You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Peter Okpaleke: Etu e si chie ya Kadịnal na Rome
Poopu Francis eduola Bishọp Peter Okpaleke nke ụka katọlịk n'Ekwulobia na mmadụ 19 ndị ọzọ n'iyi ọrụ dịka Kadịnal taa bụ Satọdee, ụbọchị 27 nke ọnwa Ọgọọst, 2022.
Okpaleke so n'ime mmadụ iri abụọ ahọpụtara n'ọkwa Kadịnal a dịka e mere emume iti mmanụ na idu iyi ọrụ ha n'ụka St. Peter Basilica, Rome.
Okpaleke ga-abụ onye nke ise bụ nwaafọ Naijirịa echirila echichi Kadịnal dịka nke a ga-eme ya ugboro asatọ Poopu Francis na-ete ndị Kadịnal ahọpụtara mmanụ.
Akwụkwọ ozi si ụlọọrụ mgbasaozi Vatican kwuru na mamdụ 16 n'ime mmadụ 20 ndị e tere mmanụ taa bụ Satọdee erubeghị afọ 80.
Dịka e techapụrụ ndị mmanụ ma nye ha ikike ịbụ Kadịnal, ha gara n'ụlọ ili ebe e dobere onye bụbu Poopu bụ Poopu Benedict XVI.
Ha nọ ebe ahụ bụ Mater Ecclesiae Monastery kpee ekpere dịka Poopu Francis dụrụ ha ndọmọdụ ka soro ụkpụrụ Karaịst n'igbaso ịhụnanya, udo nakwa ịlekọta ụwa ma duo ndị mmadụ n'ụzọ nke Kraịsti.
Bịshọpụ Peter Okpaleke so na ndị isi ụka mmadụ 20 Poopu Francis ụka Katọlik kpọpụtara aha ha n'ọnwa Mee nke afọ na a ga-ete mmanụ ịbụ 'Cardinal' nke kpalitere ọtụtụ ọṅụ nye ndị mmadụ na Naịjirịa.
Aka chịbụrụ Anambra steeti bụ Peter Obi, aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo nakwa ụfọdụ ndị Sịnetọ steeti ahụ so gaa emume a pụrụiche e mere taa.
Cheta na aha Okpaleke malitere wuwe na Naijiria niile dịka ndị ụkọchụkwu na ndị ụka Katọlik na Ahiara Dayọsis jụrụ ịnabata nhọpụta a họpụtara ya dịka Bịshọpụ n'afọ 2012 mana e mechara mee ya Bishopụ Ekwulobia.
Ije Okpaleke dịka ụkọchukwu malitere na mberede dịka a kpọrọ ya gbaa odibo n'ofufe nro mbụ ya n'amụghị ya amụ otu ụbọchịụka dịka ndị na-agba odibo n'ọlta nke a na-akpọ "mass servers" abaghị ụka n'ihi mmiri ozizo.
Ihe i kwesịrị ịma maka Bishop Okpaleke
- A mụrụ Peter Okpaleke na ejima ya bụ Paul n'abalị Mbụ nke ọnwa Maachị, afọ 1963.
- Onye Amesi dị n'Okpuru Ọchịchị Aguata, nne na nna ya bụ Reuben Ezeuko Okpaleke na Bridget Ekejimma Okpaleke.
- Mana Bishọpu Okpaleke toro n'Ụga n'aka nnenne ya bụ Evelyn Abiahuaku Ibekwe bụ ebe ọ gara Oganiru Primary School na Uga Boys' Secondary School.
- Ọ gara seminary na St. John Bosco Seminary Isuaniocha, Bigard Memorial Seminary bụ nke a ma ugbua dịka St. Joseph's Major Seminary Ikot-Ekpene, Catholic Institute of West Africa (CIWA), Port Harcourt na mahadum 'Pontificia Universita Della Santa Croce, Rome, Italy' bụ ebe o nwetara "first class" bụ ebe o nwere na "Canon Law"
- E chiri ya ụkọchukwu n'abalị 22 nke ọnwa Ọgọst afọ 1992.
- Ọ rụọla dịka ụkọchukwu na-achịkọta St. Anthony's parish Nanka, Ss. John and Paul Umubele Awka na St. Joseph the Worker Chaplaincy, Nnamdi Azikiwe University Awka.