Lee nri ndị i na-eri nwere ike ikwatu ike gị n'akwa

Mmekọrịta nwoke na nwaanyị dị mkpa maka ndụ mmadụ, n'ihi e wepụ aramara, ọmụmụ nwa agaghị adị.

Dịka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị na-ere ọgwụ dị iche iche ha na-ekwu na eji ya ebulite ike mmadụ, ọkachasị ụmụnwoke, ime aramara.

Kama dịka Olatoun Ayoola bụ ọkaibe gbasara aramara gwara BBC Pidgin were sị, "ọgwụ na-ebulite ike aramara kwesịrị ịbụ naanị nri mmadụ na-eri.?"

"Mmadụ ekwesịghị ịga zụrụ ọgwụ na-enweghị ntuzi etu eji aṅụ ya iji bulite ike aramara ha".

Kama nnyocha sayensi na-ekwu na enwere ụfọdụ nrị na akwatu ike aramara mmadụ.

BBC Igbo kpọtụrụ Joy Nwokocha onye bụ ọkaibe na nri na-etu o si emetụta ahụ mmadụ nke bụ 'Nutritionist' na bekee ka ọ kọwaa ma e nwere nrị ndị na-akwatu ike aramara mmadụ.

Nwokocha kọwara na n'ezie, na enwere ụfọdụ nrị na-agbanwe ahụ mmadụ nke ga-akwatu ike eji eme aramara.

Lee nrị ndị ọ kpọrọ aha nwereike ịkwatu ike mmadụ ime aramara.

Oke Shuga na mmanya Soda

Nwokocha kwuru sị, " Shuga bụ ihe bekee na-akpọ 'Empty Calorie', ndị tara ahụ na-enwe ike aramara karịa onye buru oke ibu.

Ma mara kwa na iri oke shuga so n'otu n'ime ihe na-ebute ndị mmadụ oke ibu dịka ọ na-egbochi Leptine ịrụ ọrụ n'ahụ mmadụ.

Nwokocha kọwara na suga na-ebuli ọnọdụ insulin n'ahụ mmadụ nke na-ebute ka abụba dọrọ n'ahụ mmadụ.

O kwuo sị,"ọnọdụ a na-ebute ọrịa shuga nke n'onwe ya na-ebute nwoke enweghị mmasị maọbụ ike aramara".

Ọ kọwara na nkea na-eme ka nwoke ahụ hapụ inwe ike maọbụ mmasị ime aramara.

Mmanya ọkụ

Nwokocha kwuru na ịnụ mmanya ọkụ ma ṅụfee ya oke adịghị mma.

O kwuru sị, " Ịnụ oke mmanya na-eme ka osie ike ka amụ nwoke kwụrụ ọtọ ma na-ebute kwa nsogbu ibido aramara ma mesie ya"

O gara n'ihu kwuo, " Ọzọ kwa bụ na mmanya ọkụ nwere Depressants nke na-eme ka ahụ mmadụ dere juu ma mee ka onye ahụ hapụ ịnwe mmasị ime aramara".

Kama ọ kwuru na onye chọrọ ịnụ mmanya ọkụ, ha gbalia hụ na ha anụghị karịa unit 14 kwa izuụka.

Anụ na-acha ọbara ọbara

Maka ihe gbasara anụ na-acha ọbara ọbara, Nwokocha kwuru sị, " Onye na-erife anụ na-acha ọbara ọbara oke na-ebute mgbanwe ime ahụ ya nke bụ 'Hormonal Imbalance' na bekee.

O kwuru na ọnọdụ a na-eme ka osiere mmadụ ike ịnwe mmasị ime aramara.

Ọ kọwara sị," Oke iri anụ na-acha ọbara ọbara nwereike ime ka mmadụ nwee ọrịa obi ma mgbe obi mmadụ anaghị ewepụta ọbara etu ọ kwesịrị ọ ga-emetụta etu mmadụ si enwe ike ime aramara".

Chiizi

Joy Nwokocha kwuru na Chizi nwereike ibute mmadụ enweghị ike maọbụ mmasị aramara.

Chiizi bụ ihe dịka achịcha a na-esi na mmiri ara ehi emepụta.

Mana Joy Nwokocha kwuru sị, "Chiizi enwetara n'ara ehi na-ejuputa na Hormone eji aka maa ya na ọgwụ na-egbu nje nke bụ Antibiotic na Bekee. Ihe ndị ana-agbanwe ọnọdụ ahụ mmadụ nke na-ebute nwoke na nwaanyị enweghị ike maọbụ mmasị ime aramara".

Ahịhịa Mịntị

Ahịhịa mint bụ ihe eji eme ụfọdụ ihe dịka ihe nracha ka ọ na-ekpo ekpo.

Nwokocha kwuru na ya bụ mint na-enwe ihe a na-akpọ Mentọl n'ime ya.

O kwuru sị, " Menthol na-eme ka ọnọdụ Testosterone n'ahụ ụmụ nwoke gbadaa nke nwereike ibute enweghị ike na mmasị aramara".

O kwukwara sị, " Mint na-akpalite oke ikuku ịgafe n'ime ahụ mmadụ nke na-ebute ibi nkọ nke nwereike ime ka mmasị aramara pụọ n'ahụ mmadụ".