Sierra Leone Election Result: Nchịkọta mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ

Mba Sierra leone mere ntuliaka ọkwa onyeisiala ha n'ụbọchị Satọde Juun 24, 2023.

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na mba ha bụ 'Electoral Commission of Sierra Leone' kpọpụtara na aha onyeisiala ha bụ Julius Maada Bio nke 'Sierra Leone Peoples Party (SLPP) dịka onye meriri.

Bio nwetara vootu 1,566,932, nke bụ pasentị 56 na ụma nke vootu niile a tụrụ na ntuliaka ahụ.

Ebe onye na-eso bụ Samura Kamara nke 'All Peoples Congress' (APC) nwetara vootu 1,148,262, bụ pasentị 41 na ụma nke vootu niile a tụrụ.