You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Unknown gunmen attack Agulu: Etu ndị 'unknown gunmen' si wakpoo Agulu,Osumenyi n'Eprelu 30, afọ 2022
Ndị ojiegbe amabeghi ndị ha bụ wakporo ma na-agba egbe aghara aghara n'Agulu dị n'Anambra steeti, n'ụbọchị 30 nke ọnwa Epreelụ 2022.
N'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia, a hụrụ ebe ndị ojiegbe ahụ jikwa ma mma oge, bu ihe ruru ụgbọala abụọ dịka ha na-akwa mgbọ n'ụzọ.
A mabeghi ma e nwere ndị merụrụ ahụ maọbụ onye mgbọ tụrụ na ya bụ mwakpo.
BBC kpọtụrụ Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti, onye kwuru na ndị ojiegbe wakporo Agulu n'ụbọchị Satọde, mana o kwuru na ọ natazubeghi ozi so ya.
N'Osumenyi , Nnewi-South
Ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ agbagbuola mmadụ amabeghị ọnụọgụgụ ha n'Osumenyi dị na okpuru ọchịchị Nnewi-South ebe a na-aṅụ mmanya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga sị nay a amaghị maka akụkọ ahụ. Oke ogbugbu mmadụ na-arị ielu n'Ọwụwa Anyanwụ kemgbe otu afọ
Na mbido...
Cheta na oke ogbugbu mmadụ arị erị elu kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Nke a na-eso nhiwe otu na-achọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob hiwere alaka ọgụ ha a kpọrọ Eastern Security Network n'ọnwa Disemba afọ 2020.
Ha kwuru na ESN bụ maka ihe ha kpọrọ "ibu agha megide ndị ọchịehi" ha kwuru ma egbusisi ndị mmadụ, na-awakpo ụmụnwaanyị n'Ọwụwa Anyanwụ.
Kemgbe ahụ, e gbuola ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị Igbo welitere isi.
Ndị ọrụ nchekwa na-ebo ndị Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN ebubo aka ha ịdị na tigbuo-zọgbu na-akpọtụ n'Ọwụịwa Anyanwụ.
Mana Ipob aghọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.