'Ụgwọ ọhụrụ gọọmenti Anambra na-ana ndị na-anya 'Keke' ga-akwụ anyị agụụ'
Ndị na-akwọ ọgbatumtum akpọrọ Keke n'Anambra steeti na-eti mkpu maka ụgwọ ụtụisi ọhụrụ gọvanọ Chukwuma Soludo kwuru na ha ga na-akwụ kwa ọnwa ọbụla.
Ụgwọ ọhụrụ ahụ ruru naira iri abụọ na ise (N25,000) kwa ọnwa. Ụfọdụ ndị na-anya 'Keke' kwuru na ọ ka mma na gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra steeti kwere ka ha kwụwa ya bụ ụgwọ kwa ụbọchị karịa ma ịkwụ ikwụ ya n'otu nje makana ọ ga-ebu ha aka.
Ebe ndị ọzọ kwuru na ya bụ atụmaatụ ga-akwụwa ha na ndị bee ha agụrụ. Otu onye n'ime ha kwuru na onye ọgbatumtum ya mebiri ma ọ rụghị ọrụ n'ụbọchị, ego ọ kwụrụ alala.

Ihe gọọmenti Anambra steeti kwuru
Nke a na-abịa dịka gọọmenti Anambra kwuru na ndị ọkwọ ụgbọala nakwa Keke ga na-akwụ naira narị iri isii (600) dị iche na naira otu puku na narị ise (1500). Richard Nwora Madiebo bụ onyeisioche 'Anambra state Internal Revenue Service' kwuru na ọ bụ kamgbe ọnwa Maachị ka gọọmenti Soludo malitere ịgwa ndị na-akwọ ụgbọ njem ọbụla na a gaghị na-ana ha ụgwọ n'aka ọzọ.
O kwukwara na gọọmneti choputara na ihe dịka ndị na-akwọ Keke na-akwụ naira otu puku na narị ise (1500) kwa ụbọchị ka ha gwara ha kwụwazia naira narị isii kwa ụbọchị ruo ụbọchị iri ise(25 days).
Madiebo kwuru na gọọmenti Anambra steeti achọghị ka ndị ọkwọ ụgbọ e ji eme njem na-akwụnye ndị agbero ụgwọ ọbụla makana gọọmenti ga-esi na ya bụ ụgwọ ụtụsi ha hazigharịrị na-akwụ ndị na-anọ ọdọụgbọala pasenti ise.
Ndị ọzọ gụnyere:
- Ndị na-anya Okada ga-anakwụ N300 kwa ụbọchị N7, 500 kwa ọnwa
- NdỊ obere ụgbọala na-eme njem ga na-akwụ N1,000 kwa ụbọchị , N25, 000 kwa ọnwa monthly
- Ndị na-anya tazi ga-akwụ N700 kwa ụbọchị maọbụ N17, 500 kwa ọnwa.
- Ụgbọala njem na-agbagharị n’ime obodo ga-akwụ N1,200 kwa ụbọchị, N30,000 kwa ọnwa.
- Ụgbọala na-ebu ngwogwo ga-akwụ N1,000 , N25,000 kwa ọnwa.






