Ụtụisi gọọmentị na-achọ ịtọgbu anyị - ụfọdụ ndị bi n'Anambra na-ekwu

Aha onyonyo, Ụtụisi gọọmentị na-achọ ịtọgbu anyị - ụfọdụ ndị bi n'Anambra na-ekwu
Ụtụisi gọọmentị na-achọ ịtọgbu anyị - ụfọdụ ndị bi n'Anambra na-ekwu

Okwu e ji mara ọchịchị Chukwuma Soludo n'Anambra Steeti bụ "kwee ka ụtụisi gị rụọrọ gị ọrụ" mana ụfọdụ ndị bi na steeti ahụ na-ekwu na oke ụtụisi na-achọzi ịtọgbu ha.

N'izu ụka gara aga, ngalaba mkpofu ahịhịa nke Anambra steeti bụ 'Anambra State Waste Management Board (ASWAMA) wepụtara ụgwọ ọhụrụ nke ndị bi na steeti ahụ ga na-akwụ iji kpofu ahịhịa ha.

Ụgwọ ọhụrụ a nke a buliri elu malitere ịdị ire n'ụbọchị mbụ nke Ọkụtoba 2022.

Anambra Steeti
Ụtụisi n'Anambra

Ndị gwara BBC Igbo okwu kwuru na ego na-abata ha n'aka na-epewanye mpe, gọọmentị abịakwa na-ebuli ụtụisi.

Chukwudi Ugwu, onye na-azụ ahịa n'Eke Ọka kwuru sị: "Ụtụisi niile a akarịala, ọ ga-eme ka ọnụego ihe n'ahịa na-agbali elu ebe ego e ji azụta ihe ndị a na-agbatu."

"Anyị ma na gọọmentị anaghị enwetazi nnukwu ego ha ji arụ ọrụ, mana okwesịghị ka ọ bụrụ ndị mmadụ nkịtị ka ha ga-ebufere ya."

N'aka nke ya, Oriaku Tonia Chukwuanu kwukwara ihe yiri nke a; "mbuli ụtụisi a na-abịa n'oge ọjọọ," Tonia kwuru.

"Ọtụtụ ndị ahịa na-agabiga nnukwu nhịahụ ugbua n'ihi etu ọnọdụ akụnụba obodo anyị dị. Ọ ga-adị mma ma gọọmentị tulee ihe ndị a tupu ha ebuliwe ụtụisi."

Vivian Okafor, onye na-ere nri, kwuru nke ya hoohaa, "mbuli ụtụisi a na-atọgbụ ahịa anyị".

Iji maa atụ, Vivian kwuru na ụtụisi gọọmentị nyere ha bụ ndị na-ere nri bụ N48,000 kwa afọ.

"Ndị obere ụlọ ahịa (smale and medium scale business) agaghị ekuteli ume n'ụtụisi niile ndị a," ka o kwuru.

Ụtụisi dị icheiche gọọmentị Anambra tinyere n'ọdị nso a

Anambra Tax

'Sanitation' rate' nke ndị ASWAMA tinyere malitere ịdị ire n'ụbọchị Ọkụtoba 1.

N'ime nke a enwere ngalaba atọ: Ime obodo, obodo ndị mepetụrụ emepe, na obodo ndị mepere emepe nke ọma.

Ngalaba atọ a nwechara ụgwọ dị icheiche ha kwesịrị ịkwụ, lee nkọwa ya na foto dị n'elu.

Ụtụisi ndị ọrụ okporoụzọ

Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ ụgbọala, ndị keke na ndị na-anya ọgbatumtum ga mere ngagharịiwe maka ego ụtụisi ọhụrụ nke gọọmentị Anambra steeti wepụtara ka ha na-akwụ kwa ọnwa maọbụ kwa afọ.

Lee etu ụtụisi nke a si dị:

  • Ndị na-anya ọkada: N300 kwa ụbọchị maọbụ N7, 500 kwa ọnwa, maọbụ N40,500 maka ọkara afọ
  • Ndị Keke: N600 kwa ụbọchị, maọbụ N25,000 kwa ọnwa, maọbụ N81,000 maka ọkara afọ
  • Ndị obere ụgbọala (Shuttle bus): N1,000 kwa ụbọchị, maọbụ N25, 000 kwa ọnwa, maọbụ N135,000 maka ọkara afọ
  • Ndị na-anya obere ụgbọala (Taxi): N700 kwa ụbọchị maọbụ N17, 500 kwa ọnwa, maọbụ N94,5000 maka ọkara afọ
  • Ụgbọala 'township bus': N1,200 kwa ụbọchị, maọbụ N30,000 kwa ọnwa, maọbụ N162,000 maka ọkara afọ

Gọọmentị Anambra kwuru na tupu oge a, ndị ọrụ ụgbọala na-akwụ ụgwọ karịrị nke a n'aka ndị agboro, mana ya bụ ego anaghị abata n'akpa gọọmentị.

Ya mere o ji tinyezie usoro ụtụisi nke a ma machie onye nkịtị ọbụla ịnakọ ndị ọrụ okporoụzọ ụtụisi.

Ụtụisi ndị na-ere mmanụ 'petrol'

N'ọnwa June kwa, otu jikọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala, bụ 'Independent Petroleum Marketers Association' kwuru na ha ga-agba abụbụ ọrụ n'ihi na gọọmentị buliri ego ha na-akwụ karịa 40%, site na N100,000 ruo N150,000.

Mana ha mechara kagbuo abụbụọrụ ahụ dịka gọọmentị wepụturu obere ego n'ego ahụ ha na-akwụ ka ọ bụrụzie N120,000.