BBC amalitela ihe nrite Komla Dumor nke 2023

BBC News na-achọ onye ntaakụkọ si mpaghara Afrịka ga-amụke ka ọnwa na kpakpando n'ihe nrite Komla Dumor nke afọ a bụ nke asatọ.

A na-akpọku ndi ntaakụkọ si mpaghara Afrịka niile ka ha tinye akwụkwọ isonye n'ihe nrite a, bụ nke ga-ekpuhe ma kwalite ọnatarachi dị n'Afrịka.

Onye meriri ga-anọ ọnwa atọ n'isiụlọọrụ BBC dị na Lọndọn, ebe ọ ga-amụta ọtụtụ ihe dị iche iche.

Ohere itinye akwụkwọ ga-akwụsị n'ụbọchị 14 Febụwarị 2023, n'elekere 23:59 GMT.

E hiwere ihe nrite a iji kwanyere Komla Dumor bụ nwafọ Ghana, onye ntaakụkọ na mgbasaozi n'ihe onyonyo BBC World News ugwu, bụkwanụ onye nwụrụ na mberede mgbe ọ gbachara afọ 41 n'afọ 2014.

Nwunye Dumor bụ Kwansema Dumor sị na obi juru ya afọ n'ọrụ di ya rụrụ n'ụlọọrụ BBC ma sịkwa na ezinaụlọ ya "na-ekele BBC maka icheta ya" site n'ịhazi ihe nrite a.

BBC na-arịọ ka ndị ntaakụkọ si mpaghara Afrịka tinye akwụkwọ maka ihe nrite a, bụ nke ga-akwalite ma kwanyere ndị ntaakụkọ pụrụiche bi ma na-arụ ọrụ n'Afrịka ugwu.

N'ịgbakwụnyere ọzụzụ a ga-enye onye meriri, onye ahụ ga-aga otu mba Afrịka mee akụkọ ha nyochapụtara bụ nke a ga-agbasa n'ọbaozi BBC n'ụwa gbaa gburugburu.

Dịka onye a ma ama n'ịgbasa akụkọ n'ụzọ pụrụiche nakwa mmasị o nwere n'ịkọ akụkọ banyere Afrịka, Dumor mere ihe gbapụtara ihe n'Afrịka nakwa mbaụwa.

BBC ekpebiela ịganihu n'ịkwanyere Dumor ugwu a site n'ịkwado ndị ntaakụkọ si na mpaghara Afrịka ka ha na-akọ akụkọ ndị pụrụiche banyere Afrịka ka ụwa tụrụ lee.

Nwafọ mba Zambian na-agbasa ozi na TV bụ Dingindaba Jonah Buyoya meriri n'ihe nrite a afọ gara aga - onye mbụ ga-erite ya site na mpaghara Ndịda Afrịka.

N'oge ọzụzụ ya, ọ gara na mba Seychelles ịkọ akụkọ banyere etu osisi ndị a kụrụ na mba mmiri ga-esi enye aka ịbelata mgbanwe ihu eluigwe (climate change).

"Ndụ Komla Dumor kpalitere mmụọ m, ya mere irite ma soro na nkwanye ugwu a bụ nnukwu ihe nkwanye ugwu nye m," Ka Buyoya kwuru.

"Ana m agba ndị ntaakụkọ si Afrịka ume ka ha tinye akwụkwọ maka ihe nrite a; ọ bụ ụzọ dị mma e ji amụta ihe ma wulite amamihe e ji akọ akụkọ ndị pụrụiche banyere Afrịka."

Liliane Landor, onye ji ọkwa 'senior controller n'ụlọọrụ BBC News kwuru: "Ihe nrite a na ndị ritere ya na mbụ bụ ihe ịgba akaebe na mmasị Komla nwere iji ugwu na eziokwu akọ akụkọ banyere Afrịka."

Dumor bụbu onye na-agbasa ozi n'emume Focus on Africa, igwe mgbasaozi na TV nke mbụ BBC hiwere naanị maka ndị Afrịka. A na-agbasa ozi a n'ọbaozi TV nke BBC World News, bụ nke a ga-achịkọ ya na BBC News Channel ọnụ dị ka afọ a na-aga n'ihu iji hiwe ọbaozi ọhụrụ.

O so kwa n'otu n'ime ndị mgbasaozi na BBC World News' ngalaba European a na-eme n'ụtụtụ.

O banyere n'ọrụ BBC n'afọ 2007 n'ime ọtụtụ afọ ọ rụchara ọrụ dịka onye ntaakụkọ na mba Ghana, bụ ebe o ritere nzere onye ntaakụkọ kachasị ibe na Ghana.

Site n'afọ 2007 ruo afọ 2009 ọ na-agbasa ozi n'emume 'Network Africa' nke BBC World Service, tupu ọ banye n'emume 'The World Today'.

N'afọ 2009 Dumor bụ onye mbụ ga-agbasa ozi n'emume 'African business na BBC World News, Africa Business (akụkọ banyere azụmaahịa n'Afrịka). O mere njem gaa mba Afrịka dị iche iche, ebe o zutere ndị bụ ọkaibe n'azụmaahịa ma kọọ akụkọ banyere ọtụtụ azụmaahịa na-ewu ewu n'Afrịka.

N'afọ 2013 aha Dumor pụtara n'akwụkwọ New African magazine' dịka otu n'ime mmadụ 100 kachasị gbapụta ihe n'Afrịka.

Ndị ritere ya na mbụ:

  • 2015: Nancy Kacungira onye Uganda
  • 2016: Didi Akinyelure onye Naịjirịa
  • 2017: Amina Yuguda onye Naịjirịa
  • 2018: Waihiga Mwaura onye Kenya
  • 2019: Solomon Serwanjja onye Uganda
  • 2020: Victoria Rubadiri onye Kenya
  • 2022: Dingindaba Jonah Buyoyaonye Zambia