuzu n'afọ 1971, a na-ahụkarị ndị Eze dị icheiche n'ego mba Briten.
Amabeghi etu ego igwe bu ihu Eze ọhụrụ ga-adị mana otu ego igwe emepụtara iche maka ncheta ọmụmụ ya mgbe ọ gbara afọ iri asaa tupenyere azụ.
Gọọmentị binye ya aka, a ga-abipute usoro ego ọhụru n'ụlọorụ Royal Mint nke dị na Llantrisant na Saụt Wales.
Ihu Ezenwaanyị bụ ihe dị n'ego si ụlọakụ mba Ingland kemgbe afọ 1960. Ha ruru ijeri anọ na ụma ise ma ruo ijeri paụnds iri asatọ dị ka ọ dị ugbua nke mere na dịka ego igwe, a ga-eji nwayọ gbanwe ya.
Ego akwụkwọ na ego igwe niile ka kwụ chị m. Ụlọakụ mba Ingland ga-enye ọtụtụ mgbasaozi nakwa oge maọbụrụ na ọ ga-agbanwe.
'Stamp' na igbe edemede ozi
Kemgbe afọ 1967, Stamp niile ebiputara na-ebu isi Ezenwaanyị Elizabeth II e si n'akụkụ sere.
Ụlọorụ Royal Mail ga-akwụsị ibiputa ndi bu isi Ezenwaanyị Elizabeth II ma bido usoro ibipụta ndị ọhụrụ - mana a ka nwereike ị na-eji ndị ochie ezipu ozi edemede.

Ebe foto si, Getty Images
E tinyebuola ihe Eze ọhụrụ na Stamp mana Royal Mail amabeghi etu eserese ndị ọhụru ga-esi dị.
Ihe karịrị pasentị iri isii n'igbe ozi edemede niile bụ ntụpọ EIIR bụ nke Ezenwaanyị Elizabth nke pụtara E - Elizabeth, R - Regina (pụtara Ezenwaanyị).
Na mpụta Scotland, igbe ọhụrụ ọbụla ịhụrụ ga-ebu apa Eze ọhụrụ mana ọnụogụgụ ndị ha na-ewepụta pere mpe nke ga-eme ka o tee aka tupu ịhụ nke bu ya.
Akara nnabata nke ndị Eze
Site na ngwa nri bụ Ketchup rue na nri ọka na anwụrụ isi ọma, ị nwereike ịhụ njirimara Ezenwaanyị ebe e dere "By appointment to Her Majesty the Queen" n'ahụ ngwa ndị ịzụrụ na be gi.
Ngwa ndị ahụ bụ ndị enyere 'nnabata' maọbụ 'Warrant' nke pụtara na ụlọọrụ ahụ na-ebugakwara ya ezinaụlọ Ezenwaanyị kwa mgbe kwamgbe.

Kemgbe afọ otu narị gara aga, onye na-achị, nwunye maọbụ di ha nakwa onye ga-anọchi ha anya na-ewepụta njirimara 'warrant' nke ha nke pụtara na ụlọọrụ 800 nweruru warrant ruru 900 ha ji.
Onye na-enye warrant ahụ nwụọ, ụlọọrụ ndị ji ya nwere afọ abụọ iwepụ njirimara onye ahụ na ngwa ha.
'Warrant' ndị Charles nyere dịka Ọkparaeze ka ga-adị ugbua ọ buzi eze maka na o so ya n'abụghị echichi ya.
A na-atụ anya na Eze ọhụrụ ga-enye nwa ya bụ Ọkparaeze William ikike iwepụta 'Warrant' nke ya.
Akwụkwọ njem 'Passport' agbanwebeghi
Mana ọ bụghị sọsọ ego na 'Stamp' ka a ga-eme mgbanwe.
Akwụkwo njem niile ewepụtara n'aha Ezenwaanyị ka ga-adị ire maka njem mana edemede dị n'ime ndị ọhụrụ ga-agbanwe buru aha Eze.
Ndị uweojii na mba Ingland na Wales ga-agbanwe apa ha bu n'okpu ha.
Ndị ọkaiwu niile amabu dịka counsel Ezenwaanyị ga-aghọrọ counsel Eze ozigbo.
Na ngwụcha, abụ njirimara ala ahụ ga-agbanwe kwuo 'God save the King'.
Nke a ga-abịa me emechaa mkpọpụta akpọrọ 'Proclamation' n'Obieze St James dị na London.









